Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wepụta akwụkwọ ntụliaka 1993 - Sinetị
Akụkọ kachasị mere taa;
Sịnetị agwala INEC ka ha wepụta akwụkwọ ntuliaka 1993

Ebe foto si, @Senatepresident
Ndị ụlọomeiwu Sịneti agwala INEC ka ha wepụta akwụkwọ ntụlịaka nke juun afọ 1993 bụ nke na-egosi na MKO Abiola meriri ntụlịaka onyeisiala n'afọ ahụ.
N'aka nke ọzọ, Ohaneze ndigbo na ndị ọnụ na-eru n'okwu agwala gọọmenti etiti ka ha kwanyere Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka ahụ ugwu dịka e si me Abiola.
Osote Onyeisiala bụ Osinbajo agbanarịla ihe mberede

Ebe foto si, Yemi Osibanjo/Twitter
Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo gbanarịrị oke nsogbu dịka ụgbọelu Helilọpta bu ya ga n'ụlọọrụ na-ahụ maka ibubata ngwaahịa dị n'Abuja gbaturu n'ike mgbe ọ na-achọ ifepu
Osinbajo gara emume mpụta n'agụmaakwụkwọ ụfọdụ ndị isi ụlọọrụ ahụ mgbe ihe a mere.
Mba Ofesi;
Kim Jong-Un nwereike iga mba Amerịka

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na onwereike ịkpọ ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-un oku ka ọ bịa mba Amerịka ma ọ bụrụ mkparịta ụka na Singapore gaa nkeọma.
Trump kwuru nke na nzuko ya na Praịm Mịnịsta Japan bụ Shinzo Abe.
N'egwuruegwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-agbara Naịjirịa bọọlụ n'ebe etiti bụ Ogenyi Onazi akatọọla akụkọ na-ekwu na ya onye ndụ ya bụ Mikel Obi nwere esemokwu.
Onazi kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ naghị eme nkeọma n'asọmpi ugbu a, mana o metutaghị mmekọrịta ya na Mikel.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa:
Lee ihe nkiri taa











