Toilet Snake: Ihe mbụ ị ga-eme ma agwọ tụọ gị iji zọ ndụ gị

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe mmadụ nwụrụ mgbe agwọ tara n'ụlọ mposi, ụjọ jizi ndị mmadụ maka nke a.
Mana ị ma ihe ị ga-eme ma agwọ taa gị maọbụ etu ị ga-esi chụpụ agwọ n'akụkọ ebe i bi?
Ngwa gụrụ akụkọ a gawa n'ihu ka ị mata ihe ndị a.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na agwọ taa gị maọbụ taa mmadụ n'ihu gị?

Ebe foto si, Getty Images
Agwọ bụ anụmanụ na-ebi n'ọhịa na-akpụ akụ.
Ụfọdụ agwọ anyị na-ahu na mpaghara Afịrịka bụ ;Eke, ajụala, echieteka na ndị ọzọ.
Ekwere agwọ arụ ya anaghị egbu mmadụ ma nwee nke na-egbu na-atufughị oge.
Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) dere akwụkwọ ọhụrụ kọwara na n'otu afọ, ihe karịrị mmadụ nde 5.4 ka agwọ na-ata niile n'ụwa.
Lee nkọwa etu ị ga-esi ma agwọ nwere ike igbu mmadụ nakwa ihe niile i kwesiri ime ngwa ngwa ma ọ bụrụ na agwọ taa gị ma ọ bụ taa mmadụ n'ihu gị.
Ihe eji ama agwọ ọjọọ

Ebe foto si, Getty Images
- Lee isi ya: Ọtụtụ agwọ ọjọọ nwere isi dika ihe nwere akụkụ atọ nke a kpọrọ 'triangle' na Bekee.
- Lee agwa ya: Ụfọdụ ajọ agwọ nwere agwa na-acha ọfụma
- Lee ma ị ga-ahụ olulu n'etiti anya na imi ya: Ọtụtụ agwọ ọjọọ nwere olulu bụ ihe ha ji aṅụta isi anụọhịa ha chọrọ igbu.
- Anya agwọ: Ọ na-ara ahụ iji anya agwọ mara ma ọ bụ nke na-ata arụ na-egbu mmadụ ka ọ bụ nke nkịtị n'ihi na ọtụtụ agwọ ọjọọ na-achọ nri n'ụtụtụ nwere nwaanya (pupil) dị okirikiri.
- Lee ebe ọ tara gị maọbụ onye ọ tara: Ọ bụrụ na eze ya dịkọta ọnụ, o gosiri na agwọ ahụ bụ nke ọjọọ.
Ihe niile I kwesiri ime

Ebe foto si, Getty Images
- Kpọọ ndị ụlọọgwụ maọbụ gawa ụlọọgwụ ngwa ngwa!
- Lee agwọ ahụ anya ọfụma ọfụma: Ọ dị ezigbo mkpa ka ị kọwara ndị dọkịnta etu agwọ a siri dị.
- Dinaa duu n'ala: Nke a ga-akwụsị mmịrị ọjọọ( venom) nke agwọ ahụ ịgbasa n'ime ahụ gị
- Jiri akwa a kpọrọ 'bandage' na bekee kechie ọnụ ọnya ahụ.
Ihe niile ị kwesighị ime

Ebe foto si, Getty Images
- A mina ọnya ahụ ọnụ
- Ejila mma bee ọnya ahụ
- Ejila ụdọ kechie ọnya ahụ
- Enyela onye agwọ tara mmanya ike ọbụla.










