Ndị sineti chọrọ ime mkpesa maka ikpe sị ka e weghachite Omo-Agege

Ebe foto si, Sen Ovie/ Twitter
Ụlọikpe etiti n'Abuja ụnyaahụ kagburu nkwụsị ọrụ ndị sineti mere sinetọ Ovie Omo-Agege rue mkpụrụ ụbọchị 90.
Ọkaikpe kpebiri ikpe ahụ bụ Nnamdi Dimgba kwuru na ndị sineti enweghi ụdị ikike ahụ na ọ bụ naanị mkpụrụ ụbọchị 14 na otu ụbọchị nzụkọ ha ka ha nwere ikike ịkwụsị onye meọrọ ọrụ.
Maka nke a, Ọkaikpe Dimgba nyere iwu ka a kpọghachi sinetọ Omo-Agege ozugbo ma kwụwa ya ego niile ruru ya.
Mana nke a adabaghịrị ndị sineti dịka ha kwuru na ha ga-eme mkpesa maka ya bụ ikpe ma kwuo ka ikpe ahụ nọdụ etu ọ nọbụ.
Cheta na a kwụsịrị sinetọ Omo-Agege ọrụ ụbọchị Epurel 12 maka okwu o kwuru oge ndị ntaakwụkọ na-agba ya ajụjụọnụ na mmegharị ndị omeiwu na-emegharị akwụkwọ iwu ntruliaka bụ iji megide onyeisiala Muhammadu Buhari.
Nke a bụ agbanyeghi na ọ rịọbuola ndị sineti mgbaghara maka okwu ahụ o kwuru.
Mana ndị kọmiti sineti na-ahụ maka ịdọ aka na ntị dere akwụkwọ ma kwuo ka a kwụsị Omo-Agege ọrụ ụbọchị 181 nzụkọ ndị sineti mana onyeisi sineto bụ Bukola Saraki kwuru ka e wetuo ya ụbọchị 90.

Ebe foto si, NGS SIntei/ Twitter
Gịnị ka ndị kọmiti ahụ kwuru?
Oge kọmiti ahụ na-egosipụta akwụkwọ ha degara sineti, onyeisi habụ sinetọ Sam Anyanwu kwuru na kọmiti ahụ ekwenyeghi na mgbaghara Omo-Agege rịọrọ maka na o mechara kpụpụ ndị sineti n'ụlọikpe.
Mana Omo-Agege na sintọ itoolu ndị ọzọboro ndị sineto ebubo na ha kpachara anya nabata mmegharị iwu gbasara ntuliaka.
O kwuru na mmegharị ahụ bụ naanị iji megbute onyeisiala Muhammadu Buhari.
Etu Omo-Agege si nabata nkwụsị n'ọrụ ya
Cheta na a na-ekwu na ọ bụ maka na obi adịghị sinetọ Omo-Agege mma maka nkwụsị n'ọrụ ahụ ndị sinetị kwụsịrị ya mere o ji kpọrọ ndị omekome wakpoo ụlọ omeiwu n'ọnwa gara aga.
Mwakpo ahụ mere e ji zuru ọfọ sineti rue otu ụbọchị mana ndị sineti jiri ọfọ ọzọ wee mee ọkpakọ ụbọchị ahụ.
Onyeisi sineti kpọrọ ya bụ akparamagwa dịka nke megidere ala Naịjirịa ma bụrụkwa mbọ ịkwatu otu ngalaba ọchịchị Naịjirịa.
Ọ bụrụ na ikpe maa onye mere ụdị ihe a, e nwereike ịtụ ya nga mkpụrụọka maọbụ gbuo ya.

Ebe foto si, @bukolasaraki
Gịnị ka mmegharị iwu ahụ kwuru?
Iwu ahụ ndị sineti chọrọ imegharị na-ahazigharị usoro ntuliaka na-abịa n'afọ 2019.
Ndị sineti chọrọ ka ntuliaka nke onyeisiala buru ụzọ bịa tupu e mee nke ndị ụlọomeiwu niile.
Mana oge ha wegara onyeisiala akwụkwọ iwu ahụ ka o binye aka, onyeisiala jụrụ ibinye ya aka n'ihi na ọ na-anapụ ndị Inec ikike ime ntuliaka etu ha si chọọ.

Akụkọ ga-amasị gị:










