Naomi Goni na Deborah Samuel Yakubu, na ndị ọzọ danyere na mmanụ ọkụ maka ebubo ịkparị Mohammed

Ebe foto si, Deborah Samuel,Mubarak Bala/Facebook
Dika akụkọ ọnwụ Deborah Samuel Yakubu , onye e gburu na Sokoto maka ebubo ịkparị Onye Amụma Mohammed ka na-akpọtụ, ndị ntoroọbia Borno na-aba mba ọgụ na ha ga-egbu otu nwagbọghọ maka ndajọ yiri ya.
Ndị ntoroọbia na-ekpe ụka Alakụba na steeti ahụ kwuru na ha ga-egbu Naomi Goni nwa akwụkwọ Ramat Polytechnic, Maiduguri, maka ebubo ịkparị Mohammed n'akara Facebook ya.
N'ịkatọ ọnwụ Deborah Samuel Yakubu bụ onye ndị ntorobia ụka Alakụba gburu n'abalị 12 nke Ọnwa Mee, Naomi kwugidere Mohammed na ndị na-eso ya.
Okwu ya kpalitere ndị ntoroọbia Borno ndị malitere ngagharịiwe n'ụbọchị Monde na-akpọ oku na onye hụrụ Naomi, gbuo ya.
Mana ọ bụghị naanị mmadụ abụọ a bụ ndị danyerela na mmanụ ọkụ maka ebubo metụtara okpukperechi.
Lee ndị danyerela na nsogbu na Naijiria maka ebubo ikwujọ Mohammed maọbụ okpukperechi Alakuba:
Isioma Daniel
N'afọ 2002, onye ntaakụko debanyere na nsogbu ha oge o dere akụkọ megide ndị ụka Alakuba na-eti mkpu na ha achọghị ka e mee asọmpi nwaanyị kacha mma n'ụwa (Miss World pageant) n'Abuja.
Akụkọ ahụ Isioma Daniel nke Thisday dere kusuru ụfọdụ ndị okpukpere ụka Alakụba bụ ndị chọwara ya ka ha gbuo ya dịka Osote Gọvanọ Zamfara steeti oge ahụ bụ Mamud Aliyu Shinkafi kwupụtara na ha etinyela 'fatwa' n'isi ya si onye hụrụ ya gbuo ya.
Fatwa bụ mkpebi banyere ebe iwu Sharia kwụ n'okwu nke onye ụkọchukwu Alakụba na-enye.
Mana n'okwu Daniel, ọ bụ ọnụ na-ekwuru gọọmenti Zamfara steeti oge ahụ nyere ya bụ 'fatwa'.
Thisday rịọrọ mgbaghara, Daniel tinye akwụkwọ arụkwaghịm na Thisday, gbalaga ala Bekee.
Mana ihe ndị ahụ adajụghịụ obi ndị ahụ dịka ọgbaghara sochiri.
Ndị ụka Alakụba na-eme ngagharị iwe gbara ụlọntaakụkọ Thisday n'Abuja ọkụ, e gbukwara ihe karịrị mmadụ 220.
Bridget Agbahime

Ebe foto si, Noel Ijezie/Facebook
N'abalị abụọ nke ọnwa Juun, afọ 2016 otu nwaanyị gbara afọ 74 na-ere akụrụngwa usekwu zutere ọnwụ ya dịka ndị ụka Alakụba gburu ya n'ahịa Kofar Wambai Market dị na Kano.
Dịka akụkọ siri kwuo, ihe kpalitere okwu bụ na nwaanyị ahụbụ onye Orodo, n'okpuru ọchịchị Mbaitoli n' Imo State jụrụ inye otu nwoke ụka Alakuba ohere ka ọ saa ọnụ ha na-asa tupu ha amalite ekpere ha n'ihu ọdọahịa ya.
A nwụchiri mmadụ ise; Dauda Ahmed,Zubairu Abdullahi, Abdulmumeen Mustafa, Abdullahi Abubakar na Musa Abdullahi bụ ndị a sị aka ha dị n'ọnwụ nwaanyị ahụ e gburu n'ihu di ya bụ Mike Agbahime, ụkọchukwu ụka 'Deeper Life'.
A kpụpụrụ mmadụ ise ahụ ụlọikpe majie maka ebubo ibute ọgbaghara na ebubo ndị ọzọ yiri ya mana o nweghị okwu nwere isi pụtara n'ikpe ahụ rue taa.
Christiana Oluwasesin
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Christiana Oluwasesin bụ onyenkuzi ji ụmụ abụọ bụ onye ụmụakwụkwọ gburu na ụlọakwụkwọ ebe ọ gara ilekọta ụmụaka na-eme ule n'ụlọakwụkwọ'Government Day Secondary School' Gandu, Gombe Steeti.
Dịka di ya bụ Michael Oluwasesin si gwa ụlọntakụkọ Sun, oriakụ ya na-elekọta ụmụakwụkwọ Seniọ Sekọndịrị na-eme ule 'Islamic Religious Studies' bụ ebe ọ napụrụ otu nwataakwụkwọ ji akwụkwọ Koran n'akpa ya nke butere okwu.
O kwuru na nwata nwaanyị ahụ malitere tiwe na mkpu sị na o merụọla akwụkwọ Koran na agbanyeghị na ọ bụghị naanị ya ka a napụrụ ihe o ji.
Ụmụakwụkwọ malitere tiwe "Allahu Akbar".
Oge mkpọtụ karịrị, onyeisiụlọakwụkwọ, onyeisi ụmụakwụkwọ na ndị ndị nkuzi ndị ọzọ bịkpọrọ Oluwasesin duga ya n'ebe onyeisiụlọakwụkwọ na-anọ.
Mazị Oluwasesin gara n'ihu sị, "ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ si iro bata gbakọrọ kee ya agbụ tiwe ya ihe, otu n'ime ụmụakwụkwọ wepụtara mma, chaa ya n'akpịrị. ha sunye ya ọkụ."
"Ha gbara ụgbọala ya ọkụ ma gbukwa nwa m nwoke dị ọnwa 10 oge ahụ."
Oluwasesin boro ebubo na ụloikpe Federal High Court, dị na Gombe,ekweghị ekpe ikpe ahụ sị na ha enweghị nchekwa zuru oke iji hụ na udo chịa ma na-ekpe ikpe ahụ nke mere ka nwoke ahụ kpụpụ ha ikpe na Yola.
Talata Marafa 8

N'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2016, Talata Marafa, e gburu mmadụ asatọ dịka ọ gbaghara dapụtara n'obodo Talata-Mafara dị na Zamfara steeti maka otu nwatakwụkwọ e boro ebubo ikwutọ Mohammed.
Akụkọ kwuru na otu nwata akwụkwọ bụ onye bụbu onye ụka Alakuba chegahrịrị bụrụ onye ụka Kraisti kpalitere ụka n'etiti ụmụakwụkwọ ibe n'ụlọakwụkwọ 'Abdu Gusau Polytechnic', dịka e boro ya ebubo ikwujọ Mohammed.
Ha kụrụ ya tọọ tọọ, hapụ ya, chee ma ọ nwụọla mana otu enyi ya a kpọrọ Tajudeen buru ya buga ụlọọgwụ.
Oge ha nụrụ na ọ ka dị ndụ, ndị na-eme ngaghariiwe gbara gaa ụlọọgwụ sị ka a kpụpụta ya ka ha gbuo, enyi ya nụrụ kepukepu ihe ha na-akwado ime ya bụ ụzọ garuo ụlọọgwụ bupụ ya.
Ndị ahụ na-eme ngaghariiwe gara n'ụlọ Tajudeen sunye ya ọkụ nke tara isi mmadụ asaa.
Mubarak Bala

Ebe foto si, Mubarak Bala/Facebook
Mubarak Bala, onye Kano bụ onye gbahapụrụ okpukperechi Alakụba sị na onweghịzi chi o kwenyere na ya nke Bekee kpọrọ 'Atheist.'
Ọ bụ onyeisi otu "HumanistAssociation of Nigeria".
N'ọnwa Eprelu afọ 2020, a nwụchiri ya Kaduna maka ebubo ịkparị okpukperechi Alakuba na Facebook.
N'abalị ise nke ọnwa Eprelu afọ 2022, a tụrụ Bala mkpọrọ afọ 24 n'Ụlọikpe Ukwu dị na Kano dịka o kwetara na ya mere ebubo nile e boro ya ma rịọ ka a gbaghara ya.
Cheta na a kpụgaburu ya ụlọọgwụ saịkia n'ike bụ ebe e jichiri ya n'ike na-enye ya ọgwụ mana otu dọkịta kwuru na o nweghị ihe na-eme ya, ebe dọkịta ọzọ kwuru na o nwere nsogbu.













