Ọ bụ nwa onye nwe ụlọakwụkwọ adigboroja pịagburu nwatakịrị dị ọnwa 19 - Kọmịshọna Agụmakwụkwọ Delta steeti

Gọọmentị Delta Steeti agbachiela ụlọ akwụkwọ ebe a na-ebo onye nkuzi ebubo ịpịagbu nwatakịrị akwụkwọ

Ebe foto si, Ossai Ovie Success/Facebook

Nkọwa foto, Gọọmentị Delta Steeti agbachiela ụlọ akwụkwọ ebe a na-ebo onye nkuzi ebubo ịpịagbu nwatakịrị akwụkwọ

Kọmịshọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Delta steeti bụ Chika Ossai gwara BBC Igbo na gọọmentị agbachiela ụloakwụkwọ ebe a na-ebo otu onye nkuzi nke bụ nwa onye nwe ụlọakwụkwọ adigboroja ebubo iji ụtalị pịagbuo nwatakịrị dị ọnwa iri na itolu.

Akụkọ na-ekwu na nwatakịrị a nwụrụ dịka onye nkuzi a sị na aha ya bụ Emeka Nwogbo pịachara ya ihe nke merụrụ ya ahụ n'ụbọchị Mọnde.

Kọmịshọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Delta steeti bụ Chika Ossai gwara BBC Igbo na gọọmentị agbachiela ụloakwụkwọ ebe a na-ebo otu onye nkuzi nke bụ nwa onye nwe ụlọakwụkwọ adigboroja ebubo iji ụtalị pịagbuo nwatakịrị dị ọnwa iri na itolu.

Ebe foto si, Ossai Ovie Success/Facebook

Nkọwa foto, Kọmịshọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Delta steeti bụ Chika Ossai gwara BBC Igbo na gọọmentị agbachiela ụloakwụkwọ ebe a na-ebo otu onye nkuzi nke bụ nwa onye nwe ụlọakwụkwọ adigboroja ebubo iji ụtalị pịagbuo nwatakịrị dị ọnwa iri na itolu.

E kwuru na ya bụ nwatakịrị dara ọrịa dịka apịachara ya ihe a tupu ọ laa mụọ ka abali ise gachara.

Ka e si kwuo, a kpọọrọ ya bụ nwata gaa ụlọọgwụ nke Federal Medical Centre Asaba ebe e kwuru na ọ nọ nwụọ n'ụbọchị Satụde.

Ossai gwara BBC Igbo na gọọmentị steeti ahụ enyeghị ụlọakwụkwọ a ikike ịrụ ọrụ.

Ndị atụrụ ngịga

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru sị, "Ndị ụweọjịị anwụchịela nwaanyị nwe ụlọakwụkwọ a na nwa ya nwoke a sị pịagburu nwata akwụkwọ a".

O kwuru na mgbe ọ gara njem nleta ịhụ nne nwatakịrị a n'ụbọchị ụka, na obi mgbawa ekweghị ya kwuo okwu.

O kwukwara na ọ hụghị nna ya bụ nwatakịrị.

O kwuru sị, "Tupu ebido ụlọakwụkwọ ọbụla na steeti a, anyị na-aga njem nyocha ịmata ma ụlọ akwụkwọ a ọ nwere ike ịrụ ọrụ ha etu ọkwesịrị kama ụlọakwụkwọ adịgboroja a abịaghị nata ikike nke mere na gọọmentị agaghị njem nyocha ebe ahụ".

Ọ kọwara na Gọọmentị emechiela ọtụtụ ụloakwụkwo adịgboroja n'oge gara aga mana ụlọakwụkwọ nke a gbanahụrụ ha.

Ossai kwuru na ha na-esi ime n'ala maka ihe a mere ma kọwa na ọtụtụ ozi dị mkpa banyere ihe so okwu a ga-apụta n'ụbọchị mọnde.

Akụkọ ka na-abịa.