Delta state police attack: Umutu na ebe ndị ọzọ awakporola ụlọọrụ ndị uweojii na Delta steeti

Ebe foto si, PAt Adigwe
Ndị uweojii atọ alaala mmụọ dịka ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Umutu, Delta steeti n'isi ụtụtụ taa bụ 28 nke ọnwa Mee, 2021.
Edafe Bright bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwuru na, abụọ n'ime ndị uweojii a nwụrụ dịka ha na ndị omekome ahụ na-akwakọrịta mgbọ, ebe ọbara mgbali elu gburu otu n'ụlọọgwụ.
Edafe kwukwara na mgbọ tụgburu ndị oji egbe abụọ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ riri mbombo ọsọ mgbe ha hụrụ na ndị uweojii abịaghị igwu egwu.
O kwukwara na ndị uweojii gbochiri ebumnobi ndị omekome ahụ ịmụnye ụlọọrụ ha ọkụ nakwa imaburu ngwaọgụ ha, dịka o kwukwara na ndị oji egbe ahụ burula ozu ndị nke ha dịka ha na-agba ọsọ.
Mana ndị hụrụ ka ihe mere, kwuru na a mụnyere ụfọdụ ụgbọala nọ n'ihu ụlọọrụ ahụ ọkụ.Ndị uweojii ekwuola na ha na-ama imi n'ala ịchọpụta ihe mere, dịka ha na-arịọ igwe mmadụ ka e zitere ha ozi bara uru gbasara ndị kpara mkpamkpa a.
Ebe ọzọ ndị oji egbe wakporola ụlọọrụ ndị uweojii na Delta steeti:
Ndị 'Unknown gunmen' gburu otu onye uweojii n'Akwukwuigbo.

Ebe foto si, PAt Adigwe
Ndị uweojii Delta steeti kwuru na ha anwụchiela onyeisi ndị ekperima wakporo ndị uweojii nọ ọrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde.
Ndị ji egbe wakporo ndị uweojii nọ ọrụ na nso Otulu Junction, n' Akwukwuigbo dị n'Okpuru Ọchịchị Oshimili North, gbuo otu uweojii ma gbaa otu ụgbọala ha ọkụ .
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Bright Edafe kwuru na ọ bụ ndị amakekwu n'ogbe ihe ahụ mere bụ ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Edafe sịrị: "Ọ bụ ndị agboro si Akwuku-Igbo mere ya. Ha gburu otu onye ọrụ anyị mana aka akparala onyeisis ha, ebe nnyocha n'aga n'ihu ugbua."
Ọdachi a na-abịa izu ole na ole ndị ekperima wakpochara isi ụlọ ọrụ ndị uweojii dị na Nsukwa, n'Okpuru Ọchịchị Aniocha South ebe ha gbagburu ndị uweojii atọ.
Nsukwa:
Ndị oji egbe wakporo ụlọorụ ndị uweojii dị n'obodo Nsukwa dị n'okpuruọchịchị Aniocha, ma gbuo ndị uweojii atọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Mee, 2021.
Ha mụnyekwara ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ.
Lee ihe onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ka ọ garuru Nsukwa:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post








