Barcelona Vs Lyon: Messi edulaala Lyon mmụọ, Liverpool kpọọ Bayern ntu n'isi

Ebe foto si, Getty Images
Leo Messi gosiri ihe o ji bụrụ "a takata a gbọọ" n'ihe gbasara ihe e ji ụkwụ eme n'egwuregwu bọọlụ, ma nye goolu abụọ so n'ime ise nyere Barcelona mmeri.
O bu ụzọ nye penariti n'ime nkeji 18 e ji bido bọọlụ, tupu Philippe Coutinho enye ọzọ na nkeji 31.
Lucas Tousart nke Lyon bịara gbakpuo otu goolu n'ime nkeji 58, nye ndị na-akwado ha olileanya, mana ọ maghị na ọ bụ ebu ka o ji isi kote.
Ebu gbara Lyon makana goolu ahụ meghere ụzọ iwe Barcelona, ha ji were goolu atọ Messi (nkeji 78), Gerard Pique (nkeji 81) na Ousman Dembele (nkeji 86) nyere, ji sụọ ha akwụ.
Cheta na enweghị onye nyere goolu ka otu abụọ a zutere n'izu gara aga.
Chineke bọọlụ zọrọ Liverpool

Ebe foto si, Getty Images
Otu abụọ a akpaghị ike ka ha zutere n'ụkwụ nke abụọ a, ha gbara bọọlụ ka mmanya ngwọ a kụrụ mmiri.
Mana goolu abụọ Sadio Mane nyere na nkeji 26 na 84, mere ka Liverpool zọta isi onwe ha ma nweta ohere isonye n'otu asatọ ga-azọ agba anọ-ikpeazụ.
Joel Matip ji aka ya kwaba bọọlụ na neetị ha na nkeji 39, ebe Virgil Van Dijk nyekwara goolu na nkeji 69.
Andrew Robertson nke Liverpool nwetara akwụkwọ mme mme, nke ga-egbochi ya isonye ndị otu ya gbaa bọọlụ mbụ ha ga-agba n'agba anọ-ikpeazụ.
Mmeri Liverpool pụtara na otu anọ si Premier League (Man City, Tottenham, Liverpool, Man Utd) ga-agafe agba a; nke bụ mbụ ọ na-eme kemgbe afọ 2009.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na a ga-ahọpụta onye ga-ezute ibe n'agba anọ-ikpeazụ, n'ụbọchị Fraịde bụ Maachị 15.









