Ebutela Okpunnabụenyi ruru otu narị na iri n'olimpik

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-akwado olimpiks nke oge oyi 2018 na Pyeongchang, a na-atụ anya inwe ịgba n'ezi nke kachasị nke ntị nụ goro?
Egwuregwu olimpiks ga-ebido n'izuụka n'abia mana ndị na-akwado ya bụ ndị Saut Koria ebuterela ndi na-eme olimpik okpunnabụenyi ruru puku otu nari na iri.
Okpunnabụenyi ndị a ebutere, ji puku iri karịa nke ebutere ndị so mee egwuregwu olimpik garaaga na Sọchi dị na Rọshia.
N'agbanyeghi na onwere ihe ndị ọzọ na-amasị ndị egwuregwu a dịka ebe a na-eme ihe nkiri, ebe a na-ekpe ekpere na ebe ndị a na-eme njike maka egwuregwu, a na-atụ anya na ha ga-agba n'ezi ọfụma.
A ga-enyekwa ha ihe ndị dị icheiche mmadụ ji enwete onwe ya n'ụlọ nke ya, nke ga-adị n'ebe a na-akpọ 'athlete's village' dị n'ime 'olympic village'.
Ndị ọzọ ọ ga-emetụta
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ na-eme okpunnabụenyi a bụ Convenience, kwuru sị na ha ga-enyekwa ndị ntaakụkọ na ndị nkiri.





