Onnoghen: Sineti sị gọọmenti kpọchite ọnyeisi ndị omeiwu
Sineti sị gọọmenti kpọchita Onnoghen

Ebe foto si, @bukolasaraki
N'aka ọzọ, ụlọomeiwu Sineti akpọpụla gọọmenti etiti ụlọikpe ka ha were ọsọ were ije kpọchite Onnoghen bụ onye bụbụ onyeisi ndị okaikpe na Naịjirịa.
Nke a mere ka ndị ụlọomeiwu mechichara ọgbakọ ha ụbọchị Tuesday.
Ipob etinyela referendum

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ụbọchị iri na isii onwa Februwarị dịka ụbọchị ha ga eme referendum ịmata ka ndị mmadụ a ka chọrọ ị nọ na Naịjịrịa.
Cheta na otu ụbọchị ahụ ka gọọmenti Naịjirịa nwere ntụliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu.
US na UK akọwala ihe ha ji tinye ọnụ na okwu Onnoghen

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụlọọrụ British kọmishọna dị na Naịjirịa bụ Catriona Liang ekwuola na ihe mere ha jị arịọ ka Naịjiịrịa kpe udo n'ihe gbasara nwepụ onye ọkaikpe ukwu Onnoghen, bụ maka na ha chọrọ ka udo chịa na
ntuliaka 2019.
N'otu aka ahụ Stuart Symington bụ onye nọchite anya mba Amerika na Naịjirịa sị na ihe mba ahụ ji tinye ọnụ na ya bụ okwu bụ maka etu ọ ga-esi metụta nwulite ọchịchị ọhakarasị na Naịjirịa.
US akpụpụla ụlọọrụ Huawei ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, mba US agbaala ụlọọrụ Huawei na onyeisi ha okwu ego dị n'aka bụ Meng Wanzhou akwụkwọ maka ebubo ohi ego, ịgbọchị ikpe nkwumọtọ naohi ọrụaka ndị mba US.
Ejidere Meng na Canada n'ọnwa gara aga ebe atụrụ anya na okwu a nwere ike ịkpali esem okwu dị na etiti China na mba US.










