Olypmics 2021: Lee ụmụ Igbo ga-anọchị anya Naịjirịa n'asọmpi Olympics 2020

Elizabeth Anyanacho/Chimezie Metu/Annette Echikunwoke

Ebe foto si, Anyanacho/Metu/Echikunwoke

Nkọwa foto, Elizabeth Anyanacho/Chimezie Metu/Annette Echikunwoke

A bịa n'egwuregwu nke bekee kpọrọ 'sports' na Naịjirịa, ụmụ Igbo so na ndị e ji aga mba.

Dịka egwuregwu Olympics nke afọ 2020 na-amalite, ọtụtụ ụmụ Igbo sokwa na ndị a na-atụ anya na ha ga-emechapụ Naịjirịa ihere n'ihu.

Cheta na otu bọọlụ Naịjirịa, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, etozughị iso gaa asọmpi Olympics nke afọ a,

Ha dị mmadụ iri isii na otu (61) ga-anọchi anya Naịjirịa n'asọmpi dị icheiche n'Olympics nke afọ a. Ka anyị tulee ụmụ Igbo nọ n'ime ha.

Aha onyonyo, Etu m si soro na ndị ọkaibe n'egwuregwu 'Basketball' - Zeke Nnaji

Otu 'Basketball' Ụmụnwoke

Otu 'Basketball' Ụmụnwoke

Ebe foto si, nigeriabasketball/instagram

Nkọwa foto, Otu 'Basketball' Ụmụnwoke Naịjirịa

Ọ bụrụ na i kee ndị otu 'basketball' Naịjirịa ụzọ abụọ, otu ụzọ n'ime ha bụcha ndị Igbo. Lee ha:

  • Ike Iroegbu - nọ n'otu Élan Chalon nke Fransị
  • Stan Okoye - nọ n'otu Gran Canaria nke Spen
  • Chimezie Metu - bọ n'otu Sacramento Kings nke Amerịka
  • Gabe Nnamdi Vincent - nọ n'otu Miami Heat nke Amerịka
  • Jordan Nwora - nọ n'otu Milwaukee Bucks nke Amerịka
  • Precious Achiuwa - nọ n'otu Miami Heat nke Amerịka
  • Obi Emegano - nọ n'otu Fuenlabrada nke Spen
  • Chima Moneke - nọ n'otu Orléans Loiret nke Fransị
  • Jahlil Okafor - nọ n'otu Detroit Pistons nke Amerịka
  • KZ Okpala - nọ n'otu Miami Heat nke Amerịka

Otu 'Basketball' Ụmụnwaanyị

Otu 'Basketball' Ụmụnwaanyị Naịjirịa

Ebe foto si, D'Tigress/Instagram

Nkọwa foto, Otu 'Basketball' Ụmụnwaanyị Naịjirịa

Ụmụ Igbo zukwara ezu n'otu 'basketball' ụmụnwaanyị ndị Naịjirịa. Lee ha:

  • Sarah Ogoke - nọ n'otu Clube Ferroviário nke Mozambique
  • Promise Amukamara - nọ n'otu Charnay nke Fransị
  • Adaora Elonu - nọ n'otu Uni Girona CB nke Spen
  • Ezinne Kalu - nọ n'otu Landerneau Bretagne nke Fransị
  • Ifunanya Debbie "Ify" Ibekwe - nọ n'otu Ragusa nke Itali

Egwuregwu ndị ọzọ

Uche Eke - 'Artistic Gymnastic'

Uche Eke

Ebe foto si, Uche Eke/Instagram

Uche Eke bụ onye mbụ ga-anọchi anya Naịjirịa n'egwuregwu 'gymnastics' n'asọmpi Olympics.

Ọ malitere ịkụ ụgba oge ọ dị naanị afọ anọ.

Nna ya bụ nwa afọ Igbo, mana nne ya bụ onye New Orleans na mba Amerịka.

Chukwuebuka Enekwechi - 'Shotput'

Chukwuebuka Enekwechi

Ebe foto si, Sonal Athletics/Instagram

Nkọwa foto, Chukwuebuka Enekwechi

Chukwuebuka Enekwechi bụ onye nke iri n'ogogo ndị na-atụ 'shotput' n'ụwa niile.

Ọ bụ ya bụ ọkaibe na 'shot put' n'Afrịka niile ka ọ dị ugbua. O ritekwala ọtụtụ nturuugo na ya bụ egwuregwu.

Ọ bụ onye Anambra steeti.

Chidi Okezie - Ọsọ 400 'meters'

Chidi Okezie

Ebe foto si, Chidibangbang/Instagram

Nkọwa foto, Chidi Okezie

Chidi Okezie eriterela Naịjirịa ọla nchara abụọ n'asọ mpi mba Afrịka a na-akpọ 'African Championships'

Nna ya bụ Moses Okezie bụ onye Igbo mana nne ya bụ Carol Morris bụ onye Jamaica.

Nke a bụ nke mbụ ọ na-aga egwuregwu olimpik.

Rosemary Chukwuma - sọ 100 'metres'

Rosemary Chukwuma

Ebe foto si, official_rosemary_9ja/Instagram

Nkọwa foto, Rosemary Chukwuma

Rosemary bụ nwa afọ Ebonyi steeti.

O ritekwerela Naịjirịa ọtụtụ ọlaedo n'egwuregwu ọsọ n'ụwa nakwa n'Afrịka.

Nwokocha Grace - sọ 100 'metres'

Nwokocha Grace

Ebe foto si, nwokocha.grace.96/Instagram

Nkọwa foto, Nwokocha Grace

Nwokocha bụ nwanyị Naịjirịa nke abụọ tozuru isonye n'asọmpi 'Tokyo Olymics' nke afọ a.

Ka ọ dị ugbua, nwa ada a so na ndị ụkwụ na-aghọ nkọ n'ọsọ n'ụwa niile.

Chioma Chukwujindu "CiCi" Onyekwere - 'Discus'

Chioma Onyekwere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chioma Onyekwere

A mụrụ nwaada Onyekwere na Naịjirịa mana ọ gafere mba Amerịka n'afọ 2002.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum 'University of Maryland' ma nweta ọzụzụ na ngalaba 'Mechanical Engineering'

O ritekwala ọtụtụ ọlaedo na mba Afrịka n'asọmpi 'shot put'.

Annette Echikunwoke - 'Hammer'

Annette Echikunwoke

Ebe foto si, annette_echiku/Instagram

Nkọwa foto, Annette Echikunwoke

Annette Echikunwoke bụ aha na-ada ụda na mahadum University of Cincinnati ebe ọ bụ ọkaibe n'egwuregwu 'shot put', 'hammer' na ndị ọzọ.

A bịa na mmụta, o nwere nturu ugo na ngalabamgbakọ na mwepu (Mathematics) nakwa ire ahịa (Marketing).

Nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa kama a mụrụ ya n'Amerịka.

Oluchi Elizabeth Anyanacho - Taekwondo

Elizabeth Anyanacho

Ebe foto si, Elizabeth Anyanacho/Facebook

Nkọwa foto, Elizabeth Anyanacho

Nwa ada Anyanacho ga-abụ nwaanyị nke abụọ ga-anọchi anya Naịjirịa n'egwuregwu Olimpiks.

Onye nke mbụ bụ Princess Dudu n'afọ 2004, oge Anyanacho ka dị naanị afọ ise.

Onye nkuzi Anyanacho bụkwa nwa afọ Igbo, Chika Chukwumerije, onye riteere Naịjirịa ọla nchara n'asọmpi Olympics nke afọ 2008.

Anyanacho dị afọ 21 ugbua, mana ọ malitere egwuregwu Taekwondo afọ ise gara aga oge ọ dị afọ 16.