Obi adighị IOC mma na mwepụ ewepụrụ mmachi e nyere ndị atleti Russia

Ebe foto si, Getty Images
Kọmiti na-ahụ maka egwurekwu Olympics a na-akpọ, International Olympic Committee (IOC), ekwuola na mkpebi a nwere maka iwepụ mmachị ebighebi e mere ndị atleti iri abụọ na asatọ na Russia ga-emetụta ọdịnihu agha megidere ịṅụ ọgwụ ike.
Ulọikpe n'ahụ maka egwuregwu dị iche iche akpọrọ Court of Arbitration for sport (CAS) na bekee wepụrụ mmachị IOC nyere maka ọgwụ ike n' asọmpị Olympics afọ 2014.
CAS kwuru na n'ime ikpe iri asatọ onweghị ihe ọkpụrụkpụ gosiri na-eji ogwu ike eme egwuregwu.
N'aka nke ọzọ, IOC kwuru na ọ ga-eche echiche maka arịrịọ ọ na-etinyere na Swiss Federal Tribunal.
Kedu ihe kpatara e jiri machịe ndị atletiRussia?
Mmadụ ruru iri anọ na atọ ndị Russia ka e nyere mmachi ebighebi iga Olympics maka nyocha IOC mere gbasara ngosi nkwado ndi steeti Russia nyere ọgwụ ike na Sochi na 2014.
Mịnịsta n'ahụ maka sports na Russia akpọrọ Pavel Kolobkov kwuru, "Mụ na ndị otu m na-enwe anwụri n'ikpe ziri ezi emeriela."
Ọ si na mkpebi a gosiri na aka ọtụtụ ndị e boro ebubo ịnwụ ọgwụ ike n'egwuregwu bụ atleti ọcha.
Ndí ntaakụkọ Interfax sịrị na dịka onye isi Russian Olympic Committee bụ Alexander Zhukov si kwuo: "Anyi na-enwe anwuri na ụlọikpe eweghachila ezigbo aha ndi atleti a ma nzere ha."
Gere ihe ndị mmadụ na-ekwu n'igwe okwu Twita:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









