You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: France ọ bụ mba Afrịka maka mgbapụ Argentina?
Mgbapụ Ajentina gbapụrụ otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'Iko Mbaụwa emeela ka ndị Naịjirịa na-ekwu na Frans bụ ndị Afrịka.
Ka Naịjirịa pụrụ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 n'ụzọ ọtụtụ kwuru na o doghị anya, ndị mmadụ si mpaghara Afrịka, ọkachasị ndị Naịjirịa, ṅụrụ iyi ikwado Frans ka nyụọ Ajentina ịkpakwụ.
Frans mechara jiri ọkpụ anọ asatara atọ (4-3) merie ma gbapụ Ajentina na ya bụ asọmpi.
Ndị mmadụ bidoro ikwu na Frans bụ mba nke isii Afrịka du bịa asọmpi a.
Ebe o si ka mma bụ na ọtụtụ ndị na-agbara Frans bọọlụ bụ ndị nne na nna ha bụ ndị Afrịka ma mụọ ha na Frans.
Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter.
@KnoxTainment depụtara aha ndị si mpaghara Afrịka na-agbara Frans bọọlụ iji gosipụta etu o si hụchata ya na mba Frans bụ mba Afrịka nke isii bịara Iko Mbaụwa nke 2018.
Onye ọzọ bụ @iamBussmarn depụtakwara aha ndị ọzọ na-agbakwara mba Frans bụ ndị Afrịka.
Onye ọzọ bụ @GH_ILUV kwuru sị na otu Afrịka (ya bụ Frans) chụrụ Ajentina maka ịghọgbu Naịjirịa.
@Nasawali_phame kelere Frans maka "ịnọchite anya mpaghara Afrịka ọfụma".
@Nani_Ras kwuru na mmeri Frans bụ mmeri Afrịka.
BBC Igbo nwere olileanya na ndị Afịrịka ga-akwado ndị isi ojii ndị ọzọ wee dee maka ụmụ Afrịka na-agbara ndị mgba ọzọ bọọlụ.