World Cup 2018: Kedụ ụmụntakịrị na-enwu ka kpakpando?

Dika Iko Mbaụwa banyere agba nke abụọ, enwela "ndị na-ọchị ndị na-akwa" nke turu uwa n'anya.

Ọtụtụ obodo bụ isi afụrụ kwawa okpụ na asompị mba ụwa ebola aka emeri n'isi.

Dịka ya bụ akwa na-ada, obodo ndị a bụ ochiedike n'egwu bọọlụ dukwa ndị otu ha ala.

Nke a pụtara na dịka Messi, Ronaldo, Aguero, Huigain, Lewandosky, Muller, Kroos na ndị ọzọ kwarala lii, ụmụmmbị ndị na-awapụta:

Hirving Lozano nke Mexico

Nwaamadị a gbara afọ 22 na-agbara PSV. Ogbaala bọọlụ ugboro atọ na Iko Mbaụwa ma nyekwa otu gọọlụ bụ nke Mexiko jiri merie ndị Jamani.

Aleksandr Sergeyevich Golovin

Aleksandr Sergeyevich Golovin na-agbara CSKA Moscow.

Onyekwara otu gool na Iko Mbaụwa a ma kparakwa otu mpempe akwụkwọ edoedo eji adọ ya aka na ntị maka iri-mperi n'egwu bọọlụ.

Yerry Mina

Ọ bụ isi Yerry Mina nyere goolụ chụpụrụ ndị Sinigal na Iko Mbaụwa a.

Kylian Mbappé

Mbappe enyela goolu atọ ugbua, abụọ n'ime ha ka o ji nyụọ ndị Ajentina ịkpakwụ bụ nke e ji gbaara ha ụgbọnwamkpị n'Iko Mbaụwa a.

Akụkọ ga-amasị gị