You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Ụmụ Naịjirịa ebee ka a gbaturu ugo Naịjirịa
Omume ụmụ Naịjirịa bụ egwu agwara ọgwa n'asọmpi ha gbara taa megide Ajentina ebe Ajentina gbara ha ọkpụ goolu abụọ asatara otu.
Ebe ọnọdụ a bụ ihe mwute nye ọtụtụ, ụfọdụ ndị tinyere ego ha ebe Ajentina nọ na-amịcha aka.
Ụfọdụ gara na soshal midia ikwupụta etu obi dị ha gbasara asọmpi a.
Caristo Clear kwuru na ego ya dị n'Ajentina ebe obi ya dị n'ebe ndị Naịjirịa nọ.
Mana The only Edward na-eru uju maka na ego ya alaala ka o tinyechara puku iri n'ebe Naịjirịa nọ.
Onye egwu a ma ama bụ Kizz Daniel kwuru na anyị ga-ekele Chukwu n'ihe niile n'ikpeazụ.
Nke a bụ n'agbanyeghi na Kizz Daniel kwuru na obi gbawara ya nke ukwuu.
Jesse Onemic kwuru na obi mwute ya na-enweta ụfụ asọmpi a na-afụ ya.
N'akụkụ nke ya, Tweet Oracle kwuru na onye nkuzi ndị bọọlụ Naịjirịa bụ Gernot Rohr ahọpụtaghị ndị ọ kpọ gaa agha bọọlụ a nke ọma.
Otu ihe dị mkpa bụ na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ na-ele anya na ndị Super Eagles kara imeri asọmpi a ka ha jiri ya hichaa ụmụ Naịjirịa anyammiri ọbara niile kwafuru n'izuụka gara aga.
A na-ele anya na ndị Super Eagles ga-alọta maka na a gbapụla ha n'asọmpi Iko mbaụwa afọ 2018.