Lee mba Afrịka na-akwadoghi ka Palestaịn bụrụ mba kwụụrụ onwe ya

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Marina Daras
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Dịka mba UK, Fransị, Kanada na Ọstrelịa kwupụtara Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya, a na-atụ anya na mba ndị ọzọ ga-eme etu a.
Mana kedụ etu mba ndị nọ n'Afrịka si ahụta Palestaịn?
Ọtụtụ mba ndị nọ n'Afrịka hụtara Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya n'afọ 1980 mgbe Onyendu Palestaịn bụ Yasser Arafat, kwupụtara mwereonwe n'obodo Algiers.
Ndị ndu dịka Thomas Sankara na Nelson Mandela na-atụnyere ọgụ mwereonwe Palestaịn na nke mwereonwe mba Afrịka.
Mana mba abụọ - Kameroon na Eritea esoghi na nkwupụta mba Afrịka ndị ọzọ banyere Palestaịn.
Ka anyị leba anya n'ihe mere ha jiri kpebie nke a.
Kameruun

Ebe foto si, Getty Images
Mba ndị nọ na Ndịda Anyanwụ Afrịka na mba Izrel na-enwe ezi mmekọrịta.
David Otto bụ Onyeisi nchekwa n'ụlọọrụ nchekwa Afrịka a kpọrọ 'Geneva Centre for African Security and Strategic Studies' kwuru na Izrel na-ahụta mba Kameruun dịka mba ọ kachasị nwee agba n'Afrịka.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"Kameruun ị maara, agaghị achọ imebi mmekọrịta ya na mba Izrel ma a bịa na mmekọrịta mba na ibe ya," ka Otto kwuru.
O kwuru na mmekọrịta ahụ dị omimi na ọ gbakwasịrị ụkwụ na nchekwa.
"Izrel etinyela ma na-aga n'ihu n'itinye ihe ịhụ na e chekwara ọchịchị mba Kameruun," ka o kwuru.
Izrel azụọla ma na-aga n'ihu n'ịzụ ọtụtụ ndịagha na ndị nchekwa mba Kameruun, tinyere ndị na-echekwa onyeisiala ha.
"Mmekọrịta Kameruun hiwere ya na mba Izrel eruola n'ogogo na Kameruun si n'azụ na-enwete nkwado mba Amerịka, nke bụkwa ezigbo ọyị mba Izrel n'ụzọ niile."
Ihe ọzọ nwereike imetụta mkpebi Kameruun nwere n'ebe Palestaịn nọ bụ nsogbu ndị o nwere na mpaghara ndị na-asụ Bekee a kpọrọ 'Anglophone Region'.
"Ịhụta Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya, ị maara ga-etinye ọgbaghara n'ime mba ha, ka ha kwee ka ndị chọrọ mwereonwe site na mba ha pụọ. Bụ nke gọọmenti kwuru hoohaa na Kameruun bụ mba na-enweghi nkewa," Otto kwuru.
A ga-asị na ebe Kameruun kwụụ gbadoro ụkwụ n'ịgba nkịtị na mkpachapụ anya. Mana nke mba Eritrịa bụ maka akụkọ mba ha nke mgbọrọgwụ ya bụ ọchịchọ mwereonwe ha.
Eritrịa

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 1988, mgbe Yasser Arafat kwupụtara Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya, ọ chọrọ nkwado mba ndị dị n'Afrịka.
Otu n'ime ha bụ mba Etiopịa.
"Isiụlọọrụ otu jikọtara mba Afrịka 'Organization of African Unity' n'oge ahụ ma mechaa bụrụ 'African Union' dị na mba Etiopịa, n'obodo Addis Ababa," ka onye ọkachamara na ndọrọ mba Eritrịa bụ Abdurahman Sayed kwuru.
"Ọchịchị ndịagha nọ n'Etiopịa n'oge ahụ kwadoro ọchịchị Soviet ma kwadoo ọgụ mwereonwe Palestaịn nakwa ikike dịịrị ya."
Mana mgbe ahụ Eritrịa na-alụ ọgụ maka mwereonwe nke ya site na mba Etiopịa.
"N'ezie n'oge ahụ, Etiopịa weere ọnọdụ n'Eritrịa. Mgbe ahụ ndị Eritrịa na-alụ ọgụ ngwaagha megide ọnọdụ ndị Etiopịa weere n'obodo ha," ka Sayed kwuru.
"Ndị Palestaịn iji nwee mmekọ ha Etiopịa, ha wezugara onwe ha n'ebe dị anya nye Eritrịa nke ghọrọ Eritrịa ahịa, nke ahụ bụ ihe m cheere na Yasser Arafat mere, nke na-adịghị ndị Eritrịa mma, tinyere onyeisiala ha ugbua," ka o kwuru.
Mana Onyeisiala Eritrịa bụ Isaias Afwerki egosila obi ebere n'ebe ndị Palestaịn nọ ma kwadoo ka e nye ha ohere isonye n'otu United Nation n'afọ 2012.
Mana ọ kwadoghi mkparịtaụka udo a kpọrọ 'Oslo Accords' nke nyere ohere maka atụmatụ udo inye Palestaịn ikike ịchị ụfọdụ mpaghara West Bank na Gaza dịka ihe mgbado ụkwụ iji bụrụ mba kwụụrụ onwe ya.
"Onyeisiala mba Eritrịa so na ndị mbụ kagburu atụmatụ nkwekọrịta 'Oslo' n'afọ 1993 dịka nkwekọrịta na-abaghị uru nke na-agaghị egbo nsogbu ọgbaghara maọbụ okwu banyere ikike na ọchịchị mwereonwe Palestaịn," ka Abdurahman kwuru.
Onyeisiala Afwerki kwuru na ọ kwadoghi ka na ogbugbu inwe mba abụọ kwụụrụ onwe ha.
Mana o nwereike izute nkwanye ọkụ n'azụ maka na ọnụọgụgụ pasentị 55% ụmụafọ mba ya bụ ndị okpukperechi Alakụba.
"Eritrịa nweere onwe ya site n'ịlụ ọgụ mwereonwe. Ya mere, onye so lụọ maọbụ duo ndị mmadụ n'ọgụ mwereonwe ịjụ ịkwado mwereonwe ndị ọzọ, abụghị ihe ziri ezi n'anya. A ga-enwe ọtụtụ nkwanye ọk," ka Sayed kwuru.
BBC kpọrọ mba abụọ ndị a ka ha saa okwu banyere akụkọ mana o nweghi onye zara n'ime ha abụọ.










