Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

    Praịm mịnịsta mba Kanada bụ Mark Carney

    Ebe foto si, EPA-EFE / Reuters

    Nkọwa foto, Mark Carney

    Praịm mịnịsta mba Kanada bụ Mark Carney ekwuola na ha adịla njikere ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ha n’ọnwa Sepụtemba, 2025.

    Kanada kwadoro ka Izrel na Palestine bụrụ mba abụọ nọọrọ onwe ha.

    Carney kwuru na ọ bụ ajọ ihe na-eme na Gaza mere Kanada jiri kwadoo ka Palestine nweere onwe ha.

    Ọ kwukwara na ọ bụ gọọmenti Palestine nke na-achị mpaghara West Bank bụ ndị ha chọrọ ka ha were ọchịchị ma kwuo na achọghị ka ndị Hamas tinye aka ha.

    Cheta na ihe a Kanada kwuru na-abịa dịka mba Briten kwukwara otu ihe ahụ.

    N’izu ụka garaaga ka Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwukwara na ha ga-anabata Palestine dịka mba nweere onwe ya.

    Cheta na mba ruru 147 n’ime mba 193 so na otu mba ụwa bụ United Nations anabatara Palestine dịka mba nweere onwe ya.

  2. Aka akparala otu nwagbọghọ a na-enyo so gbuo Nọọsụ dị ime n’Ogbunike, Anambra Steeti

    Kọmishịọna uweojii n'Anambra Steeti, anụ ahụ mmadụ dị n'ime akpa na foto onye nọọsụ ahụ e gburu n'Ogbunike, Anambra Steeti

    Ebe foto si, Anambra State Police

    Ndị uweojii Anambra Steeti ejidela otu nwagbogho a sị na o so na ndị gburu otu onye nọọsụ dị ime n’obodo Ogbunike n’okpuruọchịchị Oyi nke Anambra Steeti.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị Wenezde ma sị na ha mere nke a site n’enyemaka ndị obodo Umueri.

    Mgbe a na-agba nwada a dị afọ iri abụọ na anọ ajụjụọnụ, o kwuru na bụ ọyị nwaanyị nwaokoroọbịa gburu onye nọọsụ ahụ bụ onye a ka na-achọ achọ ugbua.

    O kwuru na ọyị ya nwoke kpọrọ ya ka o hichaa ọbara nọọsụ ahụ dị n’ụlọ ha mgbe e gbuchara ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha bepuru akụkụ ahụ nọọsụ ahụ dị iche iche ma resi ya ọtụtụ ndị dibịa na-agwọ ọgwụ n’ebe ahụ.

    O kwuru na ọyị nwoke gwara kpọrọ onye nọọsụ ahụ oku ma sị na ahụ adịghị ya iji wee rata ya ma gbuo ya.

    Ikenga kwuru na ha wakporo ụlọ otu onye dibịa dị n’obodo Itima Amawa n’ụbọchị Tuzde 29 Julaị, 2025 site n’ozi nwada ahụ nyere ha.

    Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha chọpụtara akụkọ anụ ahụ mmadụ e tinyere n’ime akpa wakịrị wakịrị ojii.

    Ha gara n’ihu kwuo na ha ka na-achọ nwaokoroọbịa gburu nọọsụ ahụ nakwa ndị niile so kpaa arụ ahụ.

    Onye bụ nọọsụ a e gburu?

    Nọọsụ a bụ onye aha ya edochabeghi anya bụ nwafọ Enugu-Ezike nke Enugwu Steeti mana o bi n’obodo Umueri dị n’Ogbunike Anambra Steeti na-arụ ọrụ dịka nọọsụ.

    Akụkọ kwuru na ọ dị ime ọnwa asaa tupu nwaokoroọbịa ahụ arata ya ka ọ bịa gwọọ nne ya ọrịa mana dịka o ruru n’ụlọ ha, ha gburu ya ma bere ụfọdụ akụkọ anụ ahụ ya.

    E buuru ozu ya tụba n’olulu dị n’ime ọhịa bụ ebe ndị obodo hụrụ ya.

  3. Netanyahu ekwuola na Briten ịnabata Palestin ịbụ mba nwere onwe ha bụ ịkwado Hamas

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Benjamin Netanyahu

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na Briten ịnabata Palestin ịbụ mba nwere onwe ha bụ ịkwado Hamas.

    Netanyahu na-ekwu nke a dịka Praịm mịnịsta Briten bụ Keir Starmer kwupụtara mmasị ha ịnabata ka enwe nkewa n’etiti mba Izrel na Palestine nke ga-eme ka Palestin bụrụ mba nwere onwe ha.

    Benjamin Netanyahu jiri akara soshal mịdịa ya katọọ atụmatụ ahụ.

    N’okwu ya “Starmer na-akwụ ndị Hamas ụgwọ ọrụ maka inyi ọha egwu ma na-ata ndị Hamas megidere ahụhụ”

    “A hapụ ka enwe mba nwere onwe ya bụ mba alakụba n’oke ala Izrel taa, na-enyi Izrel egwu, mara na echi na ọ ga-emetụta Briten”.

    “Ime ka ndị na-enyi ọha egwu nwee obi ụtọ bụ ihe ga-akpụ afọ n’ala. Ọ gaghị eme”.

  4. Onyeisiala Ivory Coast gbara afọ 83 kwuru na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro anọ

    E kwuru na amachibidola ọtụtụ ndị nwereike ịma ya aka na ntuliaka ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, E kwuru na amachibidola ọtụtụ ndị nwereike ịma ya aka na ntuliaka ahụ

    Onyeisiala mba Ivory Coast bụ Alassane Ouattara ekwupụtala na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro anọ na ntụliaka na-abịa n’ọnwa Ọktọba.

    N’ozi ya, nwoke ahụ dị afọ iri asatọ na atọ kwuru na ọnọdụ ahụike ya abụghị nsogbu na nhoputa ya bụ maka mkpa ọ dị "ichekwa nkwụsi ike mba ahụ n'agbanyeghị nsogbu nchekwa na akụnaụba na-aga n'ihu".

    Ouattara na-ekwu na iwu ọhụrụ akwadoro n’afọ 2016 tọgharịa njedebe oge abụọ ya, nke pụtara na ya nwereike ịpụta na ntuliaka.

    Ọ ga-abụ onye ga-ebute ụzọ na ntuliaka ahụ, n'ihi na amachibidola ọtụtụ ndị nwereike ịma ya aka na ntuliaka ahụ.

  5. Alaọma jijiji na Rọshịa ebutela nkwagharị na Japan na Amerịka n'ihi ịdọ aka na ntị banyere mbuze tsunami zuru ebe niile

    Mgbe alaọma jijiji mechara n'akụkụ nke obodo Severo-Kurilsk idemmiri rikpuru obodo ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe alaọma jijiji mechara n'akụkụ nke obodo Severo-Kurilsk idemmiri rikpuru obodo ahụ

    Otu n'ime alaọma jijiji kachasị ike n’akụkọ ihe mere eme nke oge ugbua ebutela nkwagharị na mba Japan, Hawaii na akụkụ ụfọdụ nke ụsọ oke osimiri ọdịda anyanwụ mba Amerịka.

    Ihe anyị maara ugbua bụ na alaọma jijiji nke dị elu ruru 8.8 dakwasara mpaghara ọwụwa anyanwụ nke mba Rọshịa butere ọtụtụ obere mmerụ ahụ na idemmiri juru ebe niile.

    Akụkọ kwuru na ebili mmiri nke Tsunami dị elu ruru mita 3-4 (10-13 ụkwụ) mere na mpaghara Kamchatka dị na Rọshịa ebe ebili mmiri 30cm (12in) dakwasara otu obodo dị na Hokkaido, ugwu Japan.

    Gọvanọ Hawaii Josh Green arịọla ndị mmadụ ka ha ṅa ntị n'iwu nkwagharị ma nọrọ jụụ ebe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump dụrụ ndị Amerịka ọdụ ka ha nọrọ na nche maka ịdọ aka banyere mbuze tsunami.

    Ka ọ dị ugbua, e wepụtala ọkwa tsunami nke dị iche iche n'akụkụ Chaịna, Philippines, Indonesia, Guam, Peru na agwaetiti Galapagos dịpụrụ adịpụ na Ecuador.

  6. Ụmụ Igbo ụtụtụ ọma nu

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 30 Julaị.

    Ka ihe ọma niile ị ga-etinye aka taa gaa nke ọma.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị n'akara Facebook, Instagram na ọbaozi WhatsApp Channelụ anyị.

    Daalụ!

  7. Keir Starmer ekwuola ọnọdụ Briten ga-eji nabata Palestine dịka mba nwere onwe ha

    Keir Starmer

    Ebe foto si, Sreengrab

    Nkọwa foto, Keir Starmer

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer ekwuola ọnọdụ ha ga-anabata Palestine dịka mba nwere onwe ha n’ọnwa Sepụtemba n’ọgbakọ United Nations.

    Starmar kwuru na naanị ihe Izrel ga-eme bụ ịkwenye n’usoro udo nakwa ịkwụsị agha na Gaza.

    Ọ sị na mba Izrel ga-egosi na ha kwadoro udo tọrọ atọ ga-adịgịde na mpaghara ahụ.

    Mba Izrel kọwara ihe Briten kwuru dịka “iti ndị Hamas aka n’obi dịka ha na-agba mbọ ka akwụsịtụ agha”.

    Ọtụtụ mba ọnụ ọgụgụ ha dị otu narị na iri anọ (140) anabatara Palestine dịka mba nwere onwe ha.

    Cheta na mba Fransị ekweela nkwa na ha ga-anabata Palestine dịka mba nwere onwe ha n’ọgbakọ otu jịkọrọ mba ụwa (UN).

  8. Etu onye ji egbe si gbuo mmadụ anọ, gbuo onwe ya na New York, Amerika

    Shane Tamura

    Ebe foto si, CBS

    Nkọwa foto, Shane Tamura

    Onye ji egbe gbagburu mmadụ anọ tupuu o gbuo onwe ya na mpaghara New York na mba Amerịka ma dee akwụkwọ kwuo ihe mere ya jiri kpaa mkpamkpa ahụ.

    Ihe ahụ mere n’isi ụlọọrụ National Football League (NFL) dị na New York.

    Meyọ na-achị ebe ahụ bụ Eric Adams kwuru na onye oji egbe ahụ tara NFL ụta maka ihe o mere.

    Shane Tamura bụ aha onye oji egbe ahụ. Ọ dị afọ iri abụọ na asatọ ma bụrụ onye Las Vegas.

    N’ihe o dere kechie n’ahụ egbe ya ka Shane nwụrụ anwụ tara NFL ụta ịkpata ihe butere ya ọnọdụ mmeru ahụ n’isi nakwa ahụike ụbụrụ ya adịghịmma.

    Otu n’ime ndị nwụrụ gunyere onye uweojii aha ya bụ Didarul Islam dị afọ iri atọ na isii bụ onye nchekwa na-echekwa ụlọ ebe ahụ mkpamkpa kpara.

    Onyeọzọ nwụrụ na mkpamkpa ahụ bụ Wesley LePatner na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ Blackstone.

    Mmadụ abụọ ndị ọzọ nwụkwara n’oge ahụ mana onye ọrụ NFL meruru nnukwu ahụ.

  9. Mmadụ ise anwụọla dịka e jidere mmadụ 500 so eme ngagharịiwe na mba Angola

    Mpaghara Luanda, mba Angola

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Mpaghara Luanda, mba Angola

    Ndị uweojii na mba Angola ekwuola na mmadụ ise n’ime ndị na-eme ngagharịiwe n’isi obodo mba ahụ bụ Luanda nwụọla ma kwuo na ha jidere maadụ narị ise.

    Ọgbaaghara dapụtara na mba Angola n’ihe e bidoro dịka ngagharịiwe maka ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala na-arị elu ọjị nke mere ndị na-akwọụgbọala ji gbaa arụkwaghịm.

    Mana nghagharịiwe ahụ bidoro na-enweghị nsogbu mechara bute ọgbaaghara na mmebi ihe.

    Mba Angola ahụbeghị udiri mmebi ihe na ọgbaaghara ha hụrụ na ngagharịiwe ahụ na nsonso a.

    E mebiri ọtụtụ ụlọ ahịa ndị mmadụ, ọtụtụ ụgbọala ma zuo ndị mmadụ ohi.

  10. Gọvanọ Ebonyị steeti akwụsịla kọmishọna 25 na mmadụ 60 ndị ọzọ ọrụ maka abịaghị mmemme gọọmenti

    Gọvanọ nyere iwu na nkwụsịtụ ọrụ ahụ ga-amalite ozugbo

    Ebe foto si, Ebonyi State Government

    Nkọwa foto, Gọvanọ nyere iwu na nkwụsịtụ ọrụ ahụ ga-amalite ozugbo

    Gọvanọ Ebonyị steeti akwụsịla ndị kọmishọna mmadụ iri abụọ na ise na mmadụ iri isii ndị ọzọ ọrụ maka abịaghị mmemme gọọmenti na steeti ahụ.

    Ozi ọnụ na-ekwuru steeti ahụ bụ Monday Uzor wepụtara kwuru na Gọvanọ Francis Ogbonna Nwifuru nyere iwu n’ụbọchị Mọnde na ndị ahụ ọ kwụsịrị ọrụ agaghị anata ụgwọ otu ọnwa.

    Uzor kwuru na ndị ọzọ aka na-achị steeti ahụ kwụsịtụrụ ọrụ gụnyere ndị enyemaka pụrụ iche iri abụọ na anọ na ndị odeakwụkwọ nke mịnịstrị mmadụ iri abụọ na abụọ.

    Uzor kwukwara na Gọvanọ nyere iwu na nkwụsịtụ ọrụ ahụ ga-amalite ozugbo ma kwuo na ndị ahụ ọ kwụsịtụrụ ọrụ enweghi ikike ibinye aka n’akwụkwọ ọbụla n’ogologo oge ahụ.

    Ọ gwakwara ndị Kọmishọna o metụtara ka ha gaa n’ihu nyefee ọrụ ha n’aka ndị odeakwụkwọ nke mịnịstrị ha.

    Ụfọdụ ndị kọmishọna o metụtara gụnyere “Stanley Lebechi Mbam, Leonard Uguru, Mathew Nwobashi, Nwogo Obasi, Victor Chukwu, Jude Okpor, Ikeuwa Omebe, Chidi Onyia, Oguzo – Offia Nwali, Ben. Uruchi Odo, Donatus Ilang, Ngozi Obichukwu, Moses Ekuma Ikenna, Richard Idike, Felicia Nwankpuma na Chinedu Nkah.

    Ndị ọzọ gụnyere Ogbonna Obasi Abara, Nkechinyere Iyioku, Francis Ori, Tochukwu Okorie, Valentine Okike Uzor, Sunday Inyima, Ogbonnaya Okorie, Elechi Elechi na Stanley Ogbuewu.

    Nnukwu ndị enyemaka pụrụ iche gụnyere; “Bassey Chukwu, Rose Ofoke, Kerian Ofoke, Anthony Nwegede, Onu Nwonye, Lilian Nwachkwu, Fred Nwogbaga, Paul Nwogha, Pius Nwoga, Ali Ikechukwu, Nwiboko Chukwuma, Esther Nwogha, Caleb onwe na Chinedu Awo.

    Ndị enyemaka pụrụ iche ndị ọzọ gụnyere; “Mbam Emmanuel, Tobias Ogbonna, Easy Okike Uzo, Obinna Oko Enyim, Chima Nnachi Okoro, Nwali Amechi, Sabinus Nwibo, Okorie Jideofor, Sunday ogenyi, Stanley Kaman, Ikechukwu Jideofor, Emeka Okpa Onwe, David Aja, na Frank Uka.

    Ndị ọzọ bụ: “John Nwangbo, Ogbonna Melford Nwifuru, Ifeanyi Ujebe, Chima Ogbuagu, Kizito Nwenyi, Uwa Henry Ifeanyi, Elechi Okechukwu Solomon, Ibina John Ogbonna, Mbam Ifeanyi na Nwigum Nonso Christian.

    Ndị odeakwụkwọ mịnịstrị gụnyere; “Lawrence Ezeogo, Isioma C Arunne-Inyang, Rose Ibe, Ogechi Nwobasi, Anwu Theresa, Lynda Alo, Monday Nkwuda, Mary Ngozi Otozi, Martina Obiya, Ogechi Anaso-Kalu, Emmanuel Onwe na Henry Nworie.

    Ndị ọzọ bụkwa “Joy Mbam, Henrietta Ikechukwu Oruh, Peter Ede, Gabriel Odo, Mfon Williamson, Alusi Felicia, Betty Uzoma, Chukwuma Ojeogu, Ikechukwu Alobu na Fidelis Nwankwo.

  11. Praịm Mịnịsta UK akpọọla nzukọ ndị kabịneti ya maka mkparịtaụka banyere oke agụụ dị na Gaza

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Trump kwuru na-enwere oke agụụ na Gaza mana Izrel agọọla na ọ bụghị ha kpatara ụkọ nri.

    Ebe foto si, Getty Images

    Praịm Mịnịsta mba UK bụ Keir Starmer na ndị kabịneti ya ga-enwe ọgbakọ taa iji nwe mkparịtaụka banyere atụmatụ ga-eweta udo na usoro enyemaka na Gaza.

    Ndị otu enyemaka na-ekwu na izuụka a dị oke mkpa ma ọ bụrụ na a chọrọ ịzọ ndị oke agụụ ji na Gaza ebe a na-akpọ oku ka Izrel wulite enyemaka.

    Otu International Rescue Committee kwuru na ọtụtụ puku ụmụaka Gaza ga-anwụ n’ime izuụka na-abịa ma ọ bụrụ na ha enwetaghị enyemaka.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Trump kwuru na-enwere oke agụụ na Gaza mana Izrel agọọla na ọ bụghị ha kpatara ụkọ nri.

    Kenyan country music fans celebrate ‘the only music that makes sense'

    Ebe foto si, EPA

    Kenyan country music fans celebrate ‘the only music that makes sense'

    Ebe foto si, EPA

  12. Mmadụ 30 anwụọla na Beijing n'ihi oke mmiriozuzo na idemmiri n’akụkụ Chaịna

    Ndị ọchịchị nọ n'isi obodo Chaịna a kwagharịla mmadụ puku iri asatọ dịka a na-ekwu na mmiriozuzo

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọchịchị nọ n'isi obodo Chaịna a kwagharịla mmadụ puku iri asatọ dịka a na-ekwu na mmiriozuzo

    Opekatampe mmadụ iri atọ anwụọla na Beijing dịka Ugwu Chaịna na-agabiga oke mmiriozuzo na idemmiri nke ọtụtụ ụbọchị.

    Ndị ọchịchị nọ n'isi obodo Chaịna a kwagharịla mmadụ puku iri asatọ dịka a na-ekwu na mmiriozuzo ọzọ ga-amalite n’ụbọchị Tuezde.

    Otu ụgbọala e ji ebu ibuidemmiri buru na Chaịna

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Otu ụgbọala e ji ebu ibuidemmiri buru na Chaịna

    Onyeisiala Xi Jinping enyela iwu ka amalite ịchọ na ịnapụta ndị mmadụ iji gbochie ndị ọzọ imerụ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, mmadụ otu narị na iri atọ ndị nọ n’ime obodo enweghi ọkụ latrik ebe ọtụtụ okporoụzọ mebiri emebi ugbua dịka onye ntaakụkọ BBC na Chaịna Stephen McDonnell siri kwuo.

    Oke mmiriozuzo abụghị ihe ọhụrụ na Beijing, ọkachasị n'oge a n'afọ.

    Cheta na idemmiri na Julaị 2012 gburu mmadụ iri asaa na itoolu nke bụ ọnụọgụgụ kacha njọ ruo ugbu a.

    Oke mmiriozuzo abụghị ihe ọhụrụ na Beijing, ọkachasị n'oge a n'afọ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Oke mmiriozuzo abụghị ihe ọhụrụ na Beijing, ọkachasị n'oge a n'afọ.
  13. Ụtụtụ ọma, ụmụ Igbo

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 29 Julaị.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị n'akara Facebook, Instagram na ọbaozi WhatsApp Channelụ anyị.

    Anyị na-asị ka ọ dịrị anyị niile mma taa.

    Ndewo!

  14. Oke agụụ dị na Gaza, Hamas na-ezu nri Amerịka zitere ohanaeze - Donald Trump

    Donald Trump

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, Donald Trump

    Onyeisiala mba Amaerịka bụ Donald Trump ekwuola na oke agụụ dị na Gaza.

    Donald Trump kwuru na ọ bụ ndị otu na-eyi ọha egwu a na-akpọ Hamas na-ezuru nri gbatagbata mba Amerịka zigara ohanaeze na Gaza.

    Trump kwuru nke na Scotland n’oge ya na Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Ọ gwara ndị ntaakụkọ na e nwere ezigbo agụụ na Gaza ma kwe nkwa na mba Amerịka ga-eguzobe ebe ndị mmadụ ga-abịa na-enwere nri na Gaza.

    N’okwu ya “a hụrụ m ọnọdụ ụmụaka n’onyonyo. Ụmụaka ndị ahụ dịka ndị oke agụụ na-agụ”.

    “Mba Amerịka enyela nnukwu nkwado, nnukwu ego na Gaza mana ọ bụ Hamas na-ezuru ọtụtụ ihe ndị ahụ”.

    Mana ndị Hamas gọrọ agụgọ kwuo na ebubo ahụ Donald Trump boro ha abụghị eziokwu.

  15. Ihe karịrị mmadụ 40 anwụọla na mwakpo ADF mere na DR Kongo

    Ụmụaka itoolu so na ndị ahụ nwụrụ

    Ebe foto si, Islamic State Central African Province

    Ihe karịrị mmadụ 40 anwụọla na mwakpo otu Islamic State na-akwado wakporo mpaghara ugwu mba DR Kongo.

    Ozi ụlọọrụ UN wepụtara kwuru na otu Allied Democratic Forces (ADF) mere mwakpo ahụ n’ụlọụka ebe ndị mmadụ gara ime ekpere. Akụkọ kwuru na mmadụ 43 gụnyere ụmụnwaanyị 19 na ụmụaka itoolu nwụrụ.

    Otu ADF ahụ gara n’ihu wakpo ma mụnye ọtụtụ ụlọ azụmahịa ọkụ.

    ADF bụ otu malitere na Yuganda n’afọ 1990s ma bo gọọmenti ebubo imekpa ndị okpukperechi alakụba ahụ. Ọ bụ na DR Kongo ka otu a nwere isi ụlọọrụ ahụ ugbua ma na-awakpo ndị nkịtị nakwa ndị okpukperechi dị iche iche na DR Kongo nakwa Yuganda.

  16. Mba Kambodịa na Taịland kwekọrịta 'ịkwụsị ọgụ ozugbo na enweghị ọnọdụ' ọbụla

    Ndị ndụ mba abụọ ahụ jidere aka n'ịdị n'otu na njedebe ọgbakọ ha na ndị mgbasa ozi

    Ebe foto si, YouTube/Associated Press

    Nkọwa foto, Ndị ndụ mba abụọ ahụ jidere aka n'ịdị n'otu na njedebe ọgbakọ ha na ndị mgbasa ozi

    Mba Taịland na Kambodịa enweela nkwekọrịta ịkwụsị agha n'enweghị ọnọdụ ọbụla dịka ndị isi mba abụọ ahụ nwere mkparịtaụka na mba Malaysịa.

    Onye ndu Malaysia Anwar Ibrahim kwuru na nkwụsị agha ahụ ga-amalite n'etiti abalị n'oge ime obodo, na-agbakwunye: "Nke a bụ nzọụkwụ mbụ dị mkpa maka mweghachi na iweghachi udo na nchekwa".

    Tupu nke a, Praịm Minista Kambodịa Hun Manet kpọrọ oku maka nkwụsị ịkwa mgbọ awa ole na ole tupu mkparịtaụka amalite ebe onye otu ya na Taịland, Phumtham Wechayachai, kwuru na Kambodịa kwesiri igosipụta "ezigbo ebumnobi" iji nkwụsị agha.

    Opekatampe mmadụ iri atọ na atọ ka e gburu ebe ọtụtụ puku mmadụ ka a chụpụrụ n’ụlọ kemgbe agha malitere n’abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Julaị.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gwara mba abụọ ahụ ka kwekọrịta na nkwụsị ịkwa mgbọ dịka ọnọdụ ha na mba Amerịka ga-eji nwee mkparịtaụka maka inwe nkwekọrịta azụmaahịa.

    Chetakwa na esemokwu dị n’etiti mba abụọ ahụ malitere ihe dịka otu narị afọ gara aga mgbe e mere okeala ha oge ndị Fransị na-achị Kambodịa.

  17. Trump ga-ezute Starmer na Ayrshire mgbe Amerịka na otu Yurop kwenyechara nkwekọrịta azụmaahịa

    A na-atụ anya na Onyeisiala Trump na Praịm Minista Starmer ga-enwe mkparịtaụka banyere Gaza, Yukren na ihe ndị ọzọ

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, A na-atụ anya na Onyeisiala Trump na Praịm Minista Starmer ga-enwe mkparịtaụka banyere Gaza, Yukren na ihe ndị ọzọ

    Onyeisiala Donald Trump ga-ezute Praịm Minista UK Keir Starmer na Ayrshire n’ụtụtụ a dịka ọ gachara awa ole na ole ekwupụtachara nkwekọrịta azụmaahịa n’etiti mba Amerịka na otu Yurop.

    Onyeisiala Trump na onyeisi otu Yurop bụ Ursula von der Leyen kwupụtara nkwekọrịta azụmaahịa ahụ na mgbede ụbọchị Sọnde mgbe ha nwechara nzụkọ na Turnberry.

    E kwuru na nkwekọrịta ahụ ga-ahụ na e nwere tarifu pasent 15 n’ọtụtụ ngwaahịa mba nọ na Yurop na-ebubata n’Amerịka.

    E kwukwara na nkwekọrịta ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Fraịde nke pụtara na Yurop ga-agbanarị nnukwu tarifu pasent 30 nke Onyeisiala Trump.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Trump na Praịm Minista Starmer ga-enwe mkparịtaụka banyere Gaza, Yukren na ihe ndị ọzọ.

  18. Izrel ga-amalite nkwụsị agha awa 10 ọhụrụ n’akụkụ Gaza iji kwe ka ebuga ihe enyemaka

    Ụlọọrụ UN nabatara nkwụsịtụ ahụ nke ha kwuru na na ọ gụnyere iwepụ ihe mgbochi ụlọọrụ kọstọm n'ihe enyemaka sitere n'Ijipt

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụlọọrụ UN nabatara nkwụsịtụ ahụ nke ha kwuru na na ọ gụnyere iwepụ ihe mgbochi ụlọọrụ kọstọm n'ihe enyemaka sitere n'Ijipt

    Mba Izrel ga-amalite nkwụsịtụ ọrụ ndịagha awa iri ọzọ n'akụkụ Gaza n’elekere asatọ 08:00 BST (07:00 GMT) iji kwe ka ebuga ihe enyemaka na mba ahụ.

    Cheta na nkwụsịtụ agha ahụ malitere dịka ụlọọrụ enyemaka ndọrọ aka na ntị banyere oke agụụ dị na mpaghara Gaza.

    N’ụbọchị Sọnde, ụlọọrụ ahụike mba ụwa bụ World Health Organization kwuru na erighị nri na-edozi ahụ na Gaza, eruola ọnọdụ dị oke egwu.

    N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ UN nabatara nkwụsịtụ ahụ nke ha kwuru na ọ gụnyere iwepụ ihe mgbochi ụlọọrụ kọstọm tinyere n’ihe enyemaka sitere n'Ijipt, na ụzọ nchebe nke ụgbọala ndị njem.

    Mana o kwukwara na a ga-aga n’ihu n’ime nke ahụ - yana ịhụ na agaghị enwe “mwakpo ọzọ ebe ndị mmadụ na-ezukọta maka inwete nri”.

    Ọzọ, e jikwa ụgbọelu were e bubata ihe enyemaka mmadụ na Gaza n’izu ụka – mana ọ bụ obere ihe nyere ihe ndị Gaza chọrọ.

    E jikwa ụgbọelu were e bubata ihe enyemaka mmadụ na Gaza n’izu ụka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, E jikwa ụgbọelu were e bubata ihe enyemaka mmadụ na Gaza n’izu ụka
  19. Ụmụ Igbo, mma ma nu

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 28 Julaị.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị n'akara Facebook, Instagram na ọbaozi WhatsApp Channelụ anyị.

    Ka ihe niile i tinyere aka n’izu ọhụrụ a, gaa nke ọma.

    Udo dịrị gị!

  20. EU na Amerịka enweela nkwekọrịta ụtụisi maka mbubata ọbụla si Yurop abata Amerịka

    Donald Trump na Ursula von der Leyen.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Donald Trump na Ursula von der Leyen.

    Mba Amerịka na otu jịkọrọ ọtụtụ mba na Yurop bụ "European Union" enwela nkwekọrịta azaụmahịa.

    Ha kwekọrịtara ụtụisi pasenti iri na ise na mbubata ọbụla si Yurop na-abata mba Amerịka.

    Nke a na-abia dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisi ụlọọrụ European Commission bụ Ursula Von der Leyen nwechara nzụkọ na Scotland n’ụbọchị Sọnde, Julaị Julaị, 2025.

    Nkwekọrịta ụtụisi ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Frịde.

    Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump na Onyeisi ụlọọru European Commission bụ Ursula von der Leyen na-enwe nzukọ gbasara ụtụisi

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump na Onyeisi ụlọọru European Commission bụ Ursula von der Leyen.