Etu aka si kpara otu na-atọrọ ụmụaka n'Ugwu-Awusa, ere na Ndịda

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Aka ndị uweojii Kano akparala ndị ji ịtọrọ ụmụaka n'Ugwu Awusa na-ere ha na steeti dị iche iche na Ndịda Naijiria, mere ọrụ.

N'abalị 15 nke ọnwa Disember af ọ 2023, a nwụchiri otu nwaanyị a kpọrọ Comfort Amos ka ọ kpọ nwatakarịị gbara afọ ise Abdulmutallib Sa'ad achọ ime njem gawa Legọs.

E mechara chọpụta na a tọọrọ Abdulmutallib n'abalị 12 nke ọnwwa Disemba na 'Zango Quarters' dị na Bauchi Steeti.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kano bụ Abdullahi Kiyawa si kwuo, nnyocha ndị uweojii mere ka a nwuchie gosiri ndị ọzọ a na-enyo na aka ha dị nà mkpamkpa otu ahụ.

Ha gụnyere Chika Ezugbu, Joy Nzelu, Clement Ali na Emeka Ekeidigwe, bụ ndị bicha Kano ma na-akpa mkpamkpa na , Bauchi, Anambara.Imo na Legọs.

Kiyawa gwara BBC sị,"Ka ọ dị ugbua, anyị anwụchiela mmadụ itoolu ma hụ ụmụaka asaa dị agbata afọ atọ rue asatọ n'aka ha."

SP Kiyawa kwuru na ha gbanwere aha Abdulmutalib Sa'ad, gụọ ya Ifeanyichukwu, ma ree ya puku nari naira anọ na ụma puku iri asatọ (N480,000), nwa nwaanyị ha tọtara na Bauchi bụ Asiya Mukhtar ha gụgharịa ya 'Chioma' rekwa ya N480,000.

Ọ rụrụ aka na a hụla ndị nwe ụmụaka ahụ , ebe ndị anwuchiri nọ n'aka ndị uweojii.

SP Kiyawa, "Anyị anwụchiela ma ndị rere na ndị zụrụ ụmụaka ndị ahụ, ha kọwaa etu ya bụ ihe si mee nakwa ego ha zụrụ ụmụaka ahụ."