Etu ọrụ enyemaka m si mee ka ọha mara m - Okwuluora

- Onye dere ya, Ezennia Uche na Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist na Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Otu nwoke na-arụ ọrụ enyemaka aha ya bụ Emmanuel Onyekachi Okoh e ji "Okwuluora ndi Igbo" mara, kọọrọ BBC Igbo ije ndụ ya na etu o siri malite ọrụ enyemaka.
Ọ kọrọ etu ya na ezịnaụlo ya siri taa ahuhu, etu nna ya siri rịa ahụ mana ha enweghị ego ịkpọga ya ụlọọgwụ nakwa etu o si mechaa nwụọ,ha ahụghị ego akpati ozu.
Okwuluora onye gbara ama na ọ na-arịa ọrịa shuga kwuru na ya achoghị ego na ihe ndị ọzọ na-enyere ndụ aka, naani ihe ya chọrọ bụ ka Chukwu gwọọ ya ọrịa.
N'okwu ya,''onye ahụike amaghị ihe onye ọrịa na-ahụ'' .
Okwuruora kọrọ etu ọrịa shuga si emekpa ya ahụ, ''a na m ekwu ya n'ihu ụwa niile na a na m enwe obi ịda mba, ọ bụghi ihe niile nwoke hụrụ ka ọ na ekwu mana ka m kwuo ya mbụ, ana m arịa ọrịa shuga, ọrịa ọbara mgbalielu na ''neuropathy.''
Ọ gwara ndi mmadụ ha kwụsị ikpe ekpere ịdi ka onye ọzọ n'ihi na ha amaghị ihe onye ahụ na-agabiga.
N'akụkọ ya, Okwuluora gwara BBC Igbo na inyere mmadụ aka bụ ihe na-enye ya obi aṅụrị,
O kwuru na ọtụtụ mmadụ enwetala enyemaka n'aka ya.
Onye na-eme ihe ejije ‘’Nollywood’’ bụ Chinwetalu Agu, otiegwu Mike Ejeagha nakwa ndị ọzọ bụ ndị ọ nyereela aka.
Na mkpokọta, Okwuluora nyere ndị hụrụ ya n'anya ndụmọdụ, ọ gwara ha jisie ike na-akwado ya, na ọ bụ Chukwu ga-akwụ ha ụgwọ.
Ọ nyere ụmụntorobịa ndụmọdụ, ''nke onye na-eme ya jisie ike, o nwere ike ịhịa ahụ na mbido, mana nke dị n'ihu ka. Oge Chukwu ka mma.''






