Amarachi Okechi: Etu e si kụọ ajadu ihe tinka kụrụ pan n'ihi ebubo ịbụ amosu

Amarachi Okechi

Ebe foto si, Screengrab

Otu ajadu nwaanyị eriela arịrị na anya mmiri dịka a kụrụ ya ihe tinka kụrụ panụ n'ihi ebubo ọ na-ata amosu.

Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na e ji ụdọ kechie Amarachi Okechi aka na ụkwụ kpụpụ ya n'ahịa n'obodo Umueghu dị n'Amaegbuato n'okpuru ọchichi Bende, ebe a nọ pịa ya ụtarị apịa apịa.

A sị na ọ bụ nwunye nwanne di ya boro ya boro nwaanyị a ebubo ịta nwa ya nwaanyị amosu.

Akụkọ kwuru na ndị na-ebo nwaanyị ahụ ebubo kpụrụ ya gaa n'aka dibia onye kwuru na ebubo e boro ya bụ eziokwu.

Ha jichiri nwaanyị ahụ, kpụpụ ya n'ahịa obodo ebe ha ji ụtarị kugide ya ọbara na-agba ya n'ahụ.

Ndị obodo chụpụrụ onye ọbụla chọrọ ịbịa nyere nwaanyị ahụ aka, ma mechaa daa ya nha puku nara iri ise, bụ ego ha si dibia afa nara ha.

Ha jichiri ya n'ama rue ụbọchị nke abụọ ma kụkwaa ya ihe ma na-amaja ya na ha ga-amụnye ụlọ ya ọkụ.

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na nsonso a gosiri ka ụmụ okorobịa obodo na-apịa Okechi onye ibe ya, ebe ndị ọzọ na-akiri ya.

BBC Igbo kpọtụụrụ nwa nwaanyị ajadu ahụ bụ Onyinye Okechi, o wee kọọrọ anyị etu nwunye nwanne nna ya si bo nne ya ebubo nke kpalitere ụka ahụ.

Ọ sịrị: "Ọ bụ nwunye nwanne nna m onye di ya nwụrụ malitere ibo ebubo na ọ bụ nne m gburu di ya."

"Oge nwa ya nwaanyị malitere ịrịa ahụ, o bowekwa nne m na ọ bụ ya mere nwa ya ihe ọ na-arịa."

"Nne m gwara ya na aka ya dị ọcha, na ya kpọrọ nwa ya na-arịa ahụ gaa ụlọọgwụ."

"Mana ọ na-agagharị ma n'ahịa ma na ebe ndị ọzọ na-ekwusa na nne m bụ amosu."

"Ihe a were nne m iwe, o kpesara ndị okenye obodo."

"Ha gwara nwaanyị ahụ na-etu esi eme ya bụ na ọ ga-akpọ ndị okenye oku n'ahịa, kọsara ha maka ebubo ọ na-ebo nne m mana nwaanyị ahụ emeghị ya."

Onyinye gara n'ihu kwuo na otu nwoke kporo ndị okenye oku n'aha nne ya, ha wee nyochaa ya bụ okwu mana amaghị nne ya ikpe.

Mana n'ụbọchị Tuzde gara aga, nne ya kpọrọ ya n'ekwentị kwuo na nwaanyị ahụ kpọrọ oku ka ha ga na nke dibia na ọ bụ ebe ahụ ka a ga-ekwu ma ọ bụ ya nyụrụ ihe na-esi.

"Agwara m ya agala, na ndị ahụ agaala n'azụ kpaa nkata ọjọọ, mana nne m siri ọnwụ na ya ga-aga n'ihi na aka ya dị ọcha."

"Oge ha gara, dibia ahụ kwuru na nne m mere ihe ahụ e boro ya."

"Ha gara n'ụlọ ya kpụrụ nne m gaa n'ọma ahịa kechie ya aka tigide ya ihe ruo mgbe o kwetara na o mere ihe o meghị ka ha were tọhapụ ya."

Nwada Onyinye, onye bi na Legos, kọwara na ọ bụ ego ọ chọrọ iji kwụọ ụgwọ ụlọ ka o zigara ka nne ya were kwụọ 50,000 ahụ ndị obodo sị ya kwụọ.

Ihe nwunye gọvanọ Abịa,Oxfam kwuru maka ihe a mere

Nkechi Ikpeazu bụ nwunye Govanọ Okezie Ikpeazu nke Abia steeti

Ebe foto si, Abia Government

Ka ọ dị ugbua, nwunye gọvanọ Abia steeti bụ Nkechi Ikpeazu, agbapụtala nwaanyị ahụ kpọga ya ụlọgwụ.

Dịka ọnụ na-ekwuru gọvanọ Okezie Ikpeazu si gba n'ama, nwunye gọvanọ katọrọ ihe a ọ kpọrọ agwa ọjọọ a kpasara ajadu nwaanyị ahụ.

Onyeisi ụlọọrụ 'Oxfam International', na Naijiria bụ Dr. Vincent Ahonsi tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ ma kwuo na etu e si mechuo nwaanyị ahụ ihu bụ arụ kwọ nwa.

Ahonsi gara n'ihu sị, “O wutere anyị etu mmegbu na mmekpa ahụ ụmụnwaanyị gbadoro ụkwụ n'omenala si aga n'ihu na Naijiria."