Widowhood in Igboland: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ - Udemezue
Gozie Udemezue bụ onye ọkaiwu na-agba mbọ maka ikike dịrị ndị di ha nwụrụ.
Mana o mechara di ya nwụọ, o were hụ na oge ime ihe ọ na-akụzị eruola.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Udemezue gbara ama na ụfọdụ ndị enyi di na-achọ ndina tupu ha enyere nwaanyị di ya nwụrụ aka.
Ọkọwara etu ya siri zere nsogbu ndị di ha nwụrụ na-enwekarị dịka enweghị aṅụrị, ụbịam nakwa ajọ omenala na-emegide ndị ajadu.
Kirie ya n'uju: