Ihe anyị ma maka ụmụnwaanyị Kamerun abụọ a tọọrọ ma hụụ ozu ha n'osimiri Omambala, Anambra Steeti

Ebe foto si, Anambra State Police
Ndị uweojii Anambra Steeti sị ha achọpụtala ozu ụmụnwaanyị abụọ a na-eche bụ nke ụmụafọ mba Kamerun abụọ na mmiri Omambala dị n'Anambra West.
Nke a na-abịa dịka ha jidechara ụmụnwoke abụọ bụ ụmụnne ndị a na-enyo enyo na aka ha dị na ntọrị na ogbugbu ụmụnwaanyị a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị a e jidere nyeere ndị uweojii aka site n'ịgba ama nke mere ha jiri chọpụta ozu ụmụnwaanyị ndị a.
O kwuru na ndị ọrụ uweojii ngalaba 'Rapid Response Squad RRS' na ndị maara ka e si egwu mmiri ọfụma nakwa ndị enyemaka si n'obodo gara n'osimmiri Omambala ahụ n'ụbọchị Fraịde 28 Nọvemba 2025 ịchọ ozu ndị a.
O kwuru na mgbe na-erugharị na mmiri ahụ, ha chọpụtara ozu ụmụnwaanyị abụọ dịka ha na-erezi ere bụ nke ụmụnwaanyị abụọ n'ime ụmụnwaanyị ndị ahụ a tọọrọ.
A kpọtụrụ ndị ezinaụlọ ụmụnwaanyị ndị a bụ ndị kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị bụ ụmụnne ya ma nye aha ha dịka Bognou Alice na Sandra.
Dịka ọ dị ugbua ndị uweojii ka na-achọ ozu otu nwaanyị nke mere ha atọ nakwa otu onye n'ime ndị so tọọrọ ha bụ onye gbara ọsọ a ka na-achọ achọ.
Kedụ etu e si tọọrọ ma gbuo ụmụnwaanyị a?

Ebe foto si, Anambra State Police
Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị atọ ndị a si mba ha bụ Kamerun bịa ịzụ ahịa n'Onitsha, Anambra Steeti mgbe ndị ntọrị a tọọrọ ha n'ụbọchị Mọnde 10 Nọvemba 2025.
Ndị ntọrị a kpọtụụrụ ndị ezinaụlọ ụmụwaanyị a ma sị ka a kwụọ ha ụgwọ iji tọhapụ ha mana mgbe a kwụrụ ha ego dị nderi naịra abụọ na puku narị itoolu (N2.9m) ha jụrụ ịtọhapụ ha bụ mpaghara nde naịra iri ise (N50m) a sị ha kwụọ.
Mgbe a na-agba ndị ntọrị ahụ e jidere ajụjụọnụ, ha kpọọrọ ndị uweojii gaa n'ime ọhịa dị iche iche n'obodo Anam bụ ebe ha dosara ụmụnwaanyị atọ ndị a.
Mana ndị mmadụ bi na gburu gburu ebe ahụ gbaara ndị uweojii ama na ha hụrụ ozu ụmụnwaanyị atọ a na-amaghị ndị ha bụ ka o sere n'elu mmiri ndị nso n'ebe a dosara ụmụnwaanyị ndị a.








