Etu m si gbanahụ ọnwụ n'aka ndị ntọrị n'obodo Imilike Ani nke Enugwu steeeti – Anya hụrụ ka o si mee

Nke a na-egosi aka nwoke ahụ anyị kpọrọ 'Afamu' n'akụkọ a nakwa ụzọ obodo ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọnọdụ nchekwa n'Enugwu steeti n'ikpeazụ a abụrụla okwu a kpụ n'ọnụ ọkachasị ihe na-eme n'okpuruọchịchị Udenu.

Obodo dịka Obollo Afor, Obollo Etiti, Ezimo na Imilike bụ ebe ndị ojiegbe a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-achị ehi kpara mkpamkpa na nke ikpeazụ a.

Otu onye n'ime ndị ojiegbe a wakporo ma merụọ nnukwu ahụ kọrọ ihe ọ ga-abigara n'aka ha mgbe ha chọrọ ịtọrọ ya.

Nwamadị a na ndị ọzọ hụrụ ka o si mee gwara BBC ihe ha hụrụ nakwa etu ọnọdụ nchekwa si dị ọjọọ na gburu gburu ebe ahụ.

"Anyị nọ n'egwu ugbua"

Nwamadị a bụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya n'ihi egwu gwara BBC Igbo na ọtụtụ ezinaụlọ bi na mpaghara ahụ nọ n'egwu ugbua n'ihi ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa.

"Ugbua ezinaụlọ anyị esila n'ime obodo anyị gbaa ọsọ maka egwu ndị ojiegbe"

"Nne m nọzị na nke m ugbua n'ime Enugwu, dị ka a wakpochara obodo anyị".

A gwara anyị na otụtụ ndị mmadụ adịghịzị agagharị n'ime abalị maọbụ gaa n'ugbo ebe ha na-akọ nri maka egwu ndị ntọrị maọbụ ndi ojiegbe.

"Ihe ọzọ na-atụ ụjọ bụ na ha bịara n'ụlọ onye agbata obi anyị tọrọ otu nwoke na nwunye ya n'abalị mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itoolu".

Etu m si gbanahụ ọnwụ n'aka ndị ojiegbe

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu onye ọzọ gwara BBC Igbo okwu kọwara etu o si gbanahụ ọnwụ n'aka ndị ojiegbe a.

Onye a na-achọghị ka a kpọọ ezi aha ya, nke a anyị kpọrọ "Afamu" maka akụkọ iji maara ya.

N'okwu Afam "ihe a mere n'ọnwa Ọktoba 15, 2025. Oge m si ọrụ na-alọta, anọ m nso n'ụlọ anyị, n'ihe dịka elekere asaa nke abalị, ihe ọzọ hụrụ bụ ndị m na-amaghị ndị ha bụ ghọọr m n'ukwu, sị m soro ha.

"Ha na-asụ asụsụ "Pidgin English" mana a gwara m ha na m agaghị eso ha maka na m nọ nso n'ụlọ anyi, m tie mkpu, nne m na nwanne m anụ olu m ma pụtazie soro na-eti mkpu".

"Ka nne m na na nwanne m na-eti mkpu, ndị ntọrị wepụtara egbe ha ma chee ya n'ihu ka ha bịa nso.

"Otu onye n'ime ha wepụtara mma ya. Oge ahụ ka m zọsara ya mma ahụ chọrọ ịgba ọsọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ chọrọ igbu m mma ahụ, m wee tinye aka m zọrọ onwe m ma gbapụ ọsọ".

"N'aka m ka ha gbujiziri m mma ahụ"

BBC Igbo jụrụ Afam Ajụjụ ma o nwereike ịkọta ndị ahụ chọrọ ịtọrọ ma gbuo ya mma, o kwuru na "ahụtaghị m ihu ha nke ọma mana ụda olu okwu ha gosiri na ọ bụ ndị Fulani".

"Ma ahụ ha dika etu ndị Fulani si adị"

Mana Afam kwuru na o nweghi ehi ndị a na-achị mgbe ha chọrọ ịtọrọ ya".

Afam kwuru na onye nche ọdịnala bụ onye hụrụ ya mgbe ọbara na-achọ igbagbu ya ma nyere ya aka gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị nso nye mkpesa tupu ha aga n'ụlọọgwụ ebe ọ nọrọ ihe ruru abalị ise.

Ọnọdụ nchekwa n'Imilike na gburugburu ya

Otu onye ọrụ nchekwa Gọọmenti Enugwu steeti nke ngalaba Forest Guard kọwara etu ndị ojiegbe ahụ si akpa mkpamkpa na mpaghara ahụ.

O kwuru na "ọ bụ eziokwu na ndị ahụ a na-enyo enyo na ha bụ Fụlanị na-aga n'ụlọ na-atọrọ ndị mmadụ maka na ọ bụ n'ụlọ ndị mmadụ ka ha gara kpụrụ otu nwoke na nwa nwanne ya nwaanyị n'Imilike n'abalị iri na ise nke ọnwa Oktoba, 2025".

O kwukwara na "ọ bụkwa etu ahụ ka ha si gbuo otu onye n'Ezimo tupu ha abịa mee nke Imilike".

Gịnị ka ndị uweojii mere kamgbe ahụ?

Kamgbe ahụ mkpamkpa ahụ kpara ọtụtụ ndị mmadụ nwereike na-ajụ ajụjụ sị "kedụ ihe ndị uweojii megoro kamgbe ahụ?

Ọ bụ otu ajụjụ ahụ ka BBC Igbo jụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe.

BBC Igbo gbara mbọ ịmata ma o nweela ndị e jiderela na mwakpo ahụ nakwa ihe ndị uweojii merela banyere nchekwa na mpaghara Imilike na agbataobi ha; mana tupu akụkọ a apụta anyị enwetabeghị ọsịsa banyere ajụjụ ndị ahụ.