Peter Obi, Yul Edochie, Osinachi Nwachukwu... Lee ndị a kacha chọọ na 'google' n'afọ 2022

Ebe foto si, Peter Obi/Yul Edochie/Osinachi Nwachukwu
Ụlọọrụ 'Google' ewepụtala ihe ndị mmadụ kacha chọọ n'ịntaneetị na Naịjirịa n'afọ 2022.
Google na-ewepụta aha a kwa afọ iji gosi ihe kacha masị ndị mmadụ na mba dị icheiche bụ nke kpalitere mmụọ ha ịmatakwu ihe gbasara ha.
Na nke afọ a, ndị aha ha so na ndị a kacha chọọ n'ịntaneetị n'afọ a gụnyere, Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na Labọ pati, Yul Edochie bụ onye ejije Nollywood a ma ama, na Osinachi Nwachukwu bụ otiegwu ụka a ma ama larala mmụọ.
Ihe mere ndị a ji wuo n'afọ 2022
Peter Obi bụ aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na Naịjirịa dịka o si n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ nọbu bụ 'Peoples Democratic Party' (PDP) pụọ banye Labour Pati.
Ọtụtụ ndị ntorobịa na soshal midia na-akwado ya maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ ga-eso zọọ na ntuliaka a ga-eme na Febrụwarị 25, 2023.
Yul Edochie bụbu onye ejije Nollywood a ma ama nke ukwu. Nna ya bụ Pete Edochie bụkwa onye ejije a ma ama.
Mana ihe mere aha Yul ji kpọtụọ ebe niile bụ oge ọ pụtara kwuo na ya alụọla nwaanyị nke abụọ. Nke a mere n'ọnwa Eprel afọ.
Nwaanyị nke abụọ Yul lụrụ bụkwa onye ejije aha ya bụ Judy Austin, onye ya na Yul mekọrọla ejije dịka di na nwunye n'oge gara aga.
Yul kwuru na Judy Austin mụọrọ ya agadaga nwa nwoke, nke mere o ji lụọ ya.
Osinachi Nwachukwu bụ onye otiegwu ụka a ma ama onye lara mmụọ n'ọnwa Eprel 2022.
Mana ihe kacha wute ndị mmadụ nke mere akụkọ ọnwụ ya ji fesaa ebe niile bụ oge akụkọ pụtara na di Osinachi, bụ Peter Nwachukwu, na-emekpa ya ahụ nke ukwuu oge ọ dị ndụ, na ọ bụ ya tigburu nwunye ya bụ Osinachi.
Ezinụlọ na ndị enyi Osinachi kọkwaara BBC Igbo, n'oge ahụ, ọtụtụ ihe ụfụ na mmekpa ahụ Osinachi gabigara n'aka di ya bụ Peter, nke mere ha ji kwenye na ọ bụ ya tigburu ya.
Leeetu ụlọọrụ 'google' si gospipụta ihe ndị mmaọ̄ụ kacha chọọ n'afọ a:
Ihe ndị a kacha chọọ...
- AFCON
- ASUU Strike
- IPhone 14
- Oxlade
- NATO
- Buga
- Peter Obi
- Ukraine
- World Cup
- Asake
Ndị mmadụ a kacha chọọ...
- Oxlade
- Asake
- Peter Obi
- Black Sheriff
- Casemiro
Ndị na-eme ejije a kacha chọọ...
- Will Smith
- Johnny Depp
- Yul Edochie
- Osita Iheme
- Judy Austin
Ndị na-eme egwuregwu a kacha chọọ...
- Casemiro
- Lisandro Martinez
- Antony
- Gabriel Jesus
- Raphinha
Egwu (Lyrics) a kacha chọọ...
- Finesse lyrics
- Overdise lyrics
- Rush lyrics
- If i broke na my business lyrics
- Palazzo lyrics
Nri a kacha chọọ...
- Fried Rice recipe
- Afang soup recipe
- Jollof Rice recipe
- Banana bread recipe
- Parfait recipe
Onye bụ...?
- Onye bụ osote Peter Obi?
- Onye bụ Ezenwaanyị Elizabeth?
- Onye bụ chi agha mba greek?
- Onye bụ onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala na APC?
- Onye bụ osote Atiku?
Ekwentị a kacha chọọ...
- Iphone 14 pro max
- Iphone 13 pro max
- Tecno Camon 19
- Infinix Note 12
- Tecno Spark 12
- Infinite Note 11
- Redmi Note 11
- Infinix Smart 6
- Tecno Spark 9
- Tecno Spark 8
Ejije/Ejije TV a kacha chọọ...
- Anikulapo
- Blood Sisters
- House of Dragon
- Thor - Love & Thunder
- The Woman King
- Selina Tested
- Tinder Swindler
- Black Panther 2
- Eternals
- All of us are dead
Egwu a kacha chọọ...
- Buga - Kizz Daniel
- Overdose - Mavin
- Machala - Berri Tiga ft Carter Efe
- Calm Down - Rema
- Rush - Ayra Starr
Ndị lara mmụọ a kacha chọọ...
- Queen Elizabeth
- Osinachi Nwachukwu
- Ada Ameh
- Rico Swavey
- Takeoff
Ndị otiegwu a kacha chọọ...
- Oxlade
- Asake
- Black Sherrif
- Portable
- Lil Tjay
Gịnị bụ...
- Gịnị bụ lupus?
- Gịnị bụ NATO?
- Gịnị bụ NFT?
- Gịnị kpatara agha Russia na Ukraine?
- Gịnị ka Zazu Zeh pụtara?
- Gịnị bụ PVC?
- Gịnị bụ intersex?
- Gịnị ka Sapa pụtara?
- Gịnị ka e ji mara Greta Thunberg?
- Gịnị ka a na-akpọ ntị mmadụ ime ụda?












