Nude shoot: Etu mmadụ 2500 wepụtara onwe ha si gbara ọtọ see foto n'ikperemmiri

Ebe foto si, EPA
Mmadụ 2500 wepụtara onwe gbara ọtọ n'ụtụtụ chi ofifo ụbọchị Satode (26/11/2022 see foto n'ikperemiri 'Bondi Beach' dị na Sidney, mba Ọstrelia.
Dịka Spencer Tunick, oseefoto mba Amerịka bụ onye haziri eserese ahụ si kwuo, nke a bụ iji mee ka ndị mmadụ mata maka nsogbu ọrịa kansa nke akpụkpọ ahụ.
Tunick bụ onye a ma ama maka ise ọha mmadụ gbọ ọtọ n'ọha foto n'ebe a ma ama n'ụwa si kwuo na Twtter ya, " Anyị gbakọrọ neyighi ihe ọbụla karịa akpụkpọahụ anyị, na-ele ife ka ọ n'abata na ikperemmiri Bondi Beach, kwụrụ n'ike na-akwanyere ndị nile kansa gburu, mara na anyị ga-abụ agbụu ga-akwụsị ya."

Ebe foto si, EPA
Tunick na ụlọọrụ na abụghị gọọmentị na-alụ ọgụ megide kansa akpụkọ ahụ a kpọrọ"Skin Check Champions bụ ndị gbakọrọ aka mee eserese foto ahụ n'ọdọmmiri "Bondi Beach'.
Iji mee ka esemfoto ahụ nwee isi, mba Ọstrelia gbanwere iwu ha nke megidere mmadụ ịgba ọtọ n'ikperemiri nke mbụ ya.

Dịka ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka kansa n'ụwa bụ 'World Cancer Research' si kwuo, mba Ọstrelia bụ ebe nsogbu kansa akpụkpọahụ kachasị n'ụwa ndum.








