'Abụbu m 'pastor' mana ugbua a bụzị m dibịa' - Ikuku the Great Ijele
Otu nwaamadị bụbu ụkọchukwu n’ụka Kraịsti akọwala ihe mere o jiri hapụ okpukperechi ụka Kraịsti ma wụba okpukperechi omenala dịka onye ọgọọ mmụọ.
Na mkparịtaụka a Kingsley Osai na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na etu o si bụrụ otu nwa naanị nna ya, onye lụrụ nwunye 16 mụrụ.
O kwukwara na kemgbe ọ dị na nwata na ndụ ya dị iche.
Ịza ihe mere o jiri mkpebie ịhapụ okpukperechi Kraịsti bụ okpukperechi kacha ewu ugbua n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ ebe nwaamadị a si, o kwuru “O teela ndị nna ya ha ji a kpọ m oku ka m sonye ha mana anọ m na-agba ọsọ.”
“Okpurukperechi Kraịsti bụ ụzọ ụka e ji zụọ m mana a ma m na ndụ m pụrụiche kemgbe.”

Ọ gara n’ihu kọwa na dịka ọ bụ naanị nwa nna ya onye bụkwa dịbịa na ọgọo mmụọ mụrụ na ndị nnanna ya ha a họpụtala ya kemgbe ka o soro ụkpụrụ nna ya.
O kọwara na ọ dara ọrịa nke kpalitere mkpọnwụ ahụ ya.
O kwuru, “E bugara ọtụtụ ebe ọgwụgwụ mana enweghị onye nwereike ịchọta ọgwụgwọ ihe na-eme m.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ mgbe ha nọ na-achọ ụzọ mgbapụta n’ọrịa ahụ ka otu onye gbara ya ama na e nwere ihe ọ na-agbara ọsọ nke ọ kwesịrị ịga gbakwuru.
Osai onye na-azasị aha ‘Ikuku Ijele’ dịka ọ hapụrụla aha Bekee ya kwuru na mgbe ahụ ka o jiri kpebie na ọ ga-esoro nzọm ụkwụ nna ya ma malite iso okpukperechi nke ịgọ mmụọ n’omenala Igbo.
Ọ hapụrụ be ya ma lọghachị obodo ya bụ Enugu Ezike ma malite ime nchuaja nakwa usoro nrabanye nke ya bụ okpukperechi.
Nke a mere ka ahụ ọ dara laa kpam kpam dịka o kwuru na ịza oku ahụ mere ahụ ya agbakee.
Ugbua Ikuku ijele bụzị onye ọgọọ mmụọ n’usoro omenala Igbo ma na-agbasa ozi okpukperechi a n’akụkụ steeti ahụ.
Ọ jikwa ohere ahụ dụọ ndị ntorobịa na ndị ọgbara ọhụrụ ndụmọdụ ka ha lọghachite n’ụzọ omenala Igbo ma hapụ ụzọ ndị Bekee zitere.



