King of Satan/Simon Odo: "Abụ m Eze Ekwensu, ekwensu bụ nna m"
Dibia anya nzu bụ Simon Odo e ji 'eze Ekwensu' maara kwadoro ọfụma tupu ọ nwụọ.
Otu nwa ya nwoke gwara BBC Igbo na ọ sị ka e were ụgbọala ingine ya na-asụ asụ, e tinyere ekwuo Osadebe na-asụ n'ime ya lie ya ma ọ nwụọ.
Ọ sị na ọ hapụụrụ ha ego n'ime ụlọ nke ọ sị ka ha were lie ya dịka 'eze' ọ bụ.
Ka ha emepela ụlọ ahụ ruo otu izuụka ọ nwụchara, tupu ha emepeela ma were ego ọ hapụrụ ebe ahụ maka akwamozu ya.
Ọ gaara n'ihu sị na 'eze Ekwensu' sị ka ha etinyekwala ya n'ụlọ ozu bụ 'mortuary' ma ọ nwụọ.
E ji ụgbọala lie 'eze Ekwensu' lara mmụọ
Ụmụ Simon Odo e ji eze ekwensu wee mara akọwaala etu e si lie nna ha n'abalị ụnyahụ bụ December 14,2021.
Uchenna Odo bụ nwa ya nwoke kwuru na e ji ụgbọala lie nna ya n'abalị ahụ.
O kwuru na agbanyere mmanụ ụgbọala n'ụgbọala ahụ, gbanye egwu, tinye ọkụ ihu ụgbọala ahụ ma mee ka ingin ụgbọala ahụ na-asụ ma buru ozu Eze ekwensu chewee ya aka n'igwe e ji anya ụgbọala.

Ebe foto si, Screengrab from youtube
Ụmụ ya kwuru na etu a e si were ụgbọala lie ya gosiri na ọ ga-enwe ije awele banye ụwa ọzọ chi ya dowere ya.
Ha kwuru na usoro olili a bụ nke Simon Odo si ka emere ya mgbe ọ dị ndụ.
Ụmụ nwanne Odo kwuru na ha na-echeta nwanne ha dịka ezigbo mmadụ hụrụ ọha n'anya site n'ezigbo ihe ọ na-emere ndị mmadụ.
Odo nwụrụ n'ụzụ ụtụtụ tusde bụ ụbọchị Disemba 13,2021.

Etu Eze ekwensu si laa mmụọ
Maazị Simon Odo, onye a ma ama dịka "Eze Ekwensu" anwụọla ka ọ gbachara afọ 74.
Nwa Odo bụ Uchenna Odo kwuru na nna ya nwụrụ n'ebe Elekere atọ nke ụzọ ụtụtụ taa bụ Tuzde ka ọ rịachara ọrịa nwa oge.
Uchenna Odo a ma dịka 'rainmaker' gwara BBC Igbo n'ekwentị sị "Ọ nwụọla. A na-akwado ili ya n'abalị a."
Odo, onye Aji n'Okpuruọchịchị Igboeze North dị n'Enugwu Steeti, bụ onye dibia a na-anụ aha ya.
Onye lụrụ nwaanyị 57, Odo gwaburu BBC Igbo na mkparịtaụka na ya amaghị ọnụọgụgụ ụmụ ya na ndị nwunye ya mụrụ.
'Abụ m Eze Ekwensu, Ekwensu bụ nna m'
Simon Odo na-aza Eze Ekwensu ma sịkwa na o bụ Ekwensu bụ nna ya.
Ọ sị na njem ya na ịgba afa na-ịrụ ọrụ dịka dibia malitere oge ọ bụ otoroọbịa.
Ọ kọwakwara etu o siri nụọ nwaanyị iri ise na asaa ma mụọ ụmụ agụta agụta.
Onye bụ Eze Ekwensu?
- Eze ekwensu bụ Simon Odo.
- Ọ kpọrọ onwe ya onye ozi ekwensu na-emere ya omerịa n'ofufe ekwensu n'arụsị ya.
- Ọ sị na ọ bụbu onye ụka Katolik, mere ọmụmụ mmiri 'baptism' ma kọnfamashọn ya n'afọ 1958 bụrụkwa 'mass server' n'afọ 1959 ruo 1960.
- Odo sị na ndụ ya gbanwere mgbe o nwere ụkwaranta ọ rịara afọ ise.
- Ọ sịkwa na ahụ ya bidoro rewe mgbe mmadụ kọrọ ya ọgụ, ma gosikwa BBC Igbo ebe ụkwụ ya rere ure.
- Ọ sị na ọ gara Ijebu Ode ebe ọ na-achọ ngwọta ya bụ ahụ ure.
- Eze Ekwensu si na ọ naghị eji ofufe ekwensu egbu mmadu.
- Simon Odo bụ Eze Ekwensu jiri ọnụ ya gwa anyị na ọ nwere nwuye 57, ụmụ karịrị 300 ma nwekwa ụmụụmụ karịrị 170.
- Otu nwaada ya gwara BBC Igbo na Eze Ekwensu anaghị akwụsị ya eje ụka ya.
- Otu n'ime ụmụ ya nwoke si na ndị ọgbọ ya ji maka nna ya na ofufe ya agbara ya ọsọ.
- Ọ sị na ekwenmnsu emeela ya aba ụba.
- Ezeekwensu nwụrụ n'ọnwa Novemba 2021 ka ọ dị afọ 74.
- Ejiri ụgbọala ọhụrụ lie ya dịka o ji wee chọ.
Lee akụkọ ya lee:
Ndi gbara ya ajụjụọnụ bụ Ebere Ekeopara na Nnamdi Agbanelo.



