Chef Mohammed: Etu m si malite isi nri ọdịnala ndị Naịjirịa
Osite a ma ama bụ Mohammed Baydoun bụ nwafọ mba Lebanon akwaala ihe mere jiri hụụ nri ọdịnala ndị Naịjirịa n'anya bụkwanụ nri ndị na-amasị ya isi.
Na mkparịtaụka Mohammed na BBC Igbo nwere, ọ sị na nri Naijiria bụ nri kachasị ụtọ n'ụwa maka na o nwere akụrụngwa ọnatarachi dị icheiche e ji esi ha.
Ọ sị na mmasị ya n'ebe nri Naịjirịa nọ malitere mgbe enyi ya nwoke kpọọ ya gaa n’emume Ọwambe ndị Yoruba a kpọrọ Owambe, bụ ebe o riri osikapa jọlọf nakwa amala, gbegiri na ewedu ndị Yoruba.


Ọ sị na o malitere ime nnyocha maka etu e si esi nri ndị Naịjirịa ma chọpụta ahịa Oyingbo dị na Legos ebe ọ na-azụta ngwa nri ndị a.
Osite Mohammed kwuru na ụfọdụ nri ndị na-esi gụnyere Ofe ọha, osikapa, amala, ofe egusi bụkwanụ nke kachasị amasị ya.
Kirie ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu




