Ọgba Mbọ: Etu m siri hapụ ọrụ oyibo m ma malite ighee Akara n’ụzọ

Aha onyonyo, Etu m siri hapụ ọrụ oyibo m ma malite ighee Akara n’ụzọ

Otu nwaamadị aha ya bụ Godsent Kalu egosila ụwa na ịnwe akaọrụ dị mkpa na mwulite akụnụba mmadụ.

Kalu kọwara na ọ malitere ọrụ ighe akara, ji na ihe ndị ọzọ n’afọ anọ gara aga n’ihi na ọ hụghị ebe o nwereike ịzụta nrị ihe e ghere eghe n’akụkụ ụlọọrụ ya.

Echeche ọhụrụ batara ya n’isi “Aga m amalite ighe akara na ji ka ndị mmadụ nweeike na-eri ya mgbe ọbụla ha chọrọ.”

Kalu kwuru na mgbe ọ nwetere echeche na ya amaghị eghe akara na ihe ndị ọzọ mana ọ natara ọzụzụ site n’akụkụ ịntanetị nke Youtube.

O kwukwara na ọ jụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụ banyere etu e si emepụta ya bụ nri dị iche iche ruo mgbe ọ bịara bụrụ ọkaibe ma mepụta usoro nhazi nri nke ya nke ndị Bekee na-akpọ ‘Recipe’.

Nwaamadị a egosila ụwa na ọrụaka karịrị ibe ya.

Ọ gara n’ihu kọwa na ọ bụ naanị ego N50,000 ka o ji malite ya bụ ọrụ mana ugbua o malitela irite uru nke akụnaụba site n’ime ya.

Kalu kọwara na ndịịche dị n’etiti nhazị nrị nke ya na nke ndị ọzọ bụ etu o si akpakọba ya bụ nrị ọnụ ma egheecha ma hazịe ya n’ọrụ mara mma nke ndị Bekee na-akpọ ‘Packaging’.

O kwuru “Ana m ahazị nrị nke etu a ka ndị nwere agba nweike ịnwe mmasị na ya dịka ndị ụlọakụ, ndị ọkaiwu nakwa ndị ọrụ oyibo ndị ọzọ”

Kirie ihe onyonyo a ka ị gere ihe o kwuru n’uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Adline Okere na Nnamdi Agbanelo.