World cancer day 2023: 'Cancer' ara apụtaghị n'ụwa agwụla, lee etu m si merie ya - Juliet Uzoma
N'ime ọrịa niile e nwere n'ụwa, ọrịa 'cancer' so na nke kacha amapụ ọtụtụ mmadụ obi.
Nke a bụ maka na ụfọdụ na-eche na ya bụ ọrịa enweghị ọgwụgwọ, na onye ọbụla butere ya ga-anwụrịrị.
Mana Juliet Uzoma bụ nwaada Igbo gbasoro ọrịa kansa mgba afọ abụọ, mechaa merie ya.
Ugbua, o mepeela ụlọọrụ nke ọrụ ha bụ inye ndị mmadụ nkuzi, ọ kachasị ụmụnwaanyị, etu ha ga-esi merie ọrịa kansa ara.
Juliet Uzoma sị na ya dị afọ 34 oge a chọpụtara na o nwere kansa n'ara ya.
"Oge a gwara m na m nwere kansa, ọ dị ka ụwa m agwụla," Uzoma kwuru.
"Nnukwu ụjọ tụrụ m, maka na ihe mbụ ga-agbata gị n'obi bụ ọnwụ."
"Onweghị onye ọbụla n'ezinụlọ m rịaburu kansa, amaghịkwanụ m ihe mgbaama na-egosi na mmadụ ebutela ya bụ ọrịa."
Juliet Uzoma kwuru na ihe ka njọ bụ na kansa nke ya eruola ogoogo nke anọ oge a chọpụtara ya.
"Mana ekwere m Chukwu nkwa na ọ bụrụ na m sị na ọrịa a gbakee, aga m eme ka ọ dịrị ndị ọzọ nọ n'ụdị ọnọdụ ahụ mfe," Uzoma kwuru.
Chemotherapy na ọgwụgwụ Uzoma

Juliet mechara malite usoro ọgwụgwọ nke bekee kpọrọ 'chemotherapy'.
Nke a mere ka ntutu ya dapụchaa, mbọ aka ya agbajie oji.
'Chemotherapy' ahụ were afọ abụọ, malite n'abalị asatọ nke ọnwa Ọgọst afọ 2008, ruo abali iri nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2010.
N'ikpeazụ, ndị dọkịta mekwara nnyocha ha ọzọ wee gwa Juliet Uzoma na ọrịa kansa ahapụla ya.
Imezu nkwa ya

Iji mezuo nkwa o kwere Chukwu oge ọ nọ n'ọrịa, Juliet Uzoma malitere ụlọọrụ a kpọrọ 'Encourage to Dare' nakwa 'Juliet You Project.
Ụlọọrụ a na-akụziri ndị mmadụ, ọ kachasị ụmụ nwaanyị, etu ha ga-esi chọpụta n'oge na ha nwere ọrịa kansa.
Ha na-enyekwara ndị nwere ya bụ ọrịa aka ka ha nweta ego ha ga-eji chọọ ọgwụgwọ.
"Chemotherapy' na-eri nnukwu ego, ọ bụghị mmadụ niile na-enwe ego iji kwụọ ụgwọ ya."
'Cancer Day' 2022

Ebe foto si, Union for International Cancer Control's (UICC)
N'afọ 2000, a malitere emume a bụ 'World Cancer Day' Iji gbasaa ozi maka ọrịa kansa, etu o si amalite, nakwa etu mmadụ ga-esi nweta ọgwụgwọ,
A na-eme emume a n'abalị anọ nke ọnwa Febrụarị afọ ọbụla.
Isiokwu emume nke afọ a na bekee bụ 'Close the Care Gap' nke pụtara ime ka enyemaka dịwanye nso maka ndị nwere ọrịa kansa.
Ọrịa kansa na Naịjirịa

Ebe foto si, Project Pink Blue
Na Naịjirịa, a ọnụọgụgụ gosiri na ọrịa kansa na-egbu ihe karịrị mmadụ 72,000 kwa afọ.
Ihe karịrị mmadụ 102,000 ka a na-achọpụtakwa ọrịa a n'ahụ ha kwa afọ na Naịjirịa.
Nnyocha gosikwara na ụdị kansa akacha ahụ na Naịjirịa bụ kansa nke ara nakwa kansa nke 'cervix'.
Ọ bụ ụmụnwaanyị ka ụdị kansa ndị a kacha emetụta.
Ndị mere akụkọ: Chris Sanctus Okereke, Chiemela Mgbeahuru, na Chukwunaeme Obiejesi



