Nwoke ọbụla gbara afọ 40 wee gbagobe, kwesịrị ịga nyochaa Prostate ya

Aha onyonyo, Ngagharí iwe prostate Cancer

Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọtala ọnụ n'okpra square dị n'Enugwu iji mee ngagharị iwe megide ọrịa Prostate Cancer.

Proatate Cancer bụ ajọ ọrịa na-adị n'akpa mamịrị ụmụ nwoke, nke na ọtụtụ mmadụ anwụọla na ya.

Onye chikọbara ngagharị iwe otu "pink blue"ahụ bụ mazị Roncy Chidebe kwuru na ya na ndị otu ya chọrọ ka ụmụ nwoke niile tetanụ ụra, gaa nyochaa onwe ha.