Travis King: Kpọlataranụ m nwa m- Nne onyeagha America gbabara North Korea

Ebe foto si, Reuters/screengrab
Nne, Travis King,onyeagha Amerịka gbabara Nọt Koria ekwuola na ihe kachacha mkpa bụ na nwa ya nwoke lakwute ya.
N'okwu ya mbụ kemgbe akụkọ nwa ya gbara afọ 23 gbara, Claudine Gates kwupụtara obi ya ka o siri metụta ọnọdụ nwa ya na Nọt Koria.
N'ọsịsa ajụjụ ihe ọ ma maka ya bụ okwu a kpụ n'ọnnụ, Gates sara sị,“Enweghị m ihe m nwere ikwu, kpọlataranụ m nwa m.”
“Kpee ekpere ka ọ lata."
N'ụbọchị Tuzde, King gbara afọ 23 gbabara na Nọt Koria site okeala ha na Saut Koria bụ ebe e zigara ya ọrụ dịka onyeagha.
Anyị akpọọla North Korea, ha azaghị anyị- US

Ebe foto si, Reuters
Isiụlọọrụ ndịagha bụ Pentagon ekwuola na ha were ya na Travis King "abaghị ọrụ na-enweghị ezumike na Nọt Korịa dịka ọ gafere okeala oge njem.
Ndịisi agha sị na ha amaghị ka ọnọdụ ya dị maọbụ ebe e jichiri ya.
Gọọmentị Amerịka kwuburu na ha kpọrọ Gọọmentị mba Nọt Koria "n'ụzọ abụla ụzọ" maka Travis King, onyeagha mba ahụ gbabara naz Nọt Koria na nsonso a, mana ha enwetaghị ọsịsa ọbụla.
O doghị anya ma ọ chịsala ọwa dịka onyeagha maọịbụ na o nwere olile anya ịlọhachi.
Obaozi mba Amerịka bụ 'Messenger' kwuru na ozi ndị ime gọọmentị mba Amerika kọwara etu nwa amadi ahụ si gafee okeala.
Ozi ahụ kwuru na King tụrụ mwomwo ọsọ rute n'otu ụlọ dị na Nọt Koria.
A sị na ọ kụsiri aka n'ọnụụzọ ike, mgbe e nweghị onye zara ya, ọ gbaara ọsọ gbachigha n'azụ, banye ụgbọala e ji ebu ihe, e buru ya pụọ ozigbo.
Ndị ọkachamara sị na o nweghị uru nwa amadi ahụ ga-abara ndị Nọt Koria dịka ọ ka bụ obere mmadụ n'ọrụ ndị agha nke nwere ike mee ka Nọt Koria tọhapụ ya n'oge mana o nweghị onye ma kpọkwem ihe nwere ike izute ya na mba ahụ.
Onyeisiagha mba Amerịka bụ Christine Wormuth, kwụpụtara "nnukwu nkụjụ obi" banyere King na etu a ga-esi akpaso ya agwa.
Etu e si jichie onyeagha Amerika gbabara Nọt Koria

Ebe foto si, Reuters
E jichiela onyeagha Amerika na mba Nọt Koria ka o si okeala Saụt Koria banye mba ahụ na anataghị ikike.
E si mba Saụt Koria achọ iji ụgbọelu kpọla King Amerịka maka ịta ya ahụhụ n'ihi ndahie, oge ọ kpapụrụ, banye okeala ndi Nọt Koria.

Ebe foto si, AFP
Nke a na-abịa oge mmekọrịta Nọt Koria na Amerịka nọ n'ọnọdụ ọjọọ nke na Amerịka dọọrọ ụmụamala ha aka na ntị ụkwụ ha atụkwala na Nọt Koria.
Tupu King agbaba Nọt Koria, a nwuchiburu ya maka ịlụ ọgụ na Saụt Koria.
E kwukwara na o mebiri ụgbọala ndị uweojii na Saụt Koria.
O nwebeghị ihe mba Nọt Koria kwuru maka nwa amadi ahụ.

Ebe foto si, EPA
Ndị isi agha mba Amerịka kwuru na a manyeghị ya amanye ma kwukwa na ha na-atụ uche maka ihe o nwere ike izute na mba Nọt Koria.
Ndị mba ọzọ e jichierela na Nọt Koria

Ebe foto si, Reuters
1. Otto Warmbier( 2016): Warmbier bụ nwata akwụkwọ mahadum 'University of virginia oge o so otu ndị mere njem gaa Nọt Koria na Jenụwarị afọ 2016.
Ka ọ gachara ọnwa abụọ ha ji nwuchie ya, ụlọikpe Nọt Korịa tụụ ya mkpọrọ afọ 15 maka ebubo na ọ chọọ izuru akwụkwọ mgbasaozi 'poster'.
Ha tọhapụrụ ya ka ọ gachara ọnwa 17 e ji nwuchie ya, ọ dara nnukwu ahụ ma nwụọ n'ụlọgwụ abalị isii o ji laghachi Amerịka n'ọnwa Juun afọ 2017.

2. Kenneth Bae( 2012): A nwuchiri Bae bụ onye oziọma mba Amerịka n'ọnwa Novemba afọ 2012.
Bae agaala Nọt Koria ugboro ugboro mana na nke a nwụchiri ya n'ihi ebubo na a hụrụ ozi metụtara okpukpere ụka Kraịstị na 'hard drive o ji.
E boro ya ebubo ihibe ọdọ ndị na-emegide gọọmentị mba ahụ, izubata akwụkwọ a machiri n'iwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Nọt Koria.
A tụrụ ya mkpọrọ afọ 15 n'ime ọrụ ike, sị na ha meere ya ebere ghara ị ma ya ikpe ọnwu n'ihi na o kwuru eziokwu .
A tọhapụrụ Bae ka afọ abụọ gachara dịka onyeisi 'National Intelligence' nke mba Amerịka bụ James Clapper mere njem gaa Nọt Koria.
3. Matthew Miller( 2014): Miller bụ onye nkuzi si Carlifonia gbara afọ 24 oge a nwụchiri ya na Nọt Koria maka ebubo inyopu ala mba ahụ oge ọ gara njem n'ọnwa Eprelu afọ 2014.
A tụrụ Matthew Miller mkpọrọ afọ isii n'ime ọrụ ike so ya nke gụnyere igwu ala, ibu okwute na ịsụ ahịhịa.
A tọhapụrụ ya n'ọnwa Septemba afọ 2014.

Ebe foto si, Getty Images
4. Eura Lee na Laura Ling( 2009): Ụmụnwaanyị abụọ bụ ndị ntaakụkọ si California gaa agbata Chaina na Nọt Koria ịga-sete ihe onyonyo banyere ndụ ndị bi na mpaghara ahụ oge a nwuchiri ha n'ọnwa Maachị afọ 2009.
Onye Chaina na edugharị ha nakwa onye ose onyonyo, onye Amerịka so ha gzọtara isi onwe ha gbabaa na mba Chaina.
A tọhapụrụ ha n'ọnwa Septemba otu afọ ahụ dịka, aka chịburu Amerịka bụ Bill Clinton mere njem gaa Nọt Koria.












