Lee uwe eji mara ndị Igbo ha ji aka ha mee na ndị ha bitere ebite

Isi agụ bụ otu n'ime akwa e ji mara ndị Igbo n'ọgbara ọhụrụ a.

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Isi agụ bụ otu n'ime akwa e ji mara ndị Igbo n'ọgbara ọhụrụ a.

Ụfọdụ uwe ndị a ka ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị Igbo nke ndị mgbeochie nyere ya ndị Igbo ọgbara ọhụrụ.

Kama ndị ọkaibe n’ihe mere eme maka ndị Igbo ekwetechaghị.

BBC Igbo kpọtụrụ ọkammụta n’ihe gbasara omenala ndị Igbo bụ Chigozie Nnabuihe ka ọ tinyere anyị ọnụ na ya bụ okwu.

Nnabuihe kwuru na enweghị onye ma mgbe ndị Igbo jiri mara na ha gbaa ọtọ.

Kama ọ kpọpụtara ụfọdụ ngwa ndị Igbo na-eji na mgbe ochie.

Ndị yi uwe eji mara ndị Igbo
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Akwa Aji

Etu Akwa Jute

Ebe foto si, Screengrab

Nnabuihe kwuru sị, “Aji bụ na mkpụrụ osisi nwere uru nke ukwu ka eji eme akwa Aji. E nweta ya bụ osisi, etinye ya na mmiri, o ruruo e were osisi sara mbara na osisi ọzọ dọtịwa ya. A na-akụ ya a na-adọtị ya tutu ruo mgbe ọ ga aga ukwu okirikiri”.

O kwuru na ya bụ akwa yiri ogbo nke bụ 'sponge' n’okwu Bekee.

O gara n'ihu kọwa “ Ọ bụ akwa a mere ndị Igbo jị atụ ilu a nke kwuru na, ‘Atụsịwa aji, onye ma ajị agbara ọtọ’".

Nnabuihe kọwara na e mechaa usoro nhazi na mmepụta akwa a, na ọ na-adị ka ihe a na-akpọ ‘Jute Bag’ ugbua.

Akwa Ọgọlọgọlọ

Nnabuihe kwuru na nke abụọ bụ nke a na-eji ọmụ ngwọ eme a na-akpọ Abadaaba.

O kwuru sị, “Eweta ọmụ ngwọ, a ga-eji ya akpa ihe a na-akpọ Abadaaba, nke fọrọ ewere ya mme okpu achakara dịka nke ndị ọchiehi na-eji”.

Ọ kọwara na ya bụ akwa na-adị ka ihe a na-akpọ ‘Towel’ in olu Bekee ugbua.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ na-esi ike ịmepụta nke ga-aga ukwu mmadụ gburugburu, ya mere a na-eji ya asa ahụ ma na-ekpuchi ọtọ.

Nnabuihe kwuru sị, “A na-eji ya ekpuchi utu maọbụ ọtụ nwaanyị, kama ị nwereike ịhụ otele ya. Ọ bụ ya mere eji akpọ ya Ọgọlọgọlọ”.

Akwa Akwete

Akwa Akwete

Nnabuihe kwuru na mpaghara Obeledu dị n’Anambra bidoro ịmepụta akwa ha na-eyi na mpaghara nke ha.

O kwuru sị, “Kama ndị a na-akpọ ndị Akwete bidoro mmepụta akwa nke ha mara mma nke eji eme ọnụ ruo ma taa”

Nnabuihe kwuru na ọ bụ naanị n’Akwaete ka ana-eme ya, ma enweghị ebe ọzọ a na-eme ya na-abụghị n’Akwete.

Ọ kọwakwara na ụmụ agbaọhọ Igbo n'oge ochie na-eji jigida ekpuchi ọtọ ha.

Akwa ‘George’

Maka Akwa ‘George’ Nnabuihe kwuru sị, “Ọ bụ n’afọ 1910 ka e wetara akwa a mara mma n’ahịa ndị Igbo. Ya bụ akwa mara mma nke ukwu mere ha jiri kwuo na ọ bụ Eze Nwoke na-achị mba Briten bụ King George IV ka akwa ahụ kwesịịrị mere ha jiiri kpọọ ya bụ akwa George”.

Ọ kọwara na ndị Igbo ebidola ịnwe mmekọ ha na ndị mba ndị ọzọ ma sị na ọ bụ otu n’ime mba ndị ahụ webatara ya.

Akwa Isi Agu

Akwa Isiagụ

Nnabuihe kọwara na akwa Isiagụ bụ ihe ejiji ọgbara ọhụrụ.

O kwuru sị, “ Tupu alụọ agha Biafra, enweghị ihe dịka Akwa Isi agụ”.

Ọ bụ ndị mmadụ kwuru ka ebiere ha isiagụ n'akwa nke mere o jiri wuwe.

Okpu ọdụ Agụ

Okpu Agoro

Nnabuihe kwuru na okpu ọdụ Agụ bụ ndị Igbo mere ya.

Ọ kwuru sị, “ Ọ bụ mba ndị na-akpa ike dịka Ohafia, Arochukwu, Abiriba. Item na ndị ọzọ bụ ndị bidoro ị na-eyi okpu agụ dịka okpu eji mara dike”.

Okpu mmemme

Kenneth Okonkwo yi okpu Mmemme

Ebe foto si, Screengrab

Nnabuihe kwuru na ndị niile nwere ụdịrị okpu a ha na-ekpu kama ọ dị n’iche n’iche.

Ọ gara n'ihu kwuo, “Ị lee anya ndị mpaghara ugwu nwere etu esi e mere ha nke ha, Ị lee anya nke ha ga-adị iche na nke ndị Igbo”.