Etu akwa 'Isi Agụ' si bụrụ nnukwu njirimara ndị Igbo

Nnamdi

Ebe foto si, Getty Image

Nkọwa foto, Ndí uweojii nzuzo DSS ekweghí na Nnamdi kanu ga-eyi akwa isi agụ bịa n'ụlọikpe n'ọdị nso a

Okwu gbasara akwa 'Isi Agụ' bọlitere elu n'ọdị nso dịka ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa jụrụ ajụ na Nnamdi Kanu agaghị eyi ya bụ uwe bịa ụlọikpe.

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe ndị Igbo kacha biri.

Gọọmentị Naịjirịa na-ekpe Kanu ikpe ugbua dịka ha boro ya ebubo ịkpa nkata ikewa Naịjirịa nakwa iyi ndụ egwu.

Odoghị anya kpọmkwem ihe kpatara ndị DSS jị jụ na Kanu agaghị eyi uwe isi agụ, mana ihe doro anya bụ na uwe isi agụ bụ otu ọkpụrụkpụ njirimara ndị Igbo.

Ebe ọbụla a hụrụ onye yi isi agụ, ma na Naịjirịa maọbụ na mba ọzọ, ọdịghị mkpa mmadụ ịgwa gị na onye yi ya bụ onye Igbo, maọbụ na onye ahụ na-achọ igosi na ihe ndị Igbo na-adị ya mma.

Mana ebe ọ bụ na uwe 'Isi Agụ' abụghị n'ala Igbo ka a na-emepụta ya, kedụzị etu o si bụrụ nnukwu njirimara ndị Igbo?

Ihe mere Isi Agu ji bụrụ akwa ndị Igbo na-akwanyere ugwu

Agụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'omenala Igbo, Agu bụ eze ụmụ anụmanụ.

Agụ bụ anụmanụ kacha nwee nkwanye ugwu dịka omenala Igbo si dị.

Nke a bụ maka na Agu bụ anụmanụ siri ike, ọ bụghị anụmanụ onye ọbụla nwere ike ịga nwụrụ n'aka.

Nke a mere ndị Igbo ji ekwu okwu sị na "ebube Agu na-eche Agụ".

El-Rufai na Buhari yi akwa isi agu

Ebe foto si, Presidency/Nasir El-Rufai

Nkọwa foto, Mgbe ụfọdụ ndị abụghị ndị Igbo na-eyi uwe Isi Agụ iji gosi na ihe ndị Igbo na-adị ha mma

A bịa n'otu ndị dinta, ọ bụ naanị onye gburula agụ n'ịchụ nta ka a na-akpọ 'Ogbu Agu'.

Dịka Ikechukwu Umeonyirioha si kọọrọ BBC Igbo, "'Ogbu Agụ' bụ echichi na-egosi na mmadụ bụ dike, na onye ahụ abụghị onye ụjọ.

"Onye a kpọrọ 'Ogbu Agu' na-enwe nkwanye ugwu pụrụ iche n'etiti ụmụnna ya nakwa n'obodo niile."

Aha onyonyo, Etu m si eji uli Igbo emepụta akwa ọgbaraọhụrụ bụ sọ mma

Ikechukwu Umeonyirioha bụ ọkaibe n'asụsụ nakwa omenala Igbo, ọ nọ ugbua na Mahadum Oxford nke mba United Kingdom, ebe ọ na-akuzi asụsụ Igbo.

Ọ kọwara na n'oge gboo, "ndị chiri ogbuagu na-eyi akwa pụrụ iche nke e sere isi agụ na ya iji gosi ike ha kpara.

"Ọ bụ otu a ka uwe e sere isi agụ si bụrụ ihe nkwanye ugwu n'ala Igbo," Umeonyirioha kwuru.

Kama ọ kọwakwara na uwe nke ndị gboo yiri abụghị ụdị nke a ndị Igbo na-eyi taa.

Ebuka Obi Uchendu, Dave Umahi

Ebe foto si, Getty Images

Otu ihe ahụ kwa ka ndị nchọcha aha ha bụ Margaret Ajiginni, Antonia Okogwu, na Chile Oparaocha chọpụtara n'akwụkwọ nchọcha nke ha mere n'afọ 2020.

Ha dere sị: "Isi agụ bụ onyinye a na-enye ndị dike ndị garala agha ma turu ugo lọta; nke a bụ iji gosi nkwanye ugwu ndị Igbo na-akwanyere anụmanụ a bụ agụ."

Dịka oge na-aga, a malitere itinye onyonyo Odum n'akwa kama nke Agu, n'ihi na ndị Igbo kwenyere na Odum na-egbu Agu.

N'edemede nke James Eze dere gbasara Isi Agu n'afọ 2016, ọ kọrọ akụkọ ihe Eze Chukwuemeka Eri sara ya gbasara etu Agụ si bụrụ anụ ndị Igbo na-akwanyere Ugwu.

Chukwuemeka Eri bụ eze ọdịnala obodo Eri, bụ ebe ọtụtụ kwenyere na ndị Igbo si pulite.

O kwuru sị: Agụ bụ anụ siri ike, ọ naghị atụ anụ ọzọ egwu, otu a ka ndị Igbo dị."

"Ọ bụghị na mberede ka Agụ ji bụrụ anụmanụ e ji mara ndị Igbo, ihe niile e ji mara Agụ bụkwa ihe e ji mara Igbo."

Onye nwere ike iyi akwa 'Isi Agụ'

Ụmụakwụkwọ yi isi agụ

Ebe foto si, Bubendorff MG Sch Adazi - Nnukwu

Nkọwa foto, N'ọdị nso a, otu ụlọakwụkwọ n'Anambra steeti ji ya kwaara ụmụakwụkwọ aha akwa akwụkwọ.

N'oge gboo, ọ bụ naanị ndị chiri chichi 'Ogbu Agu' nwere ike iyi uwe ahụ pụrụ iche esere isi agụ na ya.

Mana dịka oge na-aga, akwa isi agụ bịaziri bụrụ akwa e ji ama nwoke Igbo ọbụla tozuru etozu.

Onye ọbụla ị hụrụ yi uwe isi agụ, ihe ọ na-ekwu bụ "ihere anaghị eme m ikwupụta na a bụ m onye Igbo".

Ikejiofor Ella na di ya ji akwa Isi Agu uwe agbamakwụkwọ ha

Ebe foto si, @IKEJIOFOR ELLA AMY

Nkọwa foto, Ikejiofor Ella na di ya ji akwa Isi Agu uwe agbamakwụkwọ ha

Ka ọ dị ugbua, ụmụnwaanyị na-ejizikwa uwe isi agụ akwa ụdị akwa dị icheiche.

N'oge mbụ, a na-ekwu na nwaanyị anaghị eyi isi agụ, mana ihe ndị a agbanwechaala.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị ejirila uwe isi agụ kwaa akwa agbamakwụkwọ ha.

Ebee ka a na-emepụta uwe Isiagụ?

Ịkpa akwa Akwete
Nkọwa foto, Akwete bụkwa ụd akwa ọzọ e ji mara ndị Igo. A na-arụpụta ya n'obodo Akwete n'Abia steeti

Akwa 'Isi Agụ' nwere ụdị dị icheiche, mana o nweghị ụdị nke a na-emepụta n'ala Igbo.

Ha ncha bụ mba ofesi ka ndị na-atụ mgbere akwa na-esi ebubata ha.

Dịka Onyeka Nwelue si gwa BBC Igbo, ọ bụ na mba Turkey ka e si ebubatakarị akwa Isi Agụ.

Ọkammụta Nwelue bụ ode akwụkwọ nakwa onye nchọcha na ngalaba mmụta akụkọ ntọnala ndị nke bekee na-akpọ 'anthropology'.

Ụfọdụ akwa Isi Agụ na-esikwa na mba India abata.

Akwa ndị ọzọ e ji mara ndị Igbo

Ụfọdụ akwa ndị ọzọ e ji mara ndị Igbo gụnyere:

  • Akwaete - nke a na-emepụta n'obodo Akwete n'Abia steeti
  • Akwa ọcha - nke e ji mara ndị Igbo na mpaghara Aniọma, Ọnịcha, na ndị ọzọ bi nso n'osimiri Naịja
  • Ukwu akwa abụọ - e ji ya amata ụmụnwaanyị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ