Etu agha ọnwa iri na ise siri gbanwee ndụ ndị bi na Gaza n'ike

Etu agha ọnwa iri na ise siri gbanwee ndụ ndị bi na Gaza n’ike
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

E nweela nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza mana agha malitere kemgbe ọnwa iri na ise (15) gara aga enweela mmetụta ọjọọ n'okeala Palestine dị n'akụkụ mmiri.

Izrel malitere ịtụ ogbunigwe na ime mwakpo iji zaghachi mwakpo na-enweghị ihe kpatara ya ndị otu Hamas mere n'abalị 7 Ọktoba 2023, bụ nke jiri gbuo ihe ruru mmadụ otu puku na narị abụọ (1,200) ma jichie mmadụ narị abụọ na iri ise na otu (251).

Izrel sịrị na ha na-agba mbọ ibibi ikikere ndịagha na nke ndị ọchịchị otu ndị Alakụba ahụ, bụ ndị wepụtara onwe ha ibibi Izrel. Ha na-elekọta Gaza kemgbe afọ 2007 mana egbuola ihe karịrị ndị Palestine puku iri anọ na isii na narị isii (46,600) dịka mịnịstrị na-ahụ maka ahụike nke Hamas na-elekọta siri kwuo.

Ndị Gaza nwere olileanya na nkwụsị ikwa mgbọ nke ugbua ga-eweta udo, mana otu mbaụwa bụ United Nations na-adọ aka na ntị na o nwereike iwe ọtụtụ afọ tupu mpaghara ahụ enweta onwe ha nke ọma. Ihe ngosi a na-arụtụ aka etu ndụ siri gbanwee n'ike oge ahụ a lụrụ agha.

Etu mbibi siri fesaa

Mwakpo Izrel lekwasaburu anya na mpaghara ugwu Gaza, bụ ebe ha kwuru na ndịagha Hamas gara zoo onwe ha n'etiti ụmụ mmadụ nkịtị.

Obodo Beit Hanoun dị na mpaghara ugwu, naanị kilomita abụọ (maịlị 1.2) site n'okeala bụ otu n'ime mpaghara Izrel buuru ụzọ busoo agha. O nwetara ezigbo mbibi.

Obodo Beit Hanoun dị na mpaghara ugwu, naanị kilomita abụọ (maịlị 1.2) site n’okeala bụ otu n’ime mpaghara Izrel buuru ụzọ busoo agha. O nwetara ezigbo mbibi.

Izrel gara n'ihu ịtụ ogbunigwe n'obodo Gaza nakwa mpaghara ndị ọzọ mepere emepe na mpaghara ugwu ma nye iwu ka ụmụ mmadụ nkịtị kwagaa na mpaghara ndịda osimiri Wadi Gaza maka "nchekwa na mkpuchite" tupu ha amalite ime mwakpo n'uju na ngwụcha ọnwa Ọktoba.

Mana Izrel sitekwara n'elu kwaa mgbọ n'obodo ndị nọ na mpaghara ndịda bụ ebe ọtụtụ ndị Gaza sitere mpaghara ugwu na-agbaga. Na ngwụcha ọnwa Nọvemba, ụfọdụ akụkụ mpaghara ndịda tọgbọrọ n'efu dịkwa ka ụfọdụ akụkụ mpaghara ugwu.

Obodo Beit Hanoun dị na mpaghara ugwu, naanị kilomita abụọ (maịlị 1.2) site n’okeala bụ otu n’ime mpaghara Izrel buuru ụzọ busoo agha. O nwetara ezigbo mbibi.

Izrel mụbara ogbunigwe ọ na-atụ na mpaghara ndịda nakwa etiti Gaza na mmalite ọnwa Disemba tupu ọ malite ịkwa mgbọ aghara aghara na Khan Younis bụ nke bibiri ọkara ụlọ dị na Gaza n'ọnwa Jenụwarị.

Izrel mụbara ogbunigwe ọ na-atụ na mpaghara ndịda nakwa etiti Gaza na mmalite ọnwa Disemba tupu ọ malite ịkwa mgbọ aghara aghara na Khan Younis bụ nke bibiri ọkara ụlọ dị na Gaza n’ọnwa Jenụwarị.

Ọgbaaghara ahụ malitere kemgbe ọnwa iri na ise (15) ebibiela ihe ruru ụlọ 60% gburugburu Gaza dịka ebe ọ kachasị njọ bụ n'obodo Gaza City dịka ndị ọkachamara si n'ụlọorụ CUNY Graduate Centre na Oregon State University siri kwuo.

Ọgbaaghara ahụ malitere kemgbe ọnwa iri na ise (15) ebibiela ihe ruru ụlọ 60% gburugburu Gaza

UN kwuru na ọnụọgụ ụlọ ndị a lara n'iyi gụnyere ihe karịri 90% nke ụlọ ndị e nwere na Gaza dịka e bibiri otu narị puku na iri isii (160,000) ma metụtakwaụlọ ndị ọzọ ruru narị puku abụọ na iri asaa na isii (276,000).

Oge niile ahụ a na-alụ agha, Hamas bụ ndị Izrel, UK na ọtụtụ mba ndị ọzọ kpọrọ otu oyi ọha egwu na ndị otu ha lụsoro ndịagha Izrel ọgụ. Ha anọrọkwala na-atụ Izrel ọtụtụ ogbunigwe rọket.

E kepụtala obodo juputara n'ụlọ nchereoge

Obibi ndụ tupu agha amalite bụ nke tara akpụ na Gaza. Ọ bụrula ihe na-ebute mgbochi n'etiti Izrel na Ijipt ma belatakwa ndị na ihe nwereike ịbanye maọbụ pụọ, bụkwanụ nke mba abụọ ahụ kwuru na ha chọrọ maka nchekwa.

Ọ bụ eziokwu na ihe ruru ọkara abụọ n'ime atọ nke ọnụọgụ mmadụ bi ebe ahụ bụ ụmụ ogbenye dịka World Bank siri kwuo, ebe puku kwuru puku ndị ọzọ bi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ UN, o nwekwara ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ụlọahịa.

Mana Gaza nke dị naanị kilomita iri anọ na otu (maịlị 25) n'ogologo ma bụrụkwa nke osimiri Mediterranean Sea gbara ogige ma nweekwa okeala ya na Ijipt, bụ nke ọtụtụ mpaghara tọgbọro n'efu.

Obibi ndụ tupu agha amalite bụ nke tara akpụ na Gaza

Ebe foto si, Getty Images

E bibiela mpaghara niile ruo n'ala. Alaubi ebe e hibere ugbo n'oge mbụ a bụrụla nke ụgbọala ndịagha Izrel gbariri.

Tupu agha amalite, ọtụtụ mmadụ n'ime nde abụọ na ụma abụọ nọ na Gaza bi n'obodo anọ a ma ama gụnyere Rafah na Khan Younis dị na mpaghara ndịda, Deir al-Balah dị n'etiti na Gaza City nke mmadụ narị puku asaa na iri asaa na ise (775,000) bi n'ime ya mana achụpụla mmadụ niile ahụ ugbua.

E bibiela mpaghara niile ruo n’ala. Alaubi ebe e hibere ugbo n’oge mbụ a bụrụla nke ụgbọala ndịagha Izrel gbariri

E kposaala ezinaụlọ dị iche iche ọtụtụ oge dịka Izrel gbanwere ebe nlekwasa anya, na mbụ ka ha gwara ndị bi na mpaghara ugwu ka ha kwagaa na ndịda osimiri Wadi Gaza, bụ nke kewara ogbe ahụ ụzọ abụọ ma mechaa kwuputa ọgbara ogige ndị na-agba ọsọ na mpaghara ndịda.

E kposaala ezinaụlọ dị iche iche ọtụtụ oge dịka Izrel gbanwere ebe nlekwasa anya

Onyonyoo satlaịt na-egosi obosara ala arụnyere ụlọ nchereoge maka ndị gbara ọsọ ndụ na al-Mawasi n'ọnwa Ọktoba afọ 2023.

Izrel mụbara mpaghara ahụ n'ọnwa Mee iji gụnye mpaghara Khan Younis na Deir al-Balah dịka ha malitechara mwakpo dara ụda na Rafah bụ ebe ihe karịri otu nde mmadụ nọ na-eze ndụ.

Mana ọ gaala n'ihu na-ebelata kemgbe ahụ dịka Izrel lekwasara anya na mpaghara ndị kwuru Hamas na-akpa ike ma na-emekwa mwakpo.

N'Ọgọst, UN kwuru na ihe karịrị mmadụ otu nde na ụma abụọ (1.2m) na-eze ndụ na al-Mawasi, bụ mpaghara enweghị akụrụngwa ndị dị oke mkpa.

Fachi fachi mmadụ abụrụla otu ihe na-emetụta ndị gbara ọsọ ndụ n'ogige ndị UN wepụtara na mpaghara etiti nakwa ndịda Gaza.

Ụzọ ihe oriri

Ihe ruru mmadụ otu nde na ụma asatọ (1.8m) na-agabiga ụkọ ihe oriri n'ebe ọ dị ukwuu, tinyekwara ihe fọdụrụ ntakịrị ka o ruo mmadụ otu narị puku na iri atọ na atọ ndị na-agabiga ụkọ ihe oriri n'ebe ọ dị ukwuu dịka ụlọorụ Integrated Food Security Phase Classification (IPC) siri kwuo.

Onyonyoo satlaịt na-egosi obosara ala arụnyere ụlọ nchereoge maka ndị gbara ọsọ ndụ na al-Mawasi n’ọnwa Ọktoba afọ 2023.

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nchọcha ha na-eme malite na Septemba afọ 2024 ruo n'Ọgọst afọ 2025 dọrọ aka na ntị na ogogo erijughị nri afọ arịala elu ugboro iri karịa tupu agha amalite.

Ọ bụnadị tupu agha nke ugbua amalite, ihe ruru 80% ndị bi na Gaza chọsiri enyemaaka ike.

A kwụsịrị ibubata ngwa enyemaka ruo mkpụrụ ụbọchị iri oge Izrel na Ijipt mechiri okporoụzọ ha mana ha amalitela n'ogogo nta dịka ihe ruru gwongworo iri ise (50) bu ngwa enyemaka na-abanye Gaza kwa ụbọchị n'ọnwa Jenụwarị, dịka UN siri kwuo.

Izrel na-ekwu na nke a abụghị eziokwu mana ihe ndekọ nke onwe ha na-egosi na gwongworo otu narị na iri anọ (140) bụ ihe na-abata kwa ụbọchị n'ọnwa Jenụwarị dịka ọnụọgụ kachasị bụ n'ọnwa Eprel mgbe narị abụọ na iri abụọ na isii (226) batara n'ime otu ụbọchị.

N'ọnwa Maachị, ụlọọrụ World Food Programme kwuru na izute nsogbu ihe oriri ga-abụ ịtụbata opekatampe gwongworo narị atọ (300) na Gaza ma kesaa ihe oriri, nke bụ ọnụọgụ a na-erubeghị kemgbe agha jiri malite.

Nchọcha ha na-eme malite na Septemba afọ 2024 ruo n'Ọgọst afọ 2025 dọrọ aka na ntị na ogogo erijughị nri afọ arịala elu ugboro iri karịa tupu agha amalite

Ndị ọrụ UN kwuru na ọ bụ mmachi ndịagha Izrel machiri ibubata ngwa enyemaaka, mbuso agha nakwa mbibi iwu na usoro e si eme ihe mere ọnọdụ ahụ ji dịrị.

Izrel kwusiri ike na enweghị mgbochi maka ogogo ngwa enyemaka kwesịrị ịbata Gaza ma taa ngalaba UN ụta maka ịda mba ikesa ngwa enyemaaka. Ha bokwara Hamas ebubo izu ohi ngwa enyemaaka bụkwanụ nke ha gọrọ aka na ụkwụ ha.

Ụbịam na-arị elu

Ọgbaaghara ahụ enweela mmetụta ọjọọ n'ọnọdụ akụnaụba Gaza bụ nke ụlọakụ World Bank kwuru na o jiiri 86% belata n'ọkara mbụ nke afọ 2024.

O kwuru na ihe ruru 100% nke ọnụọgụ mmadụ niile bi ebe ahụ abụrụla ndị ogbenye ọ bụrụ ma a tụnyere ya 64% ọ bụbu tupu agha amalite ebe ọnụahịa ihe ndị e ji enyere ndụ aka gbagoro ruo 250%.

Ọgbaaghara ahụ enweela mmetụta ọjọọ n'ọnọdụ akụnaụba Gaza bụ nke ụlọakụ World Bank kwuru na o jiiri 86% belata n'ọkara mbụ nke afọ 2024

Ngalaba UN na-ahụ maka azụmaahịa na mmepe bụ UNCTAD kwuru na ọnụego mbibi agha ahụ wetara ruru $18.5bn.

Ha dọrọ aka na ntị n'ọnwa Ọktoba na ọ bụrụgodu na e nwee nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ, na ọ ga-ewe afọ narị atọ na iri ise (350) iji wulite ọnọdụ akụnaụba Gaza ruo ogogo ọ nọ n'afọ 2022 ewezuga ma ọ ga-etolite ngwangwa karịa etu ọ dịbu n'usoro e tinyere kemgbe afọ 2007.

Ọtụtụ ụlọọrụ ahụike anaghịzi arụ ọrụ n'ihi mbibi maọbụ n'ihi enwetaghị mmanụ ụgbọala.

Ndịagha Izrel awakpookwala ọtụtụ ụlọogwụ dịka ndịagha na-ebo ebubo na ndị Hamas jiiri ha mezuo ebumnobi ndịagha. Hamas na ndị isi ụlọogwụ agọọla agụgọ gbasara nke a.

Ụlọọgwụ al-Shifa dị na Gaza City tọgbọọrọ n'efu, ọ bụ eziokwu na emepeghachila ngalaba ya na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata.

Ụlọọgwụ al-Shifa dị na Gaza City tọgbọọrọ n'efu, ọ bụ eziokwu na emepeghachila ngalaba ya na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọorụ World HealthnOrganization (WHO) kwuru na ọ bụ naanị ụlọọgwụ iri na asatọ (18) n'ime ụlọọgwụ iri atọ na isii (36) dị na Gaza na-arụtụ ọrụ dịka ụlọọgwụ iri na otu bụ ndị a kọwara dịka ndị na-arụtụ ọrụ maọbụ ndị na-arụ ọrụ n'uju.

Nlọghachite dị anya

E wezuga ọnụọgụ mmadụ, atụmatụ UN Environmental Programme (UNEP) adọọla aka na ntị na ọ ga-ewe ogologo oge ịrụzigharị Gaza.

Ha kọwara mmiri na usoro adịmọcha dịka "nke fọro obere ka ọ ghasaa", dọọ aka na ntị megide ikpofu ureghure gburugburu ogige ndị gbara ọsọ ndụ.

Ha kwuputakwara ihe karịrị tọọnụ nde iri ise (50m) nke mkpọmkpọ ihe mbibi ahụ wetara.

E wezuga ọnụọgụ mmadụ, atụmatụ UN Environmental Programme (UNEP) adọọla aka na ntị na ọ ga-ewe ogologo oge ịrụzigharị Gaza

UNEP kwuru na o nwereike iwe afọ iri abụọ na otu (21) naanị iji kpochapụ mkpọmkpọ ihe ahụ nakwa ogbunigwe a gbafọrọ n'oge agha.

UNEP kwuru na o nwereike iwe afọ iri abụọ na otu (21) naanị iji kpochapụ mkpọmkpọ ihe ahụ nakwa ogbunigwe a gbafọrọ n’oge agha.