Agha Izrel na Gaza: Ajụjụ a na-achọ ọsịsa ya gbasara nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ

Ebe foto si, Anadolu / Getty Images
Mba Izrel na ndịagha na-enyi ọha egwu bụ Hamas enweela nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ. Cheta na ha abụọ na-alụ agha kamgbe ọnwa iri na ise.
Praịm mịnịsta mba Qatar bụ Sheikh Mohammed bin Abdul Rahman Al Thani kwuru na mba Izrel na ndị Hamas ga-akwụsị ịkwa mgbọ n'ụbọchị Sọnde ma ọ bụrụ na gọọmentị mba Izrel binye aka na nkwekọrịta ahụ ha nwere.
Agha ahụ bidoro n'ọnwa ọktoba 7, 2023 oge ndị Hamas wakporo mba Izrel gbuo ndị mmadụ ma tọọrọ ndị ọzọ.
Mana ọ gafeela ọtụtụ ọnwa kamgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwuru na ya ga-akwụsị agha ahụ ma mee ka ndị ọrụ gbatagbata nwee ohere inyere ndị Palestine bụ ndị nkịtị aka.

Ebe foto si, Mohammed Saber / EPA
Ndị Hamas chọrọ ka agha ahụ kwụsị kpamkpam tupu ha atọhapụ ndị ha tọọrọ na mba Izrel mana nke ahụ bụ ihe mba Izrel na-achọghị.
Nkwekọrịta ahụ ka a mabeghị ma ọ ga-eme ka agha Izrel na Hamas kwụsị kpamkpam.
Mana otu ihe mba Izrel chọrọ iji agha ahụ mee bụ ka a ghara inwe ihe dịka ndịagha Hamas ọzọ na mpaghara Gaza.
Na-agbanyeghị na mba Izrel emebiela ọtụtụ ngwa agha ndị Hamas mana Hamas ka nwereike ijikọta onwe ha ọnụ ma na-achị mpaghara ahụ.
Ịtọhapụ ndị a tọọrọ na ndị nga

Ebe foto si, EPA
Ugbua amaghị na ndị ahụ Hamas tọọrọ adị ndụ ma ha awụrụanwụ maka na ọ dị ka ndị Hamas amaghị ebe ha niile nọ.
Ndị Hamas na-achọ ka Izrel tọhapụ ndị otu ha Izrel tinyere na nga mana Izrel ekweghị.

Ebe foto si, Bashar Taleb / AFP / Getty Images
ịkwụsị Ịkwa mgbọ n'etiti ndị agha Izrel na Hamas bụ naanị obere ihe nwereike ịkposa.
Udiri nkwekọrịta ahụ dịka nke ha were n'oge garaaga mechara bịa n'isi njedebe.
Kedụ ka ịkwụsị Ịkwa mgbọ ahụ ga-esi guzoro?

Ebe foto si, Mahmoud Issa / Reuters
A na-atụ anya na ịkwụsị Ịkwa mgbọ ahụ nwere usoro atọ ọ ga-eji mee ya.
Izrel na Hamas ekwetala usoro atọ ahụ mana ndị na-ahụ maka nkwa mba Izrel ka ga-enwe ntụlịaka maka ya.
Usoro mbụ: ịtọghapụ ndị a tọọrọ na ndị nọ na nga
Ọnụ na-ekwuru gọọmenti mba Izrel bụ David Mencer kwuru na ndị fọrọ na ndị Hamas tọọrọ ruru mmadụ 33. Ọ sị na ha gunyere ụmụnwanyị, ụmụnwanyị ndịagha, ụmụaka, ndị okenye na ndị meruru ahụ nd'ime ha.
Mana a maghị mmadụ ole n'ime ha ka dị ndụ ugbua.
Otu onyeisi na gọọmenti ndị Palestine kwuru na ha ga-atọhapụ ndị Izrel mmadụ atọ mana ndị ọzọ fọrọ bụ ndị ha ga-atọhapụ n'ime izu ụka isii.

Ọ bụ n'oge a ka ndị agha Izrel ga-eji nwanyọ nwanyọ si na mpaghara Gaza pụọ ma mee ka ndị mmadụ alọhachịta na mpaghara saụt Gaza.
Mmadụ ruru nde 2.3 si na ụlọ ha gbaa ọsọ agha mgbe mba Izrel bidoro na-atụ ogbunigwe ebe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Praịm mịnịsta mba Qatar bụ Sheikh Mohammed Bin Abdulrahman al-Thani kwuru na a ga-amalita imezi ụlọọgwụ ndị mebiri mgba a na-anụ agha ma mee.
O kwuru na ya nwere olilaanya na Izrel na Hamas ga-ekweta kwụsị agha.
Onye ọnụ na-eru n'okwu na Palestine kwuru na ha na Izrel ga-amalita nkata gbasara usoro ịkwụsị agha ahụ nke abụọ na usoro nke atọ na o ruo abalị iri na isii ha kwụsịrị agha.
Mana oge ndịagha mba Izrel ga ahapụ oke ala Philadelphi n'akụkụ Ijipt bụ ihe e nwebeghị nkwekọrịta gbasara ya.

Ebe foto si, Reuters
Usoro nke abụọ: Ịtọhapụ ọtụtụ ndị mmadụ
Praịm mịnịsta mba Qatar bụ Sheikh Mohammed Bin Abdulrahman al-Thani kọwara ihe gbasara usoro ịkwụsị Ịkwa mgbọ nke abụọ na usoro nke atọ.
Dịka Onyeisiala mba Amerika bụ Joe Biden si kwuo na usoro nke abụọ gunyere "ịkwụsị agha ahụ kpamkpam".
Mana ọ bụrụ na nkata dị n'etiti mba Izrel, Hamas na ndị ọzọ gbuo oge gbanye n'izuụka isii na Izrel na Hamas ka ga-akwụsị ịkwa mgbọ.

Ebe foto si, Reuters
Ndị Izrel na Palestinian ga-atọhapụ ndị ha ji ma nwoke ma ndịagaha ma gbanwee ndị nga ha ji.
Izrel ekwetala ịtọghapụ ndị Palestine ruru otu puku na-kwa ịwepu ndịagha Izrel nọ na Gaza.
Usoro nke atọ: ịrụharị ụlọ e mebiri na Gaza
Usoro nke atọ bụ ịrụharị ihe niile mebiri na Gaza bụ ihe ga-enwe ọtụtụ afọ ime ya.
Joe Biden kwuru na ọ bụ n'usoro nke atọ a bụ mgbe ndị amaala Palestine wereike ịlọhachị n'ụlọ ha na mpaghara Gaza niile.
A ga-agabnwe ma tọhapụ ndị niile nọ na nga maọbụ ndị a tọọrọ nwụrụ anwụ.
Ọ bụ Trump ka a ga-enye ụkpa ekele maka ụkwụsị ịkwa mgbọ a?

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala meriri ntụlịaka n'Amerika bụ Trump ji akara soshal mịdịa ya sị na "nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n'etiti Hamas na Izrel were isi maka na ya meriri na ntuliaka n'ọnwa Nọvemba 2024"
Mgbe a juru Praịm mịnịsta mba Qatar na ọ bụ eziokwu na ọ bụ Trump mere Izrel na Hamas ji nwee nkwekọrịta ahụ, ọsịsa ya bụ na "anyị hụrụ na mba Amerịka bidoro nwee atụmatụ ka agha ahụ kwụsị nsonso a'.
Ọ sị na ha hụrụ na mba Amerika bidoro na-egosi na ha chọrọ ka agha ahụ kwụsị ma mee ya ka ọ doo anya.
Kedụ ka a ga-esi me ka nkwekọrịta ahụ guzoro?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị kabịnet na mba Izrel ka ga-atụ vootu banyere ya tupuu ọ bido.
Anyị na-atụ anya na ndị mịnịsta dị icheiche n'Izrel ga-akwado ya n'agbanyeghi na ọtụ achọghị ya.
Kedụ ndị ga-naachị Gaza?

Ebe foto si, Reuters
Kedụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-naachị Gaza ma agha kwụsị bụ otu ihe e nwebeghị ọsịsa ya.
Praịm Palestine bụ Mohammad Musta kwuru na ọ bụ gọọmenti ya ga-naachị Gaza.
Mana mba Izrel achọghị ka gọọmenti Palestine maọbụ ndị Hamas bụrụ ndị na-achị Gaza.
Izrel chọrọ ka ha bụrụ ndị na ahụ maka ọrụ nchekwa na mpaghara Gaza ma agha ahụ kwụsị.
Mana Izrel na Amerika na United Arab Emirates jikọrọ aka ọnụ achọ iweputa ọchịchị ga na-ahụ maka Gaza bụ ndị ga-enwere ọchịchị n'aka gọọmenti dị ebe ahụ tupuu agha ebido.









