Etu ndị omekome si wakpoo ndị ọchịechi n'Anambra ma gbuo ehi 20

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Onye ọchịehi na-enye ehi ya mmiri

Ndị uweojii ekwuola na ha na-enyocha etu ndị omekome si wakpoo onye ọchịehi n'Anambra steeti ma gbuo ehi ya.

Akụkọ kwuru na nwoke ahụ aha ya Haruna Mohammed kpọrọ ya n'ekwentị n'ebe elekere iri na otu ụbọchị Monde ma kọọrọ ya etu ọtụtụ ụmụ nwoke wakporo ehi ya ebe ha nọ ma gbuo ihe ruru iri abụọ.

Onyeisi otu Miyetti Allah n'ọwụwa anyanwụ aha ya bụ Gidado Siddiqu gwara BBC n'ekwentị na ọ bu onye otu ha ka awakporo ihe ahụ

Ọ sịkwa na ndị ọzọ agụtaghị ọnụ merụrụ ahụ n'ihe ahụ mere n'obodo Mgbaukwu dị n'Anambra steeti.

O kwukwara na ọ bụ n'izu gara aga ka nwoke ahụ kpọrọ ya gwa ya na o nwere ndị na-amaja ya chọrọ iwakpo ya.

Siddiqu kwuru na ọ gara kpesara onyeisioche okpuru ọchịchị Awka North bụ ThankGod Anago onye kwere ya nkwa na ọ ga-etinye anya na ya.

Ọ sịkwa na o nweghi ihe o mere rue mgbe awakporo onye otu ha ahụ.

"O kwere m nkwa na ọ ga-eleba okwu ahụ anya mana anụghị m olu ya rue ugbua" ka o kwuru n'ekwentị.

Ọ sịkwa na nwoke ahụ nọ n'obodo Ebenebe ugbua dịka ọ gbapụrụ osọ iji zọ ndụ ya mgbe awakporo ogige ebe ọ na-eleta anụmanụ ya.

Siddiqu kpọro oku ka ndị ọrụ nchekwa sie imi n'ala ma chọpụta ndị kpara mkpamkpa a ma jikwa otu ohere ahụ sị ndị nke ya ha gbachi nkịtị biri ndụ ha n'udo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga kwuru na Kọmịshọna enyela iwu ka amalite nyocha banyere nke a ozugbo ozugbo.