Ndị ọchịehi emebiela ugbo m ji ego 'loan' wee kọọ - Onye ọrụ ugbo n'Ekwegbe

John Abonyi n'ugbo ya
Nkọwa foto, John Abonyi sị na ya gbazitere ego n'aka ụlọakụ iji kọọ ugbo a

Ndị obodo Ekwegbe dị n'okpuru ọchchị Igboetiti n'Enugwu steeti nọ n'nnukwu ikwa akwa ugbua n'ihi mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa na be ha.

Otu onye ọrụ ugbo n'Agu Ekwegbe bụ Mazi John Abonyi ka ndị ọchịehi kpọọrọ ehi ha baa n'ugbo ya tachaa ọka na agwa (beans) ọ kọrọ ebe ahụ.

Mazi Abonyi bere akwa ma kwuo na nkea abụghị nke mbụ nke ọ na abụ abụọ ndị ọchịehi na-emebi ihe ọ kọrọ n'ugbo ya na-enyeghi ya ego iti aka n'obi.

Mgbe BBC Igbo rutere na ya bụ ugbo karịrị 'hectare' atọ, anyị hụrụ etu ehi siri tachaa ọka nakwa ihe ndị ọzọ a kụrụ ebe ahụ.

Ubi ebe a kọrọ ọka
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ anyị hụrụ etu ehi si taa ọka niile a kọrọ n'ugbo a nke onye nwe ya sị na ọ karịrị 'hectare atọ'

Onye isi obodo Agu Ekwegbe bụ Uchechukwu Eneh kwuru na ha akwọọla aka tiere ọkụkọ akị makana kwa izu ụka ka ndị ọchịehi na-awakpo ha.

O kwuru na ndị niile na akọ ugbo agbaala ọsọ n'ime ọhia n'ihi egwu ndị ọchụ ehi bu egbe.

Ndị ndu ụmụ okorobịa Ekwegbe jikwa iwe kwuo na oge eruola mgbe ha ga eji aka ha lụwa ya bụ ọgụ, n'ihi na mkpu enyemaka ha na-eti kamgbe banyere arụ ndị ochụ ehi na eme na obodo ha adịghị gọmenti ka ihe ọbụla.

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara Mazi Abonyi ajụjụ, o kwuru ya gara na mpaghara ebe ndị Fulani bi n'Opi ga nye mkpesa maka ihe a mere ya, mana onye isi ndị Fulanị ahụ gọrọ agụgọ na ọ maghị ndị chi ehi ha gaa mebie ihe.

John Abonyi
Nkọwa foto, John Abonyi na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

Onye isi ndị ọrụ nche a kpọrọ 'Forest Guard' n'Igboetiti bụ Francis Udoka kwuru na okwu ndị ọchịehi bụ ọkpụkpụ gbadoro ha n'akpịrị n'ihi na ọ bụ ha bụ na obodo adịghị mma ugbua na akụkụ Opi na Ekwegbe.

O kwuru na oge eruola mgbe gọmenti ga enye iwu ga-enye ha ikike ịkwụsi "open grazing" nke ga eme ka ndị ọchịehi kwụsị ịbanye n'ugbo ndị mmadụ ga mebie ihe.

Ehi
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC hụkwara na ndị ọchịehi ka na-achịgharịkwa ehi ha na mpaghara ahụ n'agbanyeghị na gọọmentị amachiela ịchị ehi akpagharị na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.

Cheta na izu ụka gara aga ka ndị ekperima a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi nọchiri ụzọ Opi nsukka, ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ si Enugwu aga Nsukka.

Ndị uweojii mechara wepụta ozi na ha azọpụtala ndị niile ndị ahụ tọọrọ.