Akpụpụla Linus Okorie ụlọikpe

Ndị uweojii Ebonyi steeti akpụpụla Linus Okorie na-azọ ọkwa Sineti n’okpuru Labour Party n’ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka ego.
Mana Nomeh Chikodili bụ ọkaiwu na-anọchi Okorie kwuru na mkpụpụ n'ụlọikpe ahụ bụ ịmetọ usoro iwu, n’ihi na e nwere iwu si n’ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja gbochiri ndị uweojii na gọọmentị steeti ahụ ịnwụchi ya.
Akụkọ na-ekwu na ndị bu egbe tọrọla Okorie, onye bụbu onye omeiwu na-anọchite mpaghara Onicha, Ohaozara, na ivo Federal Constituency n'Ụlọomeiwu Nta, nke Ebonyi steeti n'afọ 2007 ruo 2015 n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP).
Ozi si n'aka onye enyemaka ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Dr David Ogbonna, kwuru na a tọọrọ Okorie ụbọchịụka dịka ọ na-ala n'ụlọ ya dị n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti.
Ogbonna boro ebubo na ọ bụ ndị ọrụ nche steeti ahụ bụ Ebubeagu mpaghara Okpuru Ọchchị Onicha tọọrọ Okorie n'ụzọ ụtụtụ ụbọchịụka ma mekpaa ya ahụ.
Ozi ahụ sịrị, "Ndị nche Ebubeagụ ndị onyeisioche Okpuru Ọchịchị Onicha ziri ọrụ tọọrọ Linus Abaa Okorie n'ụzọ ụtụtụ ụnyaanụ ka ọ na-ala n'ụlọ ya n'Abakaliki."
Okorie na-azọ ọkwa Sinetọ ga-anọchite Ebonyi-South n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ mpaghara gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Ụmahi na-azọ ịnọchite dịka oge ya dịka aka na-achị steeti ahụ ga-ebi n'afọ 2023.
Nke mere ka ụfọdụ na-ebo ebubo na Gọvanọ Ụmahi ji ndị nche Ebubeagu akpagbu ndị akwụnyeghị ya na steeti ahụ.
N'ozi nwunye Linus Okorie bụ Lilian Okorie gbasara na Facebook o kwuru sị, "E nwetara m ozi na Gọvanọ Umahi ji Ebubeagụ nwụchie di m."
Mana onye enyemaka Gọvanọ n'okwu mgbasaozi bụ Chuks Okoh, kwuru hohaa na aka Umahi adịghị ya.
O kwuru na ndị uweojii steeti ahụ kwuru, na anwụchiri Okorie maka iwu ọ dara n'oge gara aga.
Kedụ ebe ndị uweojii kwụ n'okwu 'ntọrị' Okorie

Ebe foto si, Okorie/Umahi
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na Okorie nọ n'aka ha maka ebubo "ịkpalite ọgbaghara n'Ọnịcha nke tara isi mmadụ asaa,na ọ bụghị ndị ntọ tọọrọ ya.
Ozi si n'aka komishona uweojii steeti ahụ bụ Aliyu Garba nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Chris Anyanwu binyere aka kwuru sị, "Hohaa! A tọrọghị Linus Abaa Okorie atọrọ. Ebubeagụ dịka iwu steeti a si nye ha ikike nwere ike ịnwụchi mmadụ, hanye ya n'aka ndị uweojii."
"Dịka ndị uweojii Ebonyi nụrụ kepukepu ntọrị ahụ, anyị mara mara imi n'ala ma chọta Okorie bụ onye gbalahụrụ nnwụchi ndị uweojii ugboro ugboro, n'ogige isi ụlọọrụ Ebubeagụ dị n' ụlọ Gọọmenti steeti ahụ ochie (Old Government House) ụnyaahụ (16/10/2022)."
"Ha (Ebubeagu) gwara anyị na ihe mere ha ji nwụchie ya bụ maka okwu ya nakwa ihe ndị o mere nke kpalitere tigbuo-zogbuo n'Okpuru Ọchịchị Onịcha nke butere ka ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob bute ọgbaghara taara isi mmadụ asaa."
Ndị uweojii gara n'ihu kwuo na ngalaba nnyocha ha na-achọbu Okorie dịka ọkaiwu ukwu steeti ahụ detabuuru ha mkpesa na-ebo ebubo na Okorie na-efesa akụkọ ụgha megide Gọvanọ Dave Umahi, sị na Umahi si n'akpa steeti ahụ wepụ ego dị ijeri naira isii na ụma (N6.7b) bụ nke o boro ebubo na o tinyere n'ikpe Ụlọikpe Mkpegharị megide mwepụ ya n'oche.
Ha bokwara Okorie ebubo aka ya ịdị n'ibu ọgwụike dịka ha kwuru na aka ndị na-arụrụ Okorie ọrụ dị n'ire ọgwụike nakwa ịnụ ya n'ụlọ nkwari o nwe bụ City Hub Inn, dị na Mile 50, Abakaliki.













