Ebubeagu alleged killings: Mpụ ise eborola otu nche Ọwụwa Anyanwụ a

Kemgbe ihe karịrị otu afọ 'Ebubeagụ malitere n'Ọwụwa Anyanwụ, ụfọdụ otu na ndị mmadụ eboola ha ebubo mmekpa ahụ dị iche iche gunyere; iti ihe, ogbugbu na agwa ndị ọzọ megidere ikike dịrị onye.
Ebubeagụ bụ otu ndị gọvanọ steeti Ọwụwa Anyanwụ hiwere otu nche obodo maka igbo nsogbu nchekwa obodo n'aka ndị ọchịehi nakwa mpụ ndị ọzọ dị iche iche na mpaghara ahụ.
Dịka onyeisi otu jịkọrọ otu ndị ntorobia Ọwụwa Anyanwụ a kpọrọ 'Coalition of Youth Leaders' (COSEYL), bụ Goodluck Ibem gwara BBC Igbo na "Eziokwu na o nwere ndị na-awakpo Ebubeagụ, mana etu ha sị arụ ọrụ abụghị ihe e bu n'obi hiwe ha."
"Azụghị ha azụ n'ọrụ nchekwa, ha na-awakpo ndị anọghị na pati nọ n'ọchịchị, ndị ya na gọvanọ na-ese okwu.
"Mgbe ụfọdụ ha na-arụfe ọrụ ihe a sị ha rụọ; ha na-egbu ndị na-agara onwe ha.
"Ihe ọjọọ ha na-eme akarịala ihe ọma ha na-eme."

Lee ụfọdụ ọdachi merela n'Ọwuwa Anyanwụ a rụrụ otu Ebubeagụ aka maka ya:
1. Mwakpo ụmụnwaanyị na-eme 'August Meeting'

Ebe foto si, WEPO
Ụmụ Naijiria kpụ otu nche Ebubeagụ n'ọnụ kemgbe izu a dịka akụkọ na ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu nche wakporo ụmụnwaanyị na-eme ọgbakọ 'August Meeting' pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu etu otu nche ahụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu hiwere maka igbo mkpa nchekwa obodo si emekpae ndị mmadụ ahụ.
Akụkọ na ndị a na-enyo na ha bụ ndị nche Ebubeagụ pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu etu otu nche ahụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu hiwere maka igbo mkpa nchekwa obodo si emekpa ndị mmadụ ahụ.
2. Ebubo ogbugbu ụmụntorobia Awo-Omamma mmadụ 14

O nweghị akụkọ gbarụrụ afọ karịa akụkọ ogbugbu e gburu ndị ntorobịa Otulu karịrị iri bụ ndị e kwuru si ebe ha gara mmemme alụmdinanwunye alọta n'ọnwa Julai n'Awo-Omamma, Imo steeti.
Ndị e gburu gụnyere ụmụnne abụọ otu nne ji.
Onyeisi otu 'town union' ndị Otulu bụ Nnamdi Agbor, rụrụ otu nche Ebubeagu aka n' ọdachi anyammiri ahụ.
Maka dika ndị obodo na-arụ ndị Ebubeagu aka, Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma zọtara ha ma boo ndị uweojii nzuzo DSS na ọ bụ ha bụ ndị aka ha dị n''ọnwụ ndị e gburu.
3. Ebubo ogbugbu Kelechi Ogbonna
Ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ebubeagu gbagburu Kelechi Ogbonna, nwata akwụkwọ mahadum gbara afọ 25.
Ogbugbu Ogbonna kpalitere ngagharịiwe n'Amaeshe, Oguta 1, dị n'Okpuru Ochichị Ugwuta, Imo Steeti.
4. Ogbugbu Nnaogo Akpoke Anyim

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị nche Ebubeagu gburu otu nwoke ahụ aha ya bụ Nnaogo Akpoke Anyim, n’ụbọchị Tuzde, abalị 18 nke ọnwa Jenuwraị 2022.,
Akụkọ kwuru na ha tigidere nwa amadi ahụ ha jichiri maka ebubo na o zuru osisi 'bamboo' ya anwụọ.
Etu e siri kugbo ya kụzuru nndị ntorobia obod ya ime ngagharịiwe nke butere mmebi ihe dị iche iche dịka ha boro ebubo na gọọmenti okpuru ọchịchị na nke steeti emeghị ihe ọbụla iji chọta ma taa ndị gburu Anyim ahụhụ.
5. Mwakpo obodo Izombe, Imo steeti
Ihe ruru mmadụ iri merụru ahụ, a gbaa ụgbọala asaa ọkụ dịka ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ndị otu Ebubeagu wakporo Izombe dị n’Ugwuta, Imo steeti.
Ha mụnyere ụlọ nakwa ọdọahịa ndị mmadụ ọkụ, gbaa ụfọdụ ndị mmadụ egbe ma merụkwa ndị ọzọ ahụ n’abalị asaa nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022.
Ihe ndị otu Ebubeagu na-agabiga
Dịka a na-ebo ndị Ebubeagu ebubo imekpa ndị obodo ahụ, ọtụtụ mgbe, ha ezutela mwakpo maọbụ ogbugbu n'aka ndị omekome bu egbe a ma dịka 'unknown gunmen' ugboro ugboro.
- Iboko Christian: N'abalị mbụ nke Ọnwa Eprelụ afọ 2022, akwụkwọ akụkọ kwuru maka ogbugbu ndị ojiegbe gburu nwa amadi a bụ onye bụ Nduogbuovu n' Okpuru Ọchịchị Izzi dị n'Ebonyi steeti. Ndị gburu ya napụrụ ya ọgbatumtum ya na-ego ya .
- Sunday Nwafor: N'abalị ... agbagburu Sunday Nwafor ma bepụ ya isi n' Ekpelu, n'Okpuru Ọchịchị Ikwo dịkwa n'Ebonyi steeti.
- Ifeanyi Orogbo: E gburu ya sunye ya ọkụ n' Igweledeoha, Amagu, n'Okpuru Ọchịchị Ikwo dịkwa n'Ebonyi steeti.
Mmalite Ebubeagu

Ugboro ugboro ka ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ mara ọkwa na ha ga-amalite otu nchekwa maka mpaghara ahụ.
Mana ọ bụ ka nwechara ọgbakọ ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprelụ afọ 2021, n'obi gọvanọ Enugwu steeti, ka ha jikọrọ kwuo na ha ga-amalite otu Ebubeagu maka nchekwa ala Igbo
Mana Gọvanọ Dave Umahi malitere nke Ebonyi steeti ya n'ụbọchị Wenezde, abalị 22 nke ọnwa disemba afọ 2021 n'emume e mere n'ama egwuregwu 'Pa Ngele Oruta Township Stadium'.
N'Imo steeti, Hope Uzodinma hiwere otu n'abalị 11 nke ọnwa Eprelu afọ 2021.









