Ann Agom Eze: Ebu m Dave Umahi Ụzọ bata na APC, ọ gaghị achụpụli m

Ann Agom-Eze bụ onye na-azọ ikike ife ọkọlọtọ APC iji nọchite Ebonyi South n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, ekwuola okwu maka ya bụ ikpe ụlọikpe dị Abakaliki mara ya taa bụ Tuzde ụbọchị anọ nke ọnwa Ọktoba 2022.
Mgbe ọ gwara BBC okwu n'ekwentị, Agom-Eze sị na ọnwebeghọ onye gwara ya na a chụpụla ya na pati ya bụ All Progressive Congress (APC).
Ọ sị na, " ọbụ na-asịrị ka m na-anụ ya, onwebeghị onye deteere ma akwụkwọ maọbị sị na ụlọọrụ patị anyị gwa m na m esoghizi na pati".
Ann sị na mana, "Umehi agaghị achụpụli m na pati maka na e bu ya ụzọ bata na APC".

Ebe foto si, FHC Abakaliki
Ọ sịkwa, "Ọnweghị ihe mkpọrọ ya bụ ihe maka na ọnweghị ihe ọjọọ m mere onye ọbụla".
Ọ sị na ha na-eme m ọ dịka m adị ha oke mkpa maka na ọ bụ onye dị oke mkpa ka a na-achụgharị otu a.
Ann sị na ya amaghịdị na e wepụrụ ya ụlọikpe ịchụpụ ya ma pati.
"Amaghịkwa m, ọ bụ n'ehihie a ka mmadụ ziteere akwụkwọ ụlọikpe ahụ. Naanị ha ma ebe ha nọ kpee ya bụ ikpe".

Ebe foto si, FHC Abakaliki
Ann sị na ọ gbagwojuru ya anya ihe ụlọikpe nwere ime n'okwu gbasara pati.
Mgbe a jụrụ ya ihe ọ ga-eme ugbua, Ann zara sị, "nke ahụ anaghị awa m isi ugbua. Ọ bụ ọkaiwu m maara ihe anyị ga-eme mgbe anyị hụrụ".
Ann sị na ya ekweteghị na a chụpụla ya n'APC maka na "anaghị achụpụ mmadụ na be ya".
Etu m si ghọọ onye iro Umahi n'ihi na m na-azọ ọkwa Senetọ Ebonyi South na APC
Ann Agom Eze, kọwara ihe na-esere ya na Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi n'ihi okwu ndọrọndọrọ ahụ.
Oriaku Agom Eze kwuru na ọ bụ ya ka o rutere ịzọ ọkwa ahụ n'ihi na Austine Umahi onye meriri ntuliaka imeụlọ maka ọkwa ahụ ekwuola na ya chọrọ iritu ka nwanne ya bụ Gọvanọ Dave Umahi werezie ya bụ ọkwa.
Lee ihe Agom Eze, onye kwuru na a na-ezitere ya ozi iyi egwu ọnwụ, gwara BBC Igbo maka esemokwu ahụ nke e wepụrụla ụlọikpe n'ihe nkiri a:
Etu esemokwu siri malite

Ebe foto si, Ann Agom Eze/Dave Umahi
Ann Agom-Eze zọrọ ohere ife ọkọloto APC maka ọkwa Sinetọ ga-anọchite Ebonyi South na ntuliaka imeụlọ pati ha bụ APC mere .
Mana nwanne Govanọ Dave Umahi nke obere bụ Austin Umahi gbara onye nke mbụ, ebe Agom Eze gbara onye nke abụọ.
Oge ohere ịzọ ọkwa onyeisiala kwara Dave Umahi, nwanne ya nwoke bụ Austin rituru ma nyefee ya ikike ịzọ ọkwa sinetọ n'aha APC.
Mana Inec anabataghị nke a n'ihi na Umahi esoghị mee ntuliaka imeụlọ ọbụla.
Umahi gara gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe si ka ụlọikpe nye ntuziaka ka Inec tinye aha ya n'akwụkwọ dịka onye ga-efe ọkọlọtọ APC maka ọkwa ahụ.

Ebe foto si, Ann Agom Eze/Facebook
Agom Eze gakwara rịọ ka etinye aha ya n'ikpe ahụ dịka onye ya bụ ikpe metụtara.
Okaikpe kpere ikpe ahụ kwuru na o megidere iwu otu onye ịzọ ọkwa abụọ n'otu afọ ma nye Agom Eze mmeri dịka onye nwere ikike ịzọ ọkwa ahụ n'aha APC.
Mana ka ọ dị ugbua ya bụ okwu ka dị n'ụlọikpe mkpegharị, ebe a ga-ekpebi ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Septemba.
Ihe i kwesịrị ịma maka Ann Agom-Eze

Ebe foto si, Ann Agom Eze/Facebook
Ann Agom Eze bụbu onye ọrụ oyibo tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Agom Eze bubu odeakwụkwọ ukwu (Permanent Secretary) na Ministri na-ahụ maka ala n'Ebonyi steeti tupu ọ la ezumike nka.
Ọ gara akwụkwọ na mahadum 'Abia State University' dị n'Uturu, Abia steeti.
Ya na di ya bụ Sam Agom-Eze bụ nwaeze ji ụmụ.







