Ngagharịiwe Saụt Afrịka etinyela egwu n'ahụ ndị Afrịka
Ngagharịiwe akpọtụọla na mpaghara dị cihe iche na mba Saụt Afrịka na nso nso a. Ndị mbịaraabịa Afrịka kpọchiri ụlọahịa ha.
Peter Odike, bụ onye Naịjirịa nwetere akwụkwọ njirimara Saụt Afrịka na 2006. O nwere ụlọahịa na Johannesburg.
Peter lụrụ onye Saụt Afrịka mana nke a egbochibeghị ya na mwakpo na mmekpa ndị ahụ.
Ndị Saụt Afrịka dị pasenti 30 enweghị ọrụ, nke so na ọnụọgụgụ ndị enweghị ọrụ kachasị n'ụwa niile. Iwe maka enweghị ọrụ a, akpaliela ngagharịiwe. A na-ata ndị mbịarambịa ụta maka nsogbu akụnaụba nakwa mpụ na mba ahụ.
Ngagharịiwe mere n'oge gara aga, butere mwakpo ụlọahịa, mmebi nakwa oge ụfọdụ ọnwụ.
Gọọmenti Afrịka gụnyere Naịjirịa na Gana akpọọla oku ka Saụt Afrịka chekwaa ndị mbịarambịa.
Gọọmenti ekwuola okwu banyere ngagharịiwe ndị a ma kwe nkwa ime ihe banyere nsogbu na-akpata ya.
Mwakpo Xenophobia na Saụt Afrịka nwereike imetụta atụmatụ African Union Agenda 2063, nke chọrọ ịgbanwe Afrịka ma mee ya ọkaibe n'ụwa.
Ndị Saụt Afrịka dị pasenti 30 enweghị ọrụ, nke so na ọnụọgụgụ ndị enweghị ọrụ kachasị n’ụwa niile. Iwe maka enweghị ọrụ a, akpaliela ngagharịiwe. A na-ata ndị mbịarambịa ụta maka nsogbu akụnaụba nakwa mpụ na mba ahụ.



