Dave Umahi court case: Nkọwa ndị ọkaiwu gbasara ikpe ya

Aha onyonyo, Nkọwa ndị ọkaiwu gbasara ikpe Dave Umahi

Ndị ọkaiwu tinyere ọnụ n'okwu gbasara mkpebi Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja mere n'isi Dave Umahi na-achị Ebonyi steeti.

Ọkaiwu Goddy Uwazurike kọwara na ya bụ mkpebi Jọstis Inyang Ekwo mere n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2022, bụ gbasara akwụkwọ otu pati People's Democratic Party (PDP) gbara Umahi, ebe ha sị na ọ bụghịzị gọvanọ dịka ọ hapụrụ PDP gawa pati ọzọ All Progressives Congress (APC).

Ha kwuru na Umahi kwụsịrị ịbụ gọvanọ ụbọchị ahụ ọ gafere APC.

Uwazurike kwuru na ihe ụlọikpe kwuru bụ ihe ga-eme maọbụghị ma Ụlọikpe Mkpegharị o kwugharịrị ihe Ụlọikpe Ukwu kpebiri.

O kwuru na ọ kwadoghi mkparị Umahi kparịrị onye Ọkaikpe. O kwuru na e welite okwu ahụ n'ụlọikpe Mkpegharị, na o nwereike inye ya nsogbu, n'ihi na ọ na-achọ ịkọwa na ndị ọkaiwu na-eri ngarị.

Ọ kọwakwara ihe bụ isi sekpụ ntị maka ndị omeiwu steeti Ebonyi so Umahi wụfee APC mgbe ọ wụfere.

N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Mike Ahamba (SAN) kwuru na site n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2022, na Dave Umahi abụghịzị aka na-achị Ebonyi steeti, ruo ma Ụlọikpe Mkpegharị emechara nye ya mmeri.

O kwuru na ndị ọkaiwu ka ga na-achịkọta ikpe dị iche iche gara ịdị ka nke Umahi a (o ji nke Olusegun Obasanjo na Atiku Abubakar mgbe ha nọ n'ọkwa onyeisiala maa atụ) nyochaa ha niile ma mara ụzọ a ga-esi soro ya.

O kwuru na mgbagha mkpebi ụlọikpe a Umahi gbaghara nwereike itinye ya na nsogbu ga-eme ka ndị omeiwu tikọọ aka ọnụ chụpụ ya.

Gere nkọwa ha n'uju ebe a: