HMPV: Naịjirịa ejighị ike nọrọ n'ihe izendụ - NCDC

Ebe foto si, NCDC/X,Getty
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọrịa ndị na-efe efe na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC) ekwuola na Naịjirịa ejighị ike nọrọ n'ihe izendụ maka ọrịa Human Metapneumovirus (HMPV).
N'ozi ndụmọdụ NCDC bipụtara, ngalaba ụlọorụ ahụike ahụ kwuru na Gọọmenti Etiti Naịjirịa na-eleba anya nke ọma gbasara etu ọrịa ahụ si efesa dịka ha na-etinye ụkpụrụ dị iche iche n'ọrụ iji wulite ụzọ e ji ebuso ya bụ ọrịa agha.
NCDC kwuru na ha emeela nnwale gbasara HMPV na njikọaka Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ na-agbakọọrọ ha aka dịka World Health Organization (WHO), US Centres for Disease Control (USCDC) na UK Health Security Agency (UKHSA).
Ha kwuru na nnwale ahụ chọpụtara na Naịjirịa ejighị ike nọrọ n'ihe izendụ maka ọrịa HMPV.
Ha kọwakwara na nnwale ahụ ga-enyere ha aka inwe mkpebi, ịdị nkwadobe nakwa iwepụta usoro a ga-eji lebara ya anya iji gbochie ihe ọghọm ga-esi na ya pụta.
Human Metapneumovirus: Gịnị bụ ọrịa 'HMPV' na-efesa ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
N'ime abalị ole na ole gara aga, akụkọ banyere ọrịa Human Metapneumovirus [HMPV] malitere ifesa na soshal midia.
Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) na Africa Center for Disease Control (AfricaCDC) ekwusiela okwu ike banyere ọrị a.
Mana ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mmadụ amalitela ime nnyocha n'aka ha iji chọpụta ihe niile banyere ọrịa a.
Nnyocha e mere kwuru na HMPV bụ ọrịa okpo nkumume nwereike imetụta nwatakịrị ma okenye ọkachasị ụmụaka nakwa ndị usoro ahụ na-alụso ọrịa ọgụ gbadagoro.
Ụlọọrụ Centre for Disease Control kwuru na ọrịa Human metapneumovirus bụ nke nwereike ibute ọrịa dịka ọzịza ngụchi okpo ufere bekee kpọrọ bronchitis na ọrịa ngụ bekee kpọrọ pneumonia.
Ọrịa na ọrịa respiratory synctytial virus (RSV) bụ otu ọrịa nke nọ kemgbe afọ 2001 oge a chọpụtara ya na mba Nedaland.
A na-ekwu na ọ bụ oge oyi ka ọ na-efesa. Ndị mmadụ nwereike ibute ya site na mmekọ ha na onye bu ọrịa a.
HMPV enwebeghị ọgwụ mgbochi mana ọgwụgwọ ya na ọgwụgwọ ọrịa ndị ọzọ dịka ya bụ otu ihe.
Gịnị mere e ji ekwu maka ọrịa a?
Ọtụtụ akụkọ na-ekwu na ọrịa amalitela ifesa na na mpaghara ugwu mba Chaịna ebe ndị kachasị bute ya bụ ụmụaka.
Nfesa ọrịa na-abịa dịka afọ gasịrị ọrịa corona malitere ifesa na Wuhan mba Chaịna ma mechaa bụrụ ọrịa tụrụ mbaụwa niile n'ọnụ.
Ọtụtụ foto na vidio ndị mmadụ kpuchiri ihu nọ n'ụlọọgwụ malitere ifesa na soshal midia ma mee ka ọtụtụ mmadụ cheta na ọ bụ etu ọrịa covid si malite.
Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na ọ dị mkpa ka e tinye usoro dị iche iche iji gbochi nfesa ọrịa a.
Ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị mba Chaịna na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Mao Ning kwuru na ọrịa okpo nkumume bụ nke a na-ebutekarị oge oyi (winter).
Njirimara ọrịa HMPV
- Ahụ ikpo ọkụ
- Ụkwara
- Imi ịgba mmiri
- Oyi
- Ike ọgwụgwụ
- Ịgbọ agbọ
- Afọ ọsịsa
- Ọrụrụ agbọ
- Ọnya akpịrị
Njirimara ndị ọzọ gụnyere
- Mkpụrụ hịọhịọ
- Nchinume
- Enweghị ike iku ume
- ọzịza ngụchi okpo ufere bekee kpọrọ bronchitis nke a kachasị njọ n'ụmụaka.
HMPV na ọrịa Covid-19 ha bụ otu ihe?
Human metapneumovirus na ọrịa COVID-19 bụ orịa okpo nkumume mmadụ nwereike ibute. Ọrịa abụọ a nwere njirimara dị n'etiti ha dịka imi ịgba mmiri, ụkwara, ahụ ikpo ọkụ, Ọnya akpịrị na ndị ọzọ.
Ọrịa ndị a bụ nke si otu ụzọ efesa. Ọ bụrụ na ọ kawanye njọ, onye butere nwereike ịga ụlọọgwụ.
HMPV bụ ọrịa na nwere oge maka na ọ bụ naanị oge oyi na-atụ ka ọ na-eme.











