Mmachi asambodo ofesi: 'Ọ dị m ka onye e gwuru wayo, e gburu m oge m ma mefukwa ego nne na nna m’

Nwatakwụkwọ, ego

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Dịka Naịjirịa mara ọkwa na ha amachiela ụfọdụ asambodo mahadum mba ndị ọzọ bụ ndị nke a sị na ha bụ adịgboroja, nke metụtara ọtụtụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa na-agụ akwụkwọ na mba Bene Repọblik na Togo.

Otu nwataakwụkwọ na-atụbu anya ịrụ ọrụ oyibo ya bụ ihe metụtara bụ Lydia Aduragbemi, kwuru sị, “Amaghị m etu ọdịnihu ga-adịrị m."

N'ọnwa Ọgọstụ, Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Ọkammụta Tahir Mamman, mara ọkwa na ihe karịrị ụmụakwụkwọ 21,000 ka okwu iji asambodo adigboroja metụtara.

Mamman kwuru na asambodo ndị ahụ bụ nke a natara na mahadum dị iche iche dị na Bene Repọblik na Togo n'agbata afọ 2019 rue ugbua agaghị aba n'ihe ọzọ.

O kwuru na ọ bụ naanị mahadum ise si Bene Repọblik na atọ si Togo bụ ndị gọọmentị Naịjirịa nabatara..

N'ihi nke a, a ga-achụ ndị ji aasambodo ndị ahụ arụ ọrụ oyibo n'ụlọọrụ gọọment na nke ndị nọọrọ onwe ha n'ọrụ.

Gịnị butere mmachi ahụ?

Nwatakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị Naịjirịa mere mkpebi a dịka otu onye ntaakụkọ a kpọrọ Ụmar mere nnyocha nke gbara n'anwụ ebe a na-akpụ asambodo adịgboroja n'ụlọakwụkwọ "Ecole Supérieure de Gestation et de Technologies (ESGT) dị na Bene wuru ewu na soshal midịa.

Umar gbara ama na ya mefuru ego dị N600,000 ($358: 60) iji nweta asambodo "Bachelor of Science' na mahadum ahụ n'izuụka isii.

Nchọpụta ya mere ka Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa ji hiwe otu nọọrọ onwe ya ka ha nyochaa ụfọdụ mahadum dị na Bene nakwa Togo, ndị chọpụtara na ụfọdụ mahadum dị na Bene nke gọọmentị ha kwadoro na-enye asambodo adịgboroja maka ihe ọmụmụ a na-abataghị.

Godwin Odimoko bụ odeakwụkwọ ukwu ndị Naịjirịa nọ na mba Bene Repọblik, (Queme / Plateau) gwara BBC na mahadum ise nke mba ahụ nke ndị Gọọmenti Naịjirịa nabatara gụnyere :-

-Universitè D’ Abomey-Calavi,

-Universitè De Parakou,

-Universitè Nationale Des Sciences, Technologist Ingenieve Et Mathematiques,

-Universitè Nationale D’ Agriculture and

-Universitè Africaine De Development Cooperatif.

O kwukwara na mmachi ahụ metụtara ihe ruru pasent 65 ụmụakwụkwọ na-agụ n'ihe karịị mahadum 90 dị na Bene Repọblik.

Gịnị meburu na mbụ?

Nwataakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nke a abụghị mbụ ndị agụmakwụkwọ na Naịjirịa na-ebulite okwu banyere asambodo adịgboroja.

N'afọ 2019, Ọkammụta Abubakar Rasheed Adamu, bụ odeakwụkwọ ukwu nke ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ mahadum 'National Universities Commission' (NUC), dọrọ aka na ntị ka ndị chọrọ ịba mahadum gbaara asambodo adịgboroja si Bene Repọblik ọsọ.

O kwuru na ụlọọrụ ya chọpụtara na ọtụtụ ụlọ agụmakwụkwọ dị elu dị n'ụfọdụ mba Afrịka na-enye ndị mmadụ nzere PHD n'ihe erughị otu afọ ma ha kwụọ N30000 ($1:80.)

N'ọnwa Maachị afọ 2021, ngalaba na-ahụ maka iji otu afọ efe ala nna bụ 'National Youth Service Corps' (NYSC) kagburu aha mahadum asatọ; ise n'ime ha si mba Bene Repọblik, machie ụmụakwụkwọ si mahadum ndị ahụ isonye n'atụmatụ iji otu afọ fee ala nna ha n'afọ ahụ.

N'ọnwa Ọgụst afọ 2021, NUC kwuru na mahadum 'University of Applied Sciences and Management dị na Porto-Novo, Bene na nke 'African University for Cooperative Development (AUCD) dị na Cotonou, Bene bụ ụlọakwụkwọ adịgboroja ma dọọ aka na ntị na ụmụakwụkwọ na-aga mahadum ndị a agaghị anata ezi ọzụzụ zuru oke.

Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa kwuru na nke a egboghị ya bụ ọgụ dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ ka na-aga akwụkwọ na mahadum ndị enweghị nkwado gọọmentị.

Kedụ ihe nke a pụtara nye ụmụakwụkwọ, nne na nna na ndị nwe ụlọakwụkwọ mahadum?

Lydia Aduragbemi, nwatakwụkwọ na-agụ 'Human Resource Management' n'otu n'ime mahadum ndị a a machiri tara onwe ya ụta maka ịgụ akwụkwọ n'ofesi.

Ọ sịrị, “Ọ dị m ka onye e gwuru wayo, mmụọ m kụpịara akụpịa. Ọ dị nnọọ ka m lara oge na ego nne na nna m n'iyi."

“Amaghị m ka nne m ga-esi anabata ihe nke a? O tiwara akwa n'elu ekwentị oge m kpọrọ ya gwa ya ihe na-eme."

"Amaghị m etu ọdịnihu ga-adịrị m ugbua n'okwu asambodo adịgboroja dịka ndị mụrụ m gbara mbibi were kwụọrọ m ụgwọ akwụkwọ."

Bose Nwachukwu, nne otu n'ime ụmụakwụkwọ o metụtara dapụrụ n'akwa oge ọ nwetara ozi ihe mere.

“Ọ dị m ka ihe nile m mefuru efuola dịka m ji ego nile m dọkwara ziga nwa m nwoke ofesi."

Onyeisi otu ndịnkuzi mahadum Naịjirịa na mba Bene bụ Gabriel Kona kwuru na otu ha emegideghị nzọụkwụ gọọmentị Naịjirịa megide ụlọakwụkwọ adịgboroja dị na Bene, Togo na Naịjirịa kama na ọdịghị mma ịta ndị mmadụ aka ha dị ọcha ahụhụ.

Kona sịrị, "Ụdị akwụkwọ mahadum nke Bene na Togo tozuru nke Naịjirịa na mpaghara ndị ọzọ n'ụwa."

O kwuru na mahadum afọ atọ na Bene Repọblik and Togo na afọ anọ na Naịjirịa bụ otu ihe ma e jiri atụmatụ ngụkọ 'European Credit Transfer and Accumulation System' tulee ihe a na-agụ na Afrịka na nke a na-agụ na mba ndị dị na Yurọp.

O kwuru na mba Bene nyere ohere ka e jiri Bekee akụzi ihe nke pụtara na asụsụ abụghị mgbochi ọbụla.

N'otu aka ahụ, Odeakwụkwọ ukwu otu 'Nigerians in Diaspora Commission' bụ Godwin Odimoko, kpalitere mmụọ ụmụakwụkwọ o metụtara na nne na nna ha, si ha adala mba maọbụ mee ngagharịiwe.

Ọ sịrị, "Gọọmentị na ndị agụmakwụkwọ dị n'aka na-arụ ọrụ amụchighị anya iji hụ na e doziri okwu metụtara okwu a dịka o siri metụta ogogo nke ngalaba UNESCO / United Nations na-ahụ maka ibinye aka na ntozu mahadum ka mahadum ndị a nwee ohere nnyochagharị.".

Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum, ụmụakwụkwọ na ndị nne na nna a kpọrọ 'Coalition of stakeholders in Education' (CSE) , kwuru n'ezie na ha ebegarala gọọmenti akwa ka ha megharịa mkpebi ha, ma na-enwe olileanya na gọọmenti ga-aza ha.

Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa gwara ụmụakwụkwọ ha gawa mahadum naanị n'ụlọakwụkwọ gọọmenti kwadoro na Naịjirịa nakwa mba ofesi, na mkpebi ha n'okwu asambodo adịgboroja kwụ chịm rue echi.

Ndụmọdụ ma ị chọ ịhọrọ mahadum

-Chọta ihe ọmụmụ ị chọrọ ka nwa gị gụọ na mahadum n'ofesi

-Chota mahadum na omenala ha na etu ha si akụzi nkuzi iji mata ma ọ ga-adabara nwa gị iso usoro ha

-Mata ma mahadum ahụ o tozuru etozu site na ịjụ ese n'ụlọnnaọchiteanya Naịjirịa na mba ahụ

-Gbaa mbọ mata na ọ dị mkpa nwa gị ịmụ asụsụ mba ọ na-aga

-Gbakọọ ihe agụmakwụkwọ ahụ ga-eri ma hazie etu ị ga-esi enweta ya

-Chọọ ohere agụmakwụkwọ n'efu, ohere ịgba mbibi maka agụmakwụkwọ ma malite idokwa ego n'oge.

-Hụ na o nwere ohere nlekọta ahụike ya na mba ụnụ họọrọ nakwa ohere nchekwa ahụike tozuru etozu

-Hụ na nwa gị nwere nchekwa site na ị hanye ya n'aka onye ị ma maka ntụziaka maọbụ onye ọ ga-agbakwuru ma ọ dị na mkpa

-Kuzire nwa gị i mere onwe ya ihe ọbụla dị ya mkpa

-Nwetara nwa gị asambodo ojemba. Akwụkwọ gosiri na a nabatara nwa gị na mahadum, akwụkwọ gosiri na i nwere ego i dowere, akwụkwọ gosiri na ị kwụrụ ụgwọ akwụkwọ, asambodo njirimara onye nakwa asambodo nchekwa ahụike (health insurance)

-Tọọ ntị n'ala maka ihe na-eme na mba mahadum nwa gị dị

Nchịkọta

Maka ụmụakwụkwọ dịka Lydia bụ ndị a kwụbara n'etiti okporo, ọdịnihu ha edoghị anya.

Mana gọọmenti na ndị ọrụ agụmakwụkwọ na-akpa etu ha ga-esi edozi okwu a, otu ihe were anya- ndị nne na nna kwesịrị ịsa anya mmiri n'ịhọrọ okporo agụmakwụkwọ ụmụ ha na mba ndị ọzọ.