A chụọla ụmụakwụkwọ Naijiria na mahadum UK nsogbu akwụghị ụgwọ akwụkwọ

A chụọla ụmụakwụkwọ Naịjirịa na mahadum ma nye iwu ka ha pụọ na mba UK maka na ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ akwụkwọ n’oge maka nsogbu ego.
E gbochiri ụmụakwụkwọ mahadum Teesside ime ihe n’agụmakwụkwọ ha wee kọọrọ ndị ụlọọrụ ‘Home service’ dị ka ọnụ ahịa naira dara ada nke na-emetụta ego nchekwa ha.
Ụfọdụ gwara BBC na ọ na-adị ha ka ọ ha gbuo onwe ha dịka. Ha kwuru na obi tara mahadum ahụ mmiri.
Ọnụ na-ekwuchitere mahadum kwuru na onye enwghịike ịkwụ ụgwọ nkwado visa ya a daala iwu, ọ bụ nke a mere ha ji kpotụrụ ụlọ ọrụ Home Service ndị ọ bụ ọrụ ha ịkpebi ihe gbasara nkwado visa.
Naijiria na-enwe nsogbu akụnaụba kachasị njọ ugbu a n’ọgbọ, nke na-emetụta ụmụakwụkwọ Naijiria na ụfọdụ mahadum na UK.

Tupu ha malite ịgụ akwụkwọ na mahadum Teesside, a gwara ụmụakwụkwọ ihe a metụtara na ha ga-egosipụta ihe akaebe na ha nwere ike ịkwụọ ụgwọ akwụkwọ ha tinyere ịnwe ego nleta.
Mana ka ọ dị ugbua, ha enwghịzị ike ịkwụ ụgwọ ndị n;ihi na egọ naịra adaala.
Otu ụmụakwụkwọ, ndị 60 n’ime ha kesara aha ha na BBC, malitere ịkpọ oku ka ụlọakwụkwọ mahadum ahụ nye ha nkwado ka a kwụsịrị ọtụtụ ndị na-akwụghị ụgwọ maa kwụsi ha ịgụ akwụkwọ.
A kọkwara na ndị ụlọọrụ na-anakọta ụgwọ ndị mahadum ahụ nwere ọrụ, kpọtụrụ ụmụakwụkwọ ndị a.

A chụpụrụ Adenike Ibrahim fọdụrụ nkakịrị ka ọ gụchaa akwụkwọ ya maka na o nweghị ike ịkwụ ụgwọ o ji.
O mechara kwụọ ụgwọ ndị ahụ, mana o kwuru na edebanyeghị aha ya ọzọ n’ụlọakwụkwọ. A gwara ya na nwa ya nwoke ga-ahapụrịrị obodo ahụ.
O kwuru na, “Ọ bụ eziokwu na m akwụghị ụgwọ, mana ugbua, a kwụọla m pasentị 90 nke ụgwọ akwụkwọ m wee gaa klaasị m niile.”
“Akpọrọ m ha ma gwa ha ka anyị nwe nkwekọrịta, mana ha achọghị. Ihe na-eme ụmụakwụkwọ agbasaghị ha.”
O kwuru na ọnọdụ a dị nwute maa jọgbuo onwe na ya amaghị ihe ya ga-eme.
“Ọ bụụrụ nwa m ihe na-agbawa obi. ọ nọ na nnukwu nsogbu kemgbe m gwara ya,” Nwaada Ibrahim gbakwụnyere.
Enweghị ikike ịrịọ arịrịọ
Ụlọọrụ Home Office gwara ụmụakwụkwọ, gụnyere Nwaada Ibrahim, na akagbuola ikike ha ịbanye UK n’ihi na ha kwụsịrị ịgụ akwụkwọ na mahadum ahụ.
Akwụkwọ ozi ndị BBC hụrụ, gosiri ụbọchị nke nwa akwụkwọ ahụ ga-ahapụ obodo UK wee kwuo na ha enweghị “ikike mkpegharị ma ọ bụ nyocha nhazi megide mkpebi ahụ”.
Kemgbe enwetara akwụkwọ ozi ya, otu nwa akwụkwọ masters - onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya - kwuru na ọfọdụrụ ya igbu onwe ya. O kwuru na ọ naghị eri nri ma ọ bụ aṅụ ihe ọṅụṅụ.
Mahadum ahụ kwuru na a gbaala mbọ ị nyere ụmụakwụkwọ ndị ihe a metụtara aka.

Esther Obigwe kwuru na ya gbalịsiri ike ịgwa mahadum ahụ ugborougboro gbasara nsogbu ego ọ na-enwe mana ọ nwetaghị nzaghachi, ruo mgbe a kwụsiri ya ịbata n'ụlọakwụkwọ wee nweta ọkwa ka ọ pụọ na mba UK.
"Agara m klaasị na nzukọ ọmụmụ m niile, abụ m onye nwaakwụkwọ na-arụsi ọrụ ike," ka o kwuru.
"Ọ na-akụda mmụọ, a na m aṅu ọgwụ antidepressant ugbu, ọ bụ naanị m ọ ebe a, enweghị m onye ọzọ.
"Ihe karịrị ọnwa abụọ, eribeghị m nri ma ọ bụ hie ụra. Aghọtaghị m ihe mere e ji na-eme anyị ihe a, anyị emeghị ihe ọjọọ."

Jude Salubi, bụ́ onye na-agụ akwụkwọ ịbụ onye ọrụ na-elekọta mmadụ. A gwara ya ka a kwụsịla ya ịbanye na mahadum na ọ ga-ahapụ obodo ahụ.
Tupu nke ahụ, ọ na-esi na Teesside gaa Liverpool kwa izuụka ọ bụla iji rụọ ọrụ awa 18 na mbọ iji kwụọ ụgwọ ndị o ji.
"Ka ọ dị ugbu a akwụla m puku £14,000 o nwe fọdụ puku £14,000," ka o kwuru.
"Adị m njikere maka nkwekọrịta banyere otu m ga-esi akwụ ụgwọ a, mana achọrọ m nkwa na a ga-edebanye aha m n'ụlọakwụkwọ ma weghachite visa m."
BBC ghọtara na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ihe metụtara jisiri ike kwụọ ụgwọ ha ji, mana mahadum enweghị ike itinye aka na usoro ụlọọrụ Home Office.










