US Midterm Election:Ndị Democrat na Republican nwetara oche nhatanha n'Ụlọomeiwu Ukwu

Ndị na-atụ Vootu

Ebe foto si, Getty Images

Dịka mba Amerịka na-apịakọ ntuliaka ọkara oge ha, ndị out pati Democrat na ndị Republican nwetara oche iri anọ na isi, iri anọ n’isi n’'Ụlọomeiwu Ukwu,

N'Ụlọomeiwu Nta, Republican chị ọgbọ dịka ha nwetarala oche 184, ebe ndị Democrat nwetara oche 157.

A kpọpụtala mpụtara ntuliaka maka oche 351 n'ime ọ oche 435 a nna-azọ n'ụlọ n'Ụlọomeiwu Nta an-azọ mba ahụ.

Ihe ise mere ntuliaka a ji dị ndị Amerịka mkpa

Ndị chọrọ ite ime

Ebe foto si, AFP

Ndị na-atụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ abụọ a bụ ndị iro n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị mana Donald Trump na Joe Biden na-agwa ụmụamala Amerika otu ihe: Pụtanụ tuọ vootu.

N'ọgbakọ achụmntavootu nke Biden na Obama mere maka pati ha bụ Democrat, ha na-ekwu na ntuliaka bụ maka ọchịchị onyekwuo uche ya.

N'aka nke ọzọ Trump kwuru na ntuliaka ahụ ga-abụ banyere nchekwa mba ahụ.

Mba Amerịka na-eme ntuliaka ụbọchị Tuzde iji mata ndị ga-achị ọgbọ n'ụlọomeiwu ha.

Abortion right

Na ntuliaka a nke Joe Biden esoghị na ndị na-azọ ya,a ga-azọ oche 435 n'ụlọomeiwu nta, ebe a ga-azọ oche 35 n'ụlọomeiwu Ukwu ha nke.

Dịka ọnọdụ akụnaụba Amerịka nọ na nsogbu, ndị na-atụ vootu na-atụ uche banyere maka nsogbu nchekwa na etu ndị mbịarambịara si awụju na mba ahụ nke nwereike ịmetuta etu pati ha ga-esi atụ vootu ugbua. Nke a pụrụ imetụta onye ha ga-atụnyere na ntuliaka onyeisisla afọ 2024, ọkachasị dịka a na-ele anya na Donald Trump chịbụrụla mba ahụ nwereike ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ.

Lee ihe mere ntuliaka nke etiti oge a ji dị mkpa:

1. Okwu ma nwaanyị enwere ikike ite ime

Abortion right

Ị họpụta ndị ụlọomeiwu nwere ike imetụtta ndụ ndị Amerịka ọbụladị ka o si metụta iwu ite ime.

N'ọnwa Juun afọ 2022, Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka kagburu ikike e nyere nwaanyị n'iwu iji tee ime.

Otu Pati Democrat na Republican amapụtalarị atụmatụ iwu ọhụrụ banyere nke a ma ọ bụrụ na ha nweta mmeri na ntuliaka ọkara oge a.

Ndị 'Democrat' na-ekwe nkwa ịkwado ikike nwaanyị ite ime, ebe ndị 'Republican' na-ekwe nkwa ịmachi ite afọ ime ọbụla rurula izuụka 15.

Na steeti, mpụtara ntuliaka gọvanọ ga-ekwu ụdị iwu ga-adịire n'ebe dị ka Pennsylvania, Wisconsin na Michigan bụ ebe e nwere ike tinyee mmachị kara taa akpụ.

2. Oge ndị 'Republican' ga-eji enyocha ndị 'Democrat'

Ntuliaka Amerịka
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Pati ga-achị ọgbọ ma e mechaa ntuliaka ọkara oge a ga-enwe ikike ihiwe kọmiti ga-eme nnyocha.

Kemgbe afọ gara, ndị 'Democrat' malitere nnyocha dịka ha nwere mmeri n'oche Ụlọọrụ Onyeisiala nke obi ya bụ White House. Ha chadoro anya na mwakpo a wakporo ụlọọrụ gọọmentị nke US Capitol n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 nke mere n'oge Ọchịchị Trump.

Ha agbaala ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji mata ma ọchịchị Trump amabụ na ya bụ ihe ga-eme tupu o mee nke ha ga-ewepụta mpụtara nnyocha ahụ na ngwụcha afọ a.

Mana ihe ndị a niile nwere ike ịgbanwe dịka a na-atụ anya na ndị Republican nwereike karịa n'ụlọomeiwu.

O mee etu a, ị mara ha ga-apịachi kọmiti na-enyocha mwakpo ahụ mere.

Kama nke ahụ, ha ga-enyocha ebubo na nwa Biden na bụ Hunter na ndị Chaina na-azụkọ ahịa. Ha ga-enyochakwa okwu mbịarambịara n'oge ọchịchị Biden, ọpụpụ Amerịka pụọ n 'Afganistan, ebe coronavirus si malite na Chaina.

Ọzọ, ọ bụụ na ndị Republican ka n'ụlọomeiwu Ukwu mba ahụ, Ọ ga-adọghachi aka elekere azụ na ibinye aka na ndị VBiden họpụtara maka ọkwa n'ụlọomeiwu etiti nakwa ngalaba gọọmentị dị iche iche.

3. Ọ ga-ekwu ebe Joe Biden kwụ n'ọdịnihu

Joe Biden

Ntuliaka ọkara oge na-adịka ịkpọ okwe etu ndị Amerịka sị ahụta gọọmentị onyeisiala nọrọla n'oche afọ abụọ; ya bụ pati nọ n'ọchịchị ka ụta na-adịkarịrị.

Etu e si ahụta Joe Biden akụọla afọ n'ala ihe karịrị otu afọ n'ihi ọtanisi batara na mba ahụ.

Ọ bụrụ na ndị pati ya bụ Democrat gbaa ọnyụpa na ntuliaka a, ị mara na e nwere ike ime ka ndị pati ya kpoo oku ka Biden rituo, nye ohere maka onye otu ha ọzọ tupu ntuliaka onyeisiala n'afọ 2024.

Onyeisiala na ndị ndụmọdụ ya na-ekwu na ọ ga-azọkwa ọzọ, mara na iwepụ onye nọ n'ọkwa ka ọ ghara ịzọọ pati ya azụ rara ahụ.

4. Ọ ga-ekwu ma Trump ọ ga-azọ ọzọ

Donald Trump

Ọ dịka Donald trump achọrọ ịzọ ọkwa onye ga-anọ nna 'White House ọzọ n'afọ 2024, etu ntuliaka ọkara oge ga-esi aga ga-ekwu sike ma ọ ga-enwe isi maọbụ ọ gaghị enwe isi.

O soghị azọ na ntuliaka mana ọtụtụ ndị ọ kwadoro so azọ.

Trump kwalitere ndị na-azọ ọkwa Senetọ dịka Herschel Walker bụbụ ọgba bọọlụ n' Georgia, Mehmet Oz bụ onye dọkịta na-apụkarị n'ihe onyonyo TV na Pennsylvania nakwa onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ JD Vance n'Ohio,karịa ndị bụ ndị ndọrọndọrọ Ọchịchị a ma ama na-agbayeghị na ụfọdụ ndị isi otu otu Repbulican akwadọghị nke a.s.

5. Ndị gọnahụrụ mpụtara ntuliaka aga-eso azọ ntuliaka?

Mark Finchem

Ntuliaka ọkara oge nke afọ 2022 ga-abụ mbụ a na-eme ntuliaka etiti kemgbe mwakpo US Capitol nke mere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, oge ndị na-akwado Donald Trump gbalịrị ịhụ na e binyeghị aka na mmeri Joe Biden nwetara na ntuliaka.

Kama ịkatọ ọgbaghara ahụ, Trump gara n'ihu na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ.

Ọ kwadokwara ndị Republican na-azọ ọkwa pụtara na-ekwu na e zuru mmeri Trump na ntuliaka ahụ.

Ndị dịka: Mark Finchem na-azọ ọkwa odeakwụkwọ nke Steeti n' Arizona; Jim Marchant na Nevada; Doug Mastriano na-azọ ọkwa gọvanọ na Pennsylvania,na-azọ ọkwaga-enye ha ohere ikwu ihe na-eme na ntuliaka steeti ha tupu ntuliaka onyeisiala afọ 2024.