Lee njem mba ofesi niile Onyeisiala Tinubu mere n'afọ 2024

Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ na-akwado ifepụ n'ụgbọelu

Ebe foto si, Dada Olusegun/Instagram

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ na-akwado ifepụ n'ụgbọelu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Ndị isiala mbaụwa bụ ndị a ma na-eme njem aghara aghara.

Oge ụfọdụ, njem ndị a bụ nke maka ọgbakọ ụlọorụ mbaụwa dị iche iche, maka ezumike, nleta ahụike maọbụ nzụkọ dị n'etiti ndị iaiala,

Ka ọ dị etu a, Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu mere ọtụtụ njem mba ofesi n'ime afọ 2024.

Akụkọ a na-elebanyeanya na njem mba ofesi niile dị mkpa Onyeisiala Tinubu na ihe kpatara njem ndị a.

Eserese mba niile Onyeisiala Tinubu gara n'afọ 2024
Nkọwa foto, Eserese mba niile Onyeisiala Tinubu gara n'afọ 2024

Njem Tinubu gara Frans

Onyeisiala Tinubu na nwunye ya kwụrụ ga mba Frans na Jenụwarị 2024 maka nzụkọ dị n'etiti ya na Onyeisiala Emmanuel Macron

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na nwunye ya kwụrụ ga mba Frans

Ụbọchị Wenezde 24 Jenụwarị, 2024, Onyeisiala Tinubu malitere njem ofesi ya n'afọ 2024 oge ọ gara mba Fransị maka nzụkọ dị n'etiti ya na Onyeisiala Emmanuel Macron.

Oge o mere njem a, ụlọorụ Onyeisiala kwuru na Onyeisiala Bola Tinubu ga-alaghachita na Naịjirịa n'izuụka mbụ n'ọnwa Febụwarị.

Na Febụwarị 14, 2024, Onyeisiala Tinubu gara mba Itiopịa maka ọgbakọ African Union e mere n'Addis Ababa.

N'ọgbakọ ahụ bụ nke agba nke iri atọ na asaa ya, Onyeisiala Tinubu na ndị isiala mba Afrịka ndị ọzọ nwere nrụrụrịtaụka banyere ọdịmma Afrịka ọkachasị n'ihe gbasara ihu igwe nakwa inwe ezi nnọchiteanya ha n'otu G20.

Njem ọ gara Sawụdi Arebịa

 Onyeisiala Tinubu mere njem ụbọchị abụọ n'ọnwa Febụwarị 2024 ga mba Qatar

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu

Na ngwụcha ọnwa Febụwarị 2024, Onyeisiala Tinubu mere njem abalị abụọ na mba Qatar.

Akkwụkwọozi si n'obi ọchịchị dị n'Abuja kwuru na ọ bụ Emir nke Qatar bụ Sheikh Tamim bin Hamad Al Thani Onyeisiala Tinubu oku.

Ozi ahụ kwuru na njem ahụ bụ iji mwulite mmekọ dị n'etiti mba Qatar na Naịjirịa n'ihe gbasara nchekwa na ọnọdụ akụnaụba.

Tinubu mgbe ọ gara Senegal

Bassirou Faye kpokuru Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala na mba Senegal n'ọnwa Eprelụ

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala mba Senegal

Ụbọchị mbụ ọnwa Eprelụ 2024, Onyeisiala Tinubu mere njem ga mba Senegal maka emeume idu n'iyi n'ọrụ nke Onyeisiala ọhụrụ mba ahụ bụ Bassirou Faye.

Ọ bụ gọọmenti mba Senegala kpọrọ Onyeisiala Tinubu oku maka emume ahụ maka na ọ bụ Onyeisioche otu Economic Community of West African States (Ecowas).

Tinubu gara Nedalandị

Onyeisiala Tinubu na Mark Rutte bụ Onyeisiala mba Nedalandị

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na Mark Rutte bụ Onyeisiala mba Nedalandị

N'ọnwa Eprel 23, 2024, Onyeisiala Tinubu gara Nedalandị maka ọgbakọ dị n'etiti ya na Praịm mịnịsta ha bụ Mark Rutte.

N'ọgbakọ ahụ, Onyeisiala Tinubu na Rutte nwere nrụrụrịtaụka n'ihe gbasara azụahịa na mmekọ.

N'ọgbakọ ahụ, Onyeisiala Tinubu zutere Praịm mịnịsta Rutte, eze na lọlọ mba Netherland bụ Willem-Alexander na Maxima.

Mgbe Tinubu gara Riyadh, Sawudi Arebia

Onyeisiala Tinubu na ndị isi mba Sawudi Arebia n'ọnwa Eprel

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na ndị isi mba Sawudi Arebia

Ka o mesiri njem abalị abụọ ahụ na mba Netherlands, Onyeisiala Tinubu gara mba Saudi Arabia ụbọchị Fraịde 26 Eprel, 2024 iji sonye n'ọgbakọ World Economic Forum.

Ọgbakọ ahụ e mere na Riyadh lebanyere anya n'azụmahịa mbaụwa na mmepụta ọkụ latrik.

Ihere ruru ndị Isiala, otu na ụlọọrụ ruru otu puku sonyere n'ọgbakọ ahụ nakwa ndị ọkachamara ruru iri itoolu.

Njem idu n'iyi ọrụ na Chad

Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala mba Chad Mahamat Déby.

Ebe foto si, A. AYOFE/X (Twitter)

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala mba Chad Mahamat Déby.

Ụbọchị Tọzde 23 Mee, 2024, Onyeisiala Tinubu gara mmemme idu n'iyi ọrụ Onyeisiala Mahamat Déby mba Chad.

Mmemme ahụ kpọtụrụ n'isi obodo Chad bụ N'Djamena.

Nke a bịrara dịka Mahamat Déby nwetara mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na mba ahụ.

Ndị so Onyeisiala Tinubu mee njem ahụ gụnyere ndị ọkwa ha gbagotere na gọọmenti ya.

Njem ọzọ Onyeisiala Tinubu mere bụ ụbọchị Tuzde Juun 18, 2024. Njem a bụ maka idu n'iyi ọrụ nke Cyril Ramaphosa dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka.

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Bola Tinubu na Cyril Ramaphosa dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka

Njem ọzọ Onyeisiala Tinubu mere bụ ụbọchị Tuzde Juun 18, 2024. Njem a bụ maka idu n'iyi ọrụ nke Cyril Ramaphosa dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka.

Cheta na Cyril Ramaphosa nwetara mmeri nke ugboro abụọ na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Saụt Afrịka.

Ndị so Onyeisiala Tinub na njema ahụ gụnyere Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu, osote ya bụ Obafem Hamzat na ndị ọrụ gọọmenti naịd ọzọ.

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu gara mba Gana n'ọnwa Julaị

Satọde 20 Julaị, Onyeisiala Tinubu mere njem mba Gana maka ọgbakọ otu African Union e mere n'Accra, isi obodo Gana.

Onye so Onyeisiala Tinubu na njem a bụ Mịnịsta na-ahụ mmekọ mba ofesi bụ Yusuf Maitama Tuggar na ndị ọzọ.

Ọgbakọ AU n'Ekwitorịal Gini

Onyeisiala Tinubu mgbe ọ na-aga Gana maka ọgbakọ otu African Union e mere n'Accra, isi obodo Gana

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu

Onyeisiala Tinubu gara mba Equatorial Guinea ụbọchị Tuzde 13 Ọgọst maka njem ọrụ abalị atọ.

Gọọmenti Equatorial Guinea na Onyeisiala Tinubu nwere nrụrụrịtaụka banyere mmekọ azụmahịa, akụnaụba na ịrụ awara mmanụ agbidi.

Njem ahụ bịara n'isi njedebe n'Ọgọst 16.

Njem n'ụgbọelu ọhụrụ na Frans

Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọrụ nchekwa ya

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọrụ nchekwa ya

Ụbọchị Mọnde 19 Ọgọst, 2024, Onyeisiala Tinubu gawara mba Fransị.

Akwụkwọ ozi obi ọchịchị ya wepụtara oge ahụ kwuru na ọ bụ ụgbọelu ọhụrụ a zụtara ya ka o ji mee njem ahụ.

Ụgbọelu ọhụrụ bụ nke nọchiri ụgbọelu ochie nke Onyeisiala Naịjirịa ji emebu njem.

Mgbe Onyeisiala Tinubu gara Chaịna n'Ọgọst

Onyeisiala Bola Tinubu na Onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na Onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping

Onyeisiala Tinubu gara njem mba Chaịna ụbọchị Tọzde 29 Ọgọst, 2024.

Akụkọ kwuru na Onyeisiala Tinubu ga-ebuụzọ gaa mba United Arab Emirates tupu ọ gawa isonye n'ọgbakọ China-Africa Business Forum.

N'ọgbakọ ahụ, Onyeisiala Tinubu zutere Onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping na ndị isi ụlọọrụ mba Chaịna iji kwalite mmekọ azụmahịa dị n'etiti Naịjirịa na Chaịna.

Mgbe ọ gara mba Briten

Onyeisiala Tinubu na Eze mba Inglandị

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu na Eze mba Inglandị

Ka o mesịrị njem mba Chaịna ahụ, Onyeisiala Tinubu gawara mba UK ebe ọ nọrọ ọtụtụ abalị.

Oge ọ nọ mba UK, Onyeisiala Tinubu zutere eze Charles mba Great Britain tupu ọ laghachita Naịjirịa n'ọnwa Seputemba.

N'ọgbakọ ahụ ha abụọ nwere, Onyeisiala Tinubu nwere mkparịtaụka banyere ọtụtụ ihe.

Njem ezumike izuụka abụọ na mba Briten nke abụọ

Onyeisiala Bola Tinubu

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu

Ọktoba 2, 2024, Onyeisiala Tinubu laghachiri mba UK ọzọ, mana ugbua, ọ bụ maka ezumike izụụka abụọ.

Akwụkwọozi obi ọchịchị ya kwuru na Onyeisiala ga-eji oge ezumike ahụ tulee ma nnyocha atụmatụ ya dịka Onyeisiala nakwa ọrụ ya.

Oge o mere njem ahụ, akụkọ malitere ifegharị na ahụike Onyeisiala Tinubu na-ada mba, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ mba Fransị ka ọ gara maka nleta.

Mana ka o ruru Ọktoba 11, obi ọchịchị dị n'Abuja katọrọ okwu ahụ ma kọwa ya dịka ụgha.

Ozi ahụ kwuru na ọ bụghị mba Fransị ka Onyeisiala Tinubu gara.

Onyeisiala Tinubu laghachitara Naịjirịa ụbọchị Satọde, 19 Ọktoba ka oge ezumike ya gwụrụ.

Onyeisiala Bola Tinubu

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu

Mgbe Onyeisiala TInubu gara ọgbakọ Arab na Muslim Unity Summit nke e mere na Sawudi Arebịa

Ụbọchị Satọde 10 Nọvemba, 2024, a hụrụ ụgbọelu Onyeisiala Tinubu na Saudi Arabia ebe ọ bịara ọgbakọ ndị Arab na Muslim Unity Summit.

Mkparịtaụka ọgbakọ ahụ gbadoro ụkwụ n'agha Gaza.

Ka ọ nọrọ otu izuụka na Saudi Arabia, Onyeisiala Tinubu mere njem mba Brazil ụbọchọ Mọnde 18 Nọvemba, 2024 maka ọgbakọ G20 Summit.

Ọgbakọ a bụ ọgbakọ akụnaụba mbaụwa niile.

Nwunye Onyeisiala bụ Oluremi Tinubu so ya mee njem ahụ.

Onyeisiala Tinubu nọrọ na njem ahụ zute ndị isi ụlọọrụ na ndị isi ọchịchị mba dị iche iche gụnyere onyeisi ụlọọrụ IMF, onye ya na ya nwere nrụrịtaụka banyere ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.

Njem nke ikpeazụ o mere n'afọ 2024 bụ nke ọ gaghachịrị na mba Frans nke ugboro atọ

Onyeisiala Bola Tinubu na nwunye ya

Ebe foto si, NIGERIAN PRESIDENCY

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na nwunye ya

Ụbọchị Wenezde 27 Nọvemba, Onyeisiala Tinubu gara Paris, Fransị.

Na njem abalị atọ ahụ, Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron nwere mkparịtaụka banyere mmekọ Naịjirịa na Fransị.

Onyeisiala Tinubu si ebe ahụ gawa mba Saụt Afrịka maka ọgbakọ South Africa Economic and Social Development Summit agba nke iri na otu. Onyeisiala Tinubu laghachitara Naịjirịa ụbọchị Tọzde 5 Disemba.

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa boro Onyeisiala Tinubu ebubo imefu ego site n'ọtụtụ njem ndị a o mere ọkachasị ugbua Naịjirịa nọ n'ajọ ọnọdụ akụnaụba.

N'agbanyeghị ebubo ndị a, obi ọchịchị onyeisiala ekwuola na njem ndị ahụ bụ iji nweta mmepe na ọdịmma Naịjirịa ma mwulite mmekọ dị n'etiti Naịjirịa na mba ndị ọzọ.