Kedụ mgbe steeti Abia, Anambra, Imo, Ebonyi, Enugu ga-amalite ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe 70,000?

Aha onyonyo, Kedụ ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ọnụegọ mmanụ ụgbọala ọhụrụ?
Kedụ mgbe steeti Abia, Anambra, Imo, Ebonyi, Enugu ga-amalite ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe 70,000?
Gọvanọ Hope Uzodinma, Gọvanọ Alex Otti, Gọvanọ Peter Mbah, Gọvanọ Francis Nwifuru na Gọvanọ Charles Soludo

Ebe foto si, Facebook/X

Nkọwa foto, Gọvanọ Hope Uzodinma, Gọvanọ Alex Otti, Gọvanọ Peter Mbah, Gọvanọ Francis Nwifuru na Gọvanọ Charles Soludo

Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ ụbọchị Tọzde 18 Julaị, 2024 binye aka n'akwụkwọ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000 maka ndị ọrụ Naịjirịa.

O kwuru na ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ bụ nke gọọmenti etiti ga-ebuli ma afọ atọ gasịa.

Cheta na oteela aka otu jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa ji akpọ oku banyere ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ maka ndị ọrụ.

N'otu ngagharịiwe NLC mere, ha katọrọ okwu ndị Gọvanọ kwuru ka ọ bụrụ ha ga-ekpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.

Mana dịka Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ, nyocha BBC Igbo mere chọpụtara na steeti ndị nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa amalitebeghị ịkwụ ụgwọ ahụ.

N'agbanyeghi ihe isi ike dị n'obodo ugbua, oke ọnụego mmanụ ụgbọala, oke ọnụego ihe oriri nakwa ajọ ọnọdụ akụnaụba, otu ajụjụ ka ndị bi na steeti ọwụwa anyanwụ gụnyere Enugwu, Abia, Imo, Ebonyi na Anambra na-ajụ, 'Kedu oge gọọmenti ga-amalite ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000 a?

Kedụ ihe ndị mmadụ na steeti n'ala Igbo nwere ikwu maka ọnụegọ mmanụ ụgbọala ọhụrụ?

Kedụ mgbe Imo Steeti ga-akwụ ndị ọrụ ya ụgwọọnwa opekatampe 70,000?

Gọvanọ Hope Uzodinma na-achị Imo Steeti

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Hope Uzodinma na-achị Imo Steeti

Odeakwụkwọ Gọvanọ Hope Uzodinmma bụ Oguwike Nwachuku Kwuru na gọọmenti Imo steeti dị njikere ịmalite ịkwụ ndị ọrụ steeti ahụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ.

N’akwụkwọ ozi o zitere anyị, o kwuru na Gọvanọ Uzodinma ekwela ndị ọrụ nkwa ịmalite ikwụ ụgwọ ahụ n’oge adịghị anya.

Ozi ahụ kwuru na gọọmenti Imo steeti amalitela ichepụta atụmatụ a ga-eji hazie etu ha ga-esi kwụọ ụgwọọnwa opekatampe ahụrụ ahụ iji hụ na onye ọrụ ọbụla ma onye ukwu ma onye nta ritere uru ya.

Ozi ahụ kwuru na Gọvanọ Hope Uzodinma kwere nkwa na n’ime ọnwa abụọ na-abịa, ndị ọrụ Imo steeti ga-amalite inweta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000.

Lee ihe Gọọmenti Enugwu Steeti kwuru maka ịkwụ ụgwọọnwa opekatampe 70,000

Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti

Ebe foto si, Peter Mbah/Instagram

Nkọwa foto, Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah nọrọ na ngwụcha ọnwa Ọgọst hibe otu kọmitị ga-ahụ na a kwụrụ ndị ọrụ steeti ahụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000.

Onyeisi ndị ọrụ steeti ahụ bụ Kenneth Ugwu nọ n’isi kọmiti ahụ ebe onye nnọchiteanya ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmenti steeti bụ Sandra George bụ odeakwụkwọ kọmiti ahụ.

Ndị ọzọ nọ na kọmiti ahụ gụnyere kọmishọna na-ahụ maka ọrụ bụ Chika Ugwoke, onye na-agakọrọ steeti Enugwu ego bụ Anthony Okenwa nakwa kọmishọna na-ahụ maka akụnaụba na ego bụ Nathaniel Uramah.

Gọvanọ Mbah gwara ndị kọmiti ahụ ka ha rụọ ọrụ, nyochaa akwụkwọ e ji akwụ ndị ọrụ ụgwọ ma chepụta etu a ga-esi kwụọ onye ọrụ ọbụla na steeti ahụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ dịka usoro ọhụrụ e ji akwụ ndị ọrụ ụgwọ si kwu.

Gọvanọ Soludo kwuru na ọ bụ n'ọnwa Ọktoba ka Anambra Steeti ga-ebido ịkwụ ya

Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti.

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti.

Gọọmenti Gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị Anambra steeti nọrọ ụnọchị Tọzde 26 Septemba, 2024 kwuo na steeti ya ga-amalite ịkwụ ndị orụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000 n’ọnwa Ọktoba 2024.

O kwuru na n’agbanyeghi na gọọmenti enweghi ego, ọ ga-agba mbọ hụ na ndị ọrụ steeti ahụ ga-enwe aṅụrị

Gọọmenti Ebonyi Steeti enyela iwu ka a malite ịkwụ 70,000 mana o kwughị oge ọ ga-abụ

Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Instagram

Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

Ọ bụ eziokwu na Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru enyela iwu ka a malite ịkwụ ndị ọrụ steeti ahụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ, mana ndị ọrụ steeti ahụ na-ajụ Kedụ oge a ga-amalite ịkwụ ya?

Gọvanọ Nwifuru gwara onye isi ọrụ steeti ahụ ka o wepụta usoro maka ịkwụ ụgwọụgwọ opekatampe ọhụrụma kwuo na ngwangwa onye isi ọrụ nyere ya usoro ahụ, gọọmenti ya ga-amalite ịkwụ ya.

Ọ kọwara na enwere ihe dị iche na ụgwọọnwa opekatampe na mbuli ụgwọọnwa. O kwuru na agaghị akwụ onye ọrụ ọbụla 70,000, ma kwuo na ụgwọọnwa opekatampe pụtara ‘ihe onye orụ ọbụla na-enweta dịka ụgwọọnwa ka ọ dịla.

Anyị ga-amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ n'ọnwa Ọktoba, 2024 - Gọọmenti Abia Steeti

Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia Steeti

Ebe foto si, Alex Otti/X

Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia Steeti

Ukoha Njoku bụ odeakwụkwọ aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti, kwuru na gọọmenti steeti ahụ ketara ọtụtụ ụgwọ ezumike nka na gratuity site n’aka gọọmenti chịbụru steeti ahụ, nke ha akwụ na nkeji na nkeji.

Ọ bụ ya mere anyị ga-eji malite ịkwụ ndị ọrụ opekatampe ọhụrụ 70,000 n’ọnwa Ọktoba 2024.