Etu olili ozu Jimmy Carter bụbu Onyeisiala mba Amerika si aga

Ozu Jimmy Carter bubu onyeisiala mba Amerika

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ozu Jimmy Carter bubu onyeisiala mba Amerika
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Olili ozu na ncheta onye bu onyeisiala mba Amerika nke iri atọ na itoolu ebidola.

A kaara ya ụka n'isi ụlọụka ndị Anglican dị na Washington, US.

Ọtụtụ ndị a maama na mba Amerika bịara mmemme ahụ. Ndị dịka onye bubu onyeisiala mba Amerika Bill Clinton na unwunye ya Hillary Clinton nakwa George W Bush na nwunye ya Laura Bush biara n'emume ahụ.

Ndị ọzọ bụ Donald na Melania Trump, Barack Obama, Joe Biden na nwunye ya Jill Biden nakwa osote onyeisiala mba Amerika bụ Kamala Harris.

Onyeisiala mba Amerika Joe Biden na ndsị ọzọ kọwara ihe ha maara banyere Jimmy Carter.

Onyeisiala mba Amerika Joe Biden na ndị chiburu mba ahụ

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerika Joe Biden na ndị chiburu mba ahụ

Joe Biden chetere na ọ bụ ya bụ sinetọ mbụ binyere aka nye Carter nkwado ịzọ ọkwa Onyeisila mba Amerika ma kọwaa ya dịka onye e kwesiri iyomi.

Ọ sị na "Carter biri ezigbo ndụ" ma gwa ndị mmadụ ka ha gaa mụta ihe na-etu o si bie ndụ ya.

Joe Biden
Nkọwa foto, Joe Biden

Onye ọrụugbo ahụekere ghụọrọ Onyeisiala Amerịka: Jimmy Carter anwụọla ka ọ gbara afọ 100

Jimmy Carter

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jimmy Carter

Jimmy Carter bụbu Onyeisiala mba Amerịka anwụọla ka ọgbara afọ 100. Tupu ọ rịgoro n'ọkwa dịka Onyeisiala, Jimmy Carter bụ onye ọrụugbo ahụekere.

Ọ chịrị mba Amerịka malite n'ọnwa Jenụwarị 20 1977 ruo Jenụwarị 20, 1981.

N'oge ọchịchị ya, Jimmy Carter rụrụ ọrụ inweta udo n'etiti mba Amerịka na mba Egypt na Israel. Ọ gara n'ihu mwulite ma hazie ajọ ọnọdụ akụnaụba mba Amerịka tinyere ịrụ ọrụ maka ntọhapụ ụmụafọ Maerịka mba Iran nwụchiri.

Jimmy Carter mechara bụrụ onye rụrụ ọrụ inweta udo na mba Amerịka nke mere ka e nye ya ihe nrite Nobel Peace Prize n'afọ 2002.

Aha onyonyo, Onye ọrụugbo ahụekere ghụọrọ Onyeisiala Amerịka: Jimmy Carter anwụọla ka ọ gbara afọ 100

Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden kọwara Jimmy Carter dịka onye obi umeala, onye udo nakwa onye okwu ya kwụrụ ọtọ. N'aka nke ọzọ, Donald Trump kwuru na ndị mba Amerịka ji Carter ụgwọ ekele maka ezi mbọ ọ gbara ịhụ maka ọdịmma mba Amerịka.

Onyeisi ụlọọrụ UN bụ Antonio Guterres kwuru na mbọ Carter gbara bụ ihe nwetara udo na nchekwa na mbaụwa gbaa gburugburu.

A mụrụ James Earl Carter Jr na Ọktoba 1 1924 n'obodo Plains dị na Georgia.

Jimmy Carter

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Jimmy Carter