Kedụ ka ọnụego njem okporoụzọ si emetụta ndị na-ala Ekeresimesi?

Aha onyonyo, Kedụ ka ọnụego njem okporoụzọ si emetụta ndị na-ala Ekeresimesi?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka afọ 2024 na-abịa na njedebe, ndịgbo si mpaghara mba ụwa dị iche iche na-alọta n'obodo ha iji sonyere ezịnaụlọ merube emume ekeresimesi afọ 2024.

Ịla ụlọ na ngwụcha afọ ọkachasị oge ekeresimesi abụrụla ihe njirimara ndịgbo na Naịjirịa.

Na Legos steeti, ụfọdụ ndị na-eme njem gwara BBC Igbo etu ọnọdụ dị ugbua gbasara ọnụego njem okporoụzọ.

Ụfọdụ ndị njem kwuru na ihe dị iche dị n'ọnụego njem okporoụzọ nke afọ site na nke afọ gara aga.

Mana gịnị mere ndị ọkwọụgbọala jị tinye ego n'ọnụego njem okporoụzọ?

Anyị chọpụtara na n'agbanyeghị ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa, ọtụtụ ndịgbo na-eme njem n'oge ekeresimesi a ebe ọtụtụ ndị ọzọ na-eme njem a maka ihe dị iche na-abụghị ekeresimesi.

BBC Igbo chọpụtakwara na ngwụcha afọ bụ oge mmemme ekeresimesi, mmemme afọ ọhụrụ ma bụrụkwa oge ndị mmadụ ji eme mmemme dị iche iche dịka mmemme alụmdi na nwunye, ịgba ofala nakwa iliozu dgz.

Ndị njem nọ n'ọdọụgbọala
Nkọwa foto, Ndị njem nọ n'ọdọụgbọala

Etu ọbụla obodo siri dị, anyị ga-eririri osikapa n'Ekeresimesi a - Ndị azụmahịa Enugwu

Aha onyonyo, Etu ọbụla obodo siri dị, anyị ga-eririri osikapa n'Ekeresimesi a - Ndị azụmahịa Enugwu

N'aka nke ọzọ, agbanyeghị na ọnụ ahịa nri oriri nọzị n'elu ojị, ndị mmadụ ka juputakwara n'ahịa ma na-egokọ akụrụngwa nrị ha na ezinaụlọ ha ga-eji gbaa Ekeresimesi afọ 2024.

Iji chọpụta etu ọnụahịa ihe oriri si kwụrụ ugbua, anyị gara n'ahịa Gariki Awkụnanaw Enugwu wee chọpụta na obodo bụzikwa igwe maka na ọnụahịa ihe niile a rịala.

Lee ka ọnụahịa ụfọdụ nri si kwụrụ ugbua:

  • Tomato - Otu nkata bụzi puku naịra iri asaa na ise (75,000)
  • Yabas - Otu nnukwu akpa bụzị narị puku naịra atọ na iri ise (350,000)
  • Green pepper - Otu obere akpa bụzị puku naịra iri anọ (40,000)
  • Green peas - Otu obere akpa bụ puku naịra iri isii (60,000)
  • Okụkọ Agrik - Puku naịra iri na ise rue puku naịra iri atọ (15,000 - 30,000)
  • Osikapa - Otu akpa bụ puku naịra iri asaa na ụma ise (75,000)
  • Mmanụ Groundnut - Lita atọ (3ltr) puku naịra iri na ise (15,000) ebe lita ise (5ltr) bụ puku naịra iri abụọ na abụọ 22,000

Ọtu onye na-azụahịa bụ Oriakụ Adaeze Eze gwara BBC na ndị na-azụ ha ahịa erughi ka ndị bịara n'afọ gara aga n'ihi na ihe isi ike na agụụ dị n'Obodo.

Nwada Anoke Adaugo bụ onye bịara ịzụ ahịa, kwara arịrị na ọnụego dọla rịrị elu, bụ ihe mere na ekeresimesi nke afọ a bụ 2024 na-akpụ afọ n'ala.

Mana n'agbanyeghị ihe ndị a, ahịa Gariki Awkụnanaw Enugwu ka na-ekwo ekwo dịka ọtụtụ mmadụ na-agba mbọ ọfọrọ naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ ka-agbaa Ekeresimesi nke afọ 2024.

Nwaanyị na-ere ihe
Nkọwa foto, Nwaanyị na-ere ihe